Gịnị Ka Ị Ga-agwa Onye Alakụba?
1 Ị̀ gbatụworo onye Alakụba àmà? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na ị matara na ndị Alakụba kwenyesiri ike na Chineke. Otú ọ dị, ha maara ihe dị nta banyere Paradaịs gaje ịbịa n’elu ala dị ka ndị amụma Jehova buru n’amụma, ọ ga-amasịkwa anyị isoro ha kerịta olileanya ahụ. (1 Tim. 2:3, 4) Ihe ọmụma na-esonụ kwesịrị inyere gị aka ịgba àmà dị mma.
2 Ndị Alakụba kwere n’Allah, ma ọ bụ Chineke, ha kwekwaara na Muḥammad bụ onye amụma Chineke. Akwụkwọ nsọ ha bụ Koran, a na-akpọkwa okpukpe ha Islam [Alakụba], nke pụtara “ịnọ n’okpuru.” Koran na-ekwu na ịgha ụgha na ikpere arụsị adịghị mma, na Chineke bụ otu, nakwa na ọ bụghị akụkụ nke Atọ n’Ime Otu. Ọzọkwa, ọ na-ezi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, na paradaịs eluigwe. Ndị Alakụba nabatara Bible dị ka Okwu Chineke ma kwere na a gbanwewo ya, ebe Koran, bụ́ nke ka dị n’asụsụ e dere ya, ka dị otú ọ dị.
3 Nwee Omume Enyi, Dị Akọ, ma Nwee Ezi Uche: Mgbe gị na onye Alakụba na-akparịta ụka, nwee omume enyi ma dị akọ. (Ilu 25:15) Buru n’uche na ndị Alakụba na-ekwenyesi ike na nkwenkwe ha nakwa na ha bu ihe ka ukwuu n’ime ha n’isi. Ya mere, ịtụgharị uche n’ozizi okpukpe na ịnwapụtara onwe ha ihe bụ́ uche Chineke abụghị akụkụ nke uto ime mmụọ ha. (Rom 12:2) Iji nyere ndị Alakụba aka, ndidi na nghọta dị mkpa.—1 Kọr. 9:19-23.
4 Zere ikwu ihe ndị ga-eme ka onye Alakụba chee na o nwere ihe jikọrọ gị na Krisendọm. Mee ka o doo anya na ị bụghị akụkụ nke Katọlik ma ọ bụ Protestant, na ị dị iche. Zoo aka na Bible dị ka Akwụkwọ Chineke. Ebe ndị Alakụba na-adịghị achọ iji ntị ha anụ okwu bụ́ “Ọkpara Chineke,” ọ kasị mma ịghara iji ya eme ihe ma ọ bụ kwuo okwu banyere ya ruo mgbe e nwerela ọganihu ime mmụọ. Otú ọ dị, ị pụrụ ikwu banyere Jisọs, na-ezo aka n’ebe ọ nọ dị ka onye amụma ma ọ bụ onye ozi. Zere arụmụka. Ọ bụrụ na ị hụ na iwe abịala ya, jiri nwayọọ lawa ozugbo.
5 Ọ kasị mma isoro nanị otu onye kwurịta okwu, ọ bụghịkwa ìgwè mmadụ. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ụmụ nwanyị ịgbara ụmụ nwanyị àmà, nakwa ụmụ nwoke ịgbara ụmụ nwoke àmà. O doro anya na nke a adịghị adịcha otú ahụ oge nile, ma e kwesịrị iji ezi uche eme ihe. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị Alakụba na-ewe iwe n’ihi ihe ha na-ewe na ọ bụ uwe na ejiji na-ekwesịghịrị ụmụ nwanyị. Ọ dị ụmụnna nwanyị mkpa ịmata nke a.—1 Kọr. 10:31-33.
6 Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Ha: Jiri ezi obi kwuo banyere ịdị ukwuu na ịhụnanya Chineke. Alala azụ ikwu na ị bụ ezi onye kwere ekwe, na Chineke bụ otu (ọ bụghị Atọ n’Ime Otu), nakwa na ikpere arụsị adịghị mma. Kwuo banyere ajọ omume dị n’ụwa taa—agha, ọgba aghara obodo, ịkpọasị agbụrụ, na ihu abụọ a na-ahụ n’etiti ọtụtụ ndị okpukpe.
7 Broshuọ bụ́ The Guidance of God—Our Way to Paradise ga-enyekwu gị ihe ọmụma banyere isiokwu ndị ị pụrụ iji malite nkwurịta okwu nke gị na ndị Alakụba. E dere ya iji dọrọ mmasị ndị Alakụba bi n’ebe ha nwere ahụ iru ala ịmụ Bible.
8 Dị ka ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ana m eme mgbalị pụrụ iche isoro ndị Alakụba kwurịta okwu. Anọwo m na-agụ ihe banyere okpukpe gị, echekwara m na ekwutere m ya ma m sị na ndị Alakụba kwere n’otu ezi Chineke na ná ndị amụma ya nile. [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ ga-amasị m isoro gị kwurịta banyere otu amụma ochie bụ́ nke kwuru banyere mgbanwe a ga-agbanwe ụwa ịghọ paradaịs. Ọ̀ ga-amasị gị ka m gụọrọ gị ihe onye amụma ahụ kwuru? [Gụọ Aịsaịa 11:6-9.] Amụma a na-eme ka m chee echiche banyere otu ihe Koran kwuru bụ́ nke dị na broshuọ a.” Sapeta peji nke 9 na broshuọ Guidance of God, gụọkwa nhota okwu ahụ e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo bụ́ nke na-ekwu na ndị ezi omume ga-eketa ụwa. Ọ bụrụ na e gosiri mmasị, gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ site n’ịtụle paragraf nke 7 ruo nke 9, nke ya na peji ahụ cherịtara ihu. Hapụrụ ya broshuọ ahụ, meekwa ndokwa maka nletaghachi.—Maka ụzọ iche ihe n’ihu ọzọ, lee Ozi Alaeze Anyị nke February 1998, peji nke 6, paragraf nke 26.
9 Mgbe ị na-agwa mmadụ ka ọ tụlee broshuọ Guidance of God, ọ kasị mma ikwu na ọ bụ nkwurịta okwu, ọ bụghị ọmụmụ Bible. Mgbe unu mụchara broshuọ ahụ, onye ahụ ị na-amụrụ ihe ekwesịwo ịdị njikere ịmụ broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Akwụkwọ ndị ọzọ e dere karịsịa maka ndị Alakụba bụ traktị bụ́ How to Find the Road to Paradise na akwụkwọ nta bụ́ The Time for True Submission to God.
10 N’ịbụ ndị nwetaworo ihe ọmụma a banyere nkwenkwe ndị Alakụba na ihe ndị na-akpasu ha iwe, anyị kwesịrị inwe ezi uche n’ịhọrọ akwụkwọ ndị anyị ga-enyefe ndị Alakụba nakwa otú anyị si agbara ha àmà. Ka Jehova nọgide na-agọzi mgbalị anyị inyere ụdị mmadụ nile aka ịkpọku aha ya iji bụrụ ndị a ga-azọpụta.—Ọrụ 2:21.