Atụfula Ya
Ị̀ Na-enye Ndị Mmadụ Broshọ Ndị A?
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị na-amachaghị Baịbụl, nke ka nke, ndị na-anaghị aga chọọchị
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Anyị ga-achọ ịma ihe i chere gbasara ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru ebe a. [Gụọ Abụ Ọma 37:11. E kwuru gbasara amaokwu Baịbụl a na paragraf ikpeazụ dị ná nkebi nke 11.] Olee otú i chere ụwa anyị a ga-adị ma Chineke mee ihe a e kwuru ebe a? [Chere ka ọ zaa.] Ihe a bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ọma Baịbụl kwuru na Chineke ga-emere ụmụ mmadụ. N’agbanyeghị ebe mmadụ bi ma ọ bụ okpukpe ọ na-ekpe, onye ahụ gụọ Baịbụl, ọ ga-agụta ha.” Gụọrọ ya ihe e dere ná mgbago mgbago peeji nke 3. Ị gụchaa ya, nye ya broshọ a.
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ọ bụrụ na i ji akwụkwọ Bible Na-akụzi na-eduziri onye na-anaghị aga chọọchị ọmụmụ Baịbụl, gị na ya jiri nkeji ole na ole mụọ otu nkebi dị na broshọ a. Unu nwere ike mụọ ya tupu unu amụọ ihe unu chọrọ ịmụ n’ụbọchị nke ọ bụla ma ọ bụkwanụ unu amụọ ya mgbe unu mụchara. Unu na-eme otú ahụ, ọ ga na-amata ihe Baịbụl na-ekwu.
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bekee, Efịk, Fulfulde, Igbo, Isoko, Tiv, na Yoruba.
Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ anyị, mgbe ụfọdụ, anyị na-ebido chewe ebe onye ahụ gara. Anyị na-echekwa ma è nwere ihe ga-emekata mee ka anyị hụ ya ọzọ. Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ?” [Chere ka ọ zaa.] Gụzie Job 14:14, 15. Ị gụchaa, sị ya: “Broshọ a kọwara ebe ndị anyị, ndị nwụrụ anwụ, gara. O kwukwara ma hà ga-emecha dịrị ndụ ọzọ.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Sapeta isiokwu nke mbụ ma gụọ paragraf nke 4. Ị gụchaa ya, sị ya: “M bịa ụbọchị ọzọ, anyị ga-eji Baịbụl zaa ajụjụ a.” Ị gaa ụbọchị ọzọ, gị na ya tụlee paragraf ụfọdụ dị na isiokwu nke 9.
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bekee, Efịk, Gun, Igbo, Isoko, Tiv, na Yoruba.
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị na-amaghị akwụkwọ
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Ì chere na o nwere ihe mmadụ ga-emegide n’ụwa a, ya na Chineke abụrụ enyi? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Jems 2:23.] Broshọ a ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ka anyị na Chineke bụrụ enyi otú ahụ ya na Ebreham bụ.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Gị na ya mụọ ihe ọmụmụ nke mbụ ma ọ bụkwanụ unu amụọ ihe dị ka ọkara ya. Unu nwere ike mụọ ya n’ụbọchị mbụ ahụ gị na ya hụrụ ma ọ bụkwanụ n’ụbọchị ọzọ ị gaghachiri na nke ya.
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bariba, Bekee, Efịk, Gokana, Gun, Igbo, Isoko, Khana (Ogoni), Tiv, na Yoruba.
A Satisfying Life—How to Attain It
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị gụrụ akwụkwọ ma ha anaghị aga chọọchị
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Ihe mere anyị ji bịa bụ na anyị chọpụtara na ndị mmadụ chọrọ ihe ga na-eme ha obi ụtọ. O nweghị onye n’ime anyị na-anaghị enwe nsogbu mgbe ụfọdụ. Ya bịara anyị, anyị na-achọ ka enyi anyị ma ọ bụ onye ikwu anyị gwa anyị ihe anyị ga-eme. Anyị nwedịrị ike gaa n’ọ́bá akwụkwọ ma ọ bụ n’Ịntanet gaa lee ma ànyị ga-agụta ihe anyị ga-eme. Olee ebe i chere anyị nwere ike inweta ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ná ndụ? [Chere ka ọ zaa.] Ọ na-atụ ụfọdụ ndị n’anya ma ha sapeta Baịbụl gụta ihe baara ha ezigbo uru. Ka m gosi gị otu ihe atụ. [Ya bụrụ na ị ma agụ Bekee, sapeta isi nke 2 ma gụọrọ ya otu n’ime amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ.] Broshọ a ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwekwu obi ụtọ.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ọ bụrụ na ọ naara gị ya, sị ya: “E nweela ọtụtụ ndị a gwara na ihe juru na Baịbụl bụ naanị ụgha. M bịa ụbọchị ọzọ, m ga-egosi gị ihe Baịbụl kwuru, nke sayensị kwetara na ọ bụ eziokwu. O nwekwara ike ịmasị gị.” Ị gaa ụbọchị ọzọ, gị na ya tụlee peeji nke 12, paragraf nke 4.
E nwere broshọ a n’asụsụ Bekee.
The Origin of Life—Five Questions Worth Asking
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ, ndị a na-akụziri ozizi evolushọn n’ụlọ akwụkwọ. Ọ dịkwa mma iji ya nyere ndị kweere n’ozizi evolushọn aka, ha na ndị na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị nakwa ndị na-ekweghị na Chineke dị (E meghị broshọ a ka e jiri ya na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ.)
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ akwụkwọ sayensị niile na-akụziri ndị mmadụ evolushọn. Ì chere na evolushọn bụ ihe ndị mmadụ ji aka ha chepụta ka ì chere na ọ bụ eziokwu doro mmadụ niile anya? [Chere ka ọ zaa.] Ka mmadụ ghara ikwere ihe na-edoghị ya anya, echere m na ọ dị mma ka anyị leruo okwu a anya nke ọma. Í cheghị otú ahụ? [Chere ka ọ zaa.] Broshọ a kwuru ihe ụfọdụ ndị lechara anya wee kwere na e nwere onye kere ihe niile dị ndụ.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ị gaa akwụkwọ, dewe broshọ a n’elu lọka gị. Legodị ma è nwere nwa klas unu ga-ewelite ya chọọ ịgụ.
E nwere broshọ a n’asụsụ Bekee.
Why Should We Worship God in Love and Truth?
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Hindu
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “E nwere otu ekpere ndị India na-ekpe. Ha na-arịọ Chineke ka o nyere ha aka ịchọta eziokwu na ìhè. Ì chere na ọ dị mkpa ka anyị hụ Chineke n’anya ma jiri eziokwu na-efe ya? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Jizọs kwuru n’okwu a.” Gụọ Jọn 4:24. Gụzie peeji nke 3, paragraf nke 4. I mechaa, nye ya broshọ a.
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ya nara gị ya, sị ya: “Ụfọdụ ndị ụkọchukwu Hindu na-asị na eziokwu dị n’obi anyị. Ndị ọzọ n’ime ha na-asị na eziokwu dị n’akwụkwọ nsọ ndị Hindu. M bịa ụbọchị ọzọ, m ga-achọ ka anyị leba anya n’ajụjụ a jụrụ ná ngwụcha ngwụcha paragraf nke 3 na peeji nke 4. Ọ sị: ‘Olee ebe anyị ga-aga nweta eziokwu Chineke na-akụzi?’”
E nwere broshọ a n’asụsụ Bekee.
The Pathway to Peace and Happiness
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Buda
Otú e nwere ike isi nye ya onye dimkpa na-ekpe okpukpe Buda: “O nwere ike, omume ọjọọ juru ebe niile taa na-echu gị ụra otú ọ na-echu m n’ihi na o meela ka ụmụ anyị na-akpa àgwà ọjọọ. Gịnị ka i chere mere ndị na-eto eto ji na-akpa arụ dị egwu taa? [Chere ka ọ zaa.] Ị̀ ma na e nwere akwụkwọ kwuru na ọ ga-adị otú a? E bidoro ide akwụkwọ ahụ tupu okpukpe Ndị Kraịst, nke ndị Hindu, na nke ndị Alakụba amalite ịdị. [Gụọ 2 Timoti 3:1-3.] Akwụkwọ Nsọ kwukwara na omume ọjọọ a ga-adị n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-amụ taa. [Gụọ amaokwu 7.] Ihe e dere n’akwụkwọ a nyere m aka ịmụta eziokwu ọtụtụ ndị na-enwebeghị ike ịmụta. Ị̀ ga-achọ ịgụ ya?”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ị gaa ụbọchị ọzọ, buru ụzọ mee ka onye ahụ nwee mmasị ịmụ Baịbụl. I mechazie, gosi ya ajụjụ ndị a jụrụ n’azụ broshọ ahụ. Gosikwa ya ebe ahụ e kwuru gbasara akwụkwọ Bible Na-akụzi. Gwa ya na ị chọrọ igosi ya akwụkwọ ahụ. I wepụta ya, mepee ebe e dere isiokwu ndị dị n’ime ya ma gwa ya ka ọ họrọ nke masịrị ya. Gị na ya tụlee otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ dị na nke ọ họọrọ.
E nwere broshọ a n’asụsụ Bekee.
Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Afrịka
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Okpukpe niile hà na-akụzi eziokwu? Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, sị ya:] Anyị na-ahụ ọtụtụ chọọchị ọhụrụ kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-asịkwa na mmadụ nwere ike ịnọ na nke ọ bụla masịrị ya na-efe Chineke. Ma, 1 Ndị Tesalonaịka 5:21 gwara anyị ihe anyị kwesịrị ime. [Gụọ ya.] Olee otú anyị si mara na ọ bụghị okpukpe niile ga-enyere mmadụ aka ife Chineke? Legodị ihe e kwuru na peeji nke 5, paragraf nke 3 na broshọ a. [Gụọ ahịrịokwu abụọ mbụ dị ebe ahụ.] Ebe ọ bụ na ọ bụghị okpukpe niile na-akụzi eziokwu, olee otú anyị nwere ike isi mara nke na-akụzi eziokwu? Akwụkwọ a ga-enyere gị aka.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: “Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova hụ anyị n’anya ma na-echebe anyị, anyị kwesịrị ife ya otú o si chọọ. Ọ bụ ya mere m bịa ụbọchị ọzọ, anyị ga-eleba anya n’isiokwu dị na peeji nke 19, nke sịrị: ‘Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?’”
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bekee, Efịk, Gun, Igbo, Isoko, Tiv, na Yoruba.
Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Afrịka
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Ọtụtụ nde mmadụ kweere na mmadụ nwụọ, ya alaa ala mmụọ gaa biri. Ha na-ekwukwa na ndị ahụ nwụrụ anwụ na-ahụ ndị dị ndụ nakwa na ha nwere ike nyere ha aka ma ọ bụ taa ha ahụhụ. Ì kwetara ihe a ha na-ekwu?” [Chere ka ọ zaa.] Gụzie Ekliziastis 9:5, 10. Ị gụchaa, sị ya: “Ọ bụrụ na ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu, oleekwanụ ndị bụ́ ndị ahụ na-eme ka hà bụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ? Broshọ a zara ajụjụ a.” Nye ya broshọ a.
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ọ bụrụ na onye ahụ naara gị ya, sapeta peeji nke 13 ma gwa ya ka ọ gụọ paragraf nke mbụ. Gwa ya na ị ga-abịa ụbọchị ọzọ ka unu lebakwuo anya n’okwu a.
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bekee, Efịk, Gun, Igala, Igbo, Isoko, Tiv, na Yoruba.
The Guidance of God—Our Way to Paradise
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Alakụba, ndị bi ebe a na-agaghị enye ha nsogbu ma ha mụwa Baịbụl
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Ama m na ndị ụka unu kweere na e nwere naanị otu ezi Chineke. Ha kwetakwara n’ihe ndị amụma kwuru. Ọ́ bụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] M chọrọ igosi gị otu amụma e buru n’oge ochie, nke kwuru na a ga-eme ka ụwa anyị a ghọọ paradaịs. Ọ̀ bụ m gụọrọ gị ya? [Gụọ Aịzaya 11:6-9.] Ọtụtụ ndị na-ajụ sị: ‘Olee otú Chineke ga-esi eme ihe a niile e kwuru ebe a?’ Broshọ a kwuru ihe ndị amụma kwuru gbasara okwu a.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ọ bụrụ na ọ naara gị ya, sị ya: “Akwụkwọ Nsọ kwuru na mgbe Chineke kere mmadụ mbụ, o tinyere ya na paradaịs. M bịa ụbọchị ọzọ, o nwere ajụjụ m ga-aza. Ajụjụ ahụ bụ, ‘Olee otú mmadụ mbụ ahụ si nupụrụ Chineke isi, nke mere na anyị anọghị na paradaịs taa?’” Ị gaa ụbọchị ọzọ, gị na ya malite n’isiokwu dị na peeji nke 6.
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bekee, na Yoruba.
Real Faith—Your Key to a Happy Life
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Alakụba, ndị bi ebe a na-agaghị enye ha nsogbu ma ha mụwa Baịbụl
Otú e nwere ike isi nye ha ya: Gosi ya foto dị na peeji nke 16 na 17 ma sị ya: “Ihe e sere ebe a dị nnọọ iche n’otú ụwa anyị a dị. Ì chere na ụwa a ga-emecha dị otú a? [Chere ka ọ zaa.] Legodị nkwa Akwụkwọ Nsọ a kwuru na Chineke kwere anyị. [Gụọ otu n’ime amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ.] Broshọ a ga-enyere anyị aka inwe okwukwe siri ike na nkwa a Chineke kwere ga-eme.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Gị na ya kwuchaa, gwa ya ka ọ họrọ otu n’ime ajụjụ ndị a jụrụ n’azụ akwụkwọ ahụ ka unu leba ya anya ụbọchị ọzọ. Gị na ya yie mgbe ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ ahụ ọ họọrọ.
E nwere broshọ a n’asụsụ Awụsa, Bekee, Tiv na Yoruba.
Lasting Peace and Happiness—How to Find Them
Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Chaịna
Otú e nwere ike isi nye ha ya: “Nsogbu juru n’ụwa anyị a emeela ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ. Ma, olee ihe na-eme gị obi ụtọ mgbe ụfọdụ? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru. [Gụọ Abụ Ọma 119:1, 2.] Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ndị Amerịka na ndị Yurop ka e bu n’obi dee Baịbụl. Legodị ihe e dere ebe a. [Tụleenụ peeji nke 17, paragraf nke 16.] Broshọ a kwuru ihe anyị ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ, obi eruokwa anyị ala.”
Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ: Ọ bụrụ na ọ naara gị ya, sapeta peeji nke 17, gụọnụ ahịrịokwu atọ mbụ dị na paragraf nke 18. Unu mechaa, sị ya: “M bịa ụbọchị ọzọ, m ga-egosi gị ihe Baịbụl kwuru Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu.” Ị gaa ụbọchị ọzọ, gị na ya tụlee otu n’ime ihe ndị e kwuru na peeji nke 30, paragraf nke 6.
E nwere broshọ a n’asụsụ Bekee na Chaịniiz.