Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 30
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 30
Abụ nke 30 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 16 ¶1-7, igbe dị na p. 128 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 43-46 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 45:15-25 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Ndidi Chineke Ga-esi Eme Ka A Zọpụta Anyị—2 Pita 3:9, 15 (Nkeji 5)
Nke 3: Okpukpe Niile Hà Dị Mma?—td 31B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Febụwarị.
Nkeji 10: Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Mbụ. Okwu si na Teta! Jenụwarị–Mach 2012, peeji nke 16-19.
Nkeji 20: “Ì Kpebiela Otú Ị Chọrọ Ka E Si Gwọọ Gị ma Ihe Gbata Gbata Mee?” Ajụjụ na azịza. Jiri paragraf nke mbụ mere okwu mmeghe, jirikwa paragraf ikpeazụ mere okwu mmechi. Ọ bụrụ na ọ ga-esiri ndị ọgbakọ unu ike ile vidio ahụ, kama ịtụle ajụjụ na azịza a, okenye ọgbakọ tụlee ihe e kwuru na S-55. Isiokwu ya bụ: “Ihe Ndị Nne Na Nna Nwere Ike Ime Iji Hụ na A Mịnyeghị Ụmụ Ha Ọbara.” Ọ ga-ekwu ya ka okwu ihu ọha.
Abụ nke 116 na Ekpere