Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Febụwarị
“Ì chere na Chineke nwere okpukpe ọ chọrọ ka ndị na-efe ya taa nọrọ ka ì chere na ọ bụ ebe ọ bụla ọ sọrọ mmadụ ya nọrọ fewe Chineke? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe magazin a kwuru gbasara ndị fere Chineke n’oge ochie.” Sapeta Ụlọ Nche Febụwarị 1, peeji nke 26. Gị na ya tụlee ajụjụ nke mbụ. Gbalịakwa gụọ otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. Nyezie ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.”
Ụlọ Nche Febụwarị 1
“Ị̀ nụtụla ‘Amagedọn’? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ebe e kwuru okwu gbasara Amagedọn na Baịbụl. [Gụọ Mkpughe 16:16. Jụzie ya, sị:] Gịnị ka i chere anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịnwụ n’agha Amagedọn? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gosi ya ihu magazin a ma sị ya:] Magazin a gosiri ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ ndị a e dere ebe a.”
Teta! Jenụwarị–Mach
“N’oge a ihe isi ike na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala, ọ dị mma ka anyị na-akpachapụ anya n’otú anyị si emefu ego. Ma, gịnị ka i chere mere o ji dị mma ka anyị na-echekwa ego a dịghị ama ama ihe gbata gbata emee? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ekliziastis 7:12.] Ka ego nwee ike ichebe anyị, anyị kwesịrị ịma otú anyị ga-esi na-echekwa ya. Isiokwu malitere na peeji nke 4 ruo peeji nke 6 na magazin a kwuru otú ụfọdụ i nwere ike isi chekwaa ego ị na-akpata.”