Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Febụwarị 1
“Ì chere na mmadụ nwere ike ịma ụdị onye Chineke bụ? [Chere ka ọ zaa.] E nwere isiokwu dị na magazin a zara ajụjụ a otú dị mma.” Gụọ ihe e dere n’okpuru ajụjụ nke 2 dị na peeji nke 16, gụọkwa otu amaokwu Baịbụl ndị e depụtara ebe ahụ, gị na ya tụleekwa ya. Nyefee ya magazin ndị ahụ, gwakwa ya na ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke 3.
Jenụwarị-Mach
“Ì chere na o kwesịrị ekwesị ikpegara ndị senti ekpere? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Jọn 14:6.] O doro anya na ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ekpere, e kwesịkwara ikpe ya n’aha Jizọs Kraịst.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 14.
Mach 1
“Ihe e ji mara Ndịàmà Jehova bụ ikwusa ozi ọma. Ì chetụla ihe mere anyị ji na-arụ ọrụ a? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ya mere anyị ji na-arụ ya. [Gụọ Matiu 24:14.] Magazin a zara ajụjụ ndị a: Gịnị bụ ozi ọma nke a? Gịnị bụ Alaeze ahụ? Gịnịkwa bụ ọgwụgwụ ahụ nke ga-abịa?”
Jenụwarị-Mach
“O yiri ka ọtụtụ ụmụ nwoke hà na-enwezi mmasị idina ụmụ nwoke ibe ha, ụmụ nwaanyị ana-enwekwa mmasị idina ụmụ nwaanyị ibe ha. Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Levitikọs 18:22.] Baịbụl kwuru hoo haa na Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị nwoke na nwaanyị ga-enwe mmekọahụ nakwa na ọ bụ naanị di na nwunye kwesịrị inwe ya.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 22.