Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche May 15
“Olee ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ a? [Jụọ ya ajụjụ ahụ gbara n’ihu magazin ahụ. Ị jụsịa ya, i chere ka ọ zaa.] Bible gwara anyị ihe mere anyị ga-eji nwee olileanya. [Gụọ Matiu 6:9, 10.] Magazin a na-akọwa otú Alaeze Chineke ga-esi eme ka e mee uche Chineke n’ụwa.”
Ụlọ Nche June 1
“Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị nile ka anyị na-anụ akụkọ banyere ndị mere mpụ. [Kọọ otu nke mere ọhụrụ, bụ́ nke ndị bi n’ókèala unu maara banyere ya.] Ì chetụla ma ò nwere onye ọjọọ a na-adịghị ahụ anya nke na-akpali ndị mmadụ ime ihe ọjọọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị agụọ Mkpughe 12:12.] Magazin a na-akọwa otú anyị pụrụ isi chebe onwe anyị pụọ n’aka onye ọjọọ ahụ.”
Teta! Apr.–June
“N’ọtụtụ ebe n’ụwa taa, ndị mmadụ na-ele omume ọma anya dị ka ihe na-ala ala. Ị̀ chọpụtara ya otú ahụ? [Chere ka ọ zaa.] O nwere otu amụma Bible omume ndị anyị na-ahụ taa na-emezu. [Gụọ 2 Timoti 3:2-4.] Ma, gịnị ka otú omume ọma si na-ala ala na-egosi, oleekwa ebe ọ ga-eduga ụmụ mmadụ? Magazin a zara ajụjụ ndị a.”
“Ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst. Olee ihe i chere ịbụ Onye Kraịst pụtara? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Jizọs kwuru n’ebe a. [Gụọ Jọn 15:14.] Isiokwu a na-egosi na ka mmadụ wee bụrụ Onye Kraịst n’eziokwu, ọ chọrọ ihe karịrị ikwu ya n’ọnụ.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 28.