Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
May 1
Gụọ Matiu 24:3. Kwuzie, sị: “Ụfọdụ na-eche na ajụjụ a bụ maka oge ụwa anyị a ga-agwụ. Ì chere na a ga-ebibi ụwa a? [Chere ka ọ zaa.] Ihe Jizọs zara mere ka anyị nwee ihe anyị ga-atụwa anya ya. Ọ bụghị oge ụwa a ga-agwụ, kama ọ bụ oge ihe ọzọ ga-agwụ. Isiokwu dị na peeji nke 16 kọwakwuru nke a.”
April–June
Gụọ Diuterọnọmi 30:19, 20. Jụzie ya: “Ọ̀ bụ Chineke na-ekpebi ihe ga-eme ná ndụ anyị? [Chere ka ọ zaa.] Ọ bụrụ na ọ bụ ya, mara na o jighị obi ọcha ya gwa ndị na-ejere ya ozi ka ha họrọ ndụ, ọ dịghịkwa uru ọ bara na ọ gwara ha mee otú ahụ.” Isiokwu dị na peeji nke 10 na magazin a gosiri anyị otú anyị ga-esi họrọ ndụ.
June 1
“Akwụkwọ ndị na-enyere mmadụ aka ịzụ ụmụ, ndị na-akụzi ihe gbasara ịhụnanya, na inwe afọ ojuju ná ndụ na-ewu ewu taa. Ò nweela nke nyeere gị aka? [Chere ka ọ zaa.] Ọtụtụ ndị na-eleghara ebe a anyị nwere ike isi nweta ndụmọdụ ga-abara anyị uru anya. [Gụọ 2 Timoti 3:16.] Magazin a kọwara ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Baịbụl obi, gosikwa anyị ụfọdụ n’ime ndụmọdụ ndị bara uru dị n’ime Baịbụl.”
April–June
Ì chetụla ihe mere ọtụtụ ndị di na nwunye ji agbasa, ma ole na ole n’ime ha na-anọgide? [Chere ka ọ zaa.] N’ebe a, Baịbụl gosiri anyị ihe nwere ike ime ka di na nwunye ghara ịgbasa. [Gụọ Ndị Hibru 13:4] Baịbụl gbara ndị di na nwunye ume ka obi ha dịrị naanị na nwunye ma ọ bụ di ha.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 14.