Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Febụwarị
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ Ekwensu na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa. Ma, ha amaghị ebe Ekwensu si bịa. Ha amaghịkwa ma ọ̀ bụ Chineke kere ya. Gịnị ka gịnwa chere? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị ya] Legodị ihe Ụlọ Nche a kwuru.” Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 16 n’Ụlọ Nche Febụwarị 1, gị na ya tụleekwa ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ. Gụọkwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya kwuokwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Febụwarị 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị ekwuo, sị: “O nwere otu onye m chọrọ ịjụ gị banyere ya. Ma Ndị Kraịst ma ndị Juu ma ndị Alakụba na-akwanyere onye ahụ ùgwù. Aha ya bụ Mozis. Gịnị na-agbata gị n’obi mgbe ọ bụla ị nụrụ aha ya a? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị] O nwere oge ụfọdụ Mozis mehiere ihe, ma legodị ihe Baịbụl kwuru banyere ya. [Gụọ Diuterọnọmi 34:10-12. Ị gụchaa, gị asị] Ụlọ Nche a kwuru atọ n’ime àgwà ọma ndị o nwere. O kwukwara otú anyị nwere ike isi mụta àgwà ọma ndị ahụ.”
Teta! Jenụwarị–Febụwarị
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị kwetara na ndị ezi omume ga-adị ndụ ebighị ebi. Ma, ụfọdụ na-asị na ọ ga-abụ n’eluigwe, ndị ọzọ ana-asị na ọ ga-abụ n’ụwa. Olee ihe gịnwa chere? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na Chineke kechara ụwa a nye ya ụmụ mmadụ ka ha biri. [Gụọ Abụ Ọma 115:16.] Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na ndị ezi omume ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. Akwụkwọ a m ji zara ajụjụ abụọ dị mkpa ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara Paradaịs. Ị ga-ahụ ha n’isiokwu bidoro na peeji nke 14.”