Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Febụwarị
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, sị ya: “Ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche gbasara Baịbụl. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ Okwu Chineke. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ dị ka akwụkwọ ndị ọzọ. Gịnwakwanụ? Ì chere na Baịbụl bụ Okwu Chineke?” Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gosi ya ihe e dere n’azụ Ụlọ Nche nke Febụwarị 1. Tụleenụ ajụjụ nke mbụ dị na peeji ahụ, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Febụwarị 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị chọrọ ka a kwụsị ịlụ agha n’ụwa a. Ì chere na o nwere mgbe udo ga-adị n’ụwa a? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, sị ya:] Ka m gosigodị gị nkwa Chineke kwere anyị. [Gụọ Abụ Ọma 46:9.] Ụlọ Nche a kwuru na ihe ndị mere n’oge a na-alụ Agha Ụwa Mbụ nakwa ihe ndị na-eme kemgbe o biri na-eme ka obi sie anyị ike na Chineke ga-emezu nkwa a o kwere anyị.”
Teta! Jenụwarị–Febụwarị
Gwa onye ị gara na nke ya, sị: “Ama m na obi ga-adị gị ụtọ ịma na anyị ga-emeli ka anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị na-ebi n’udo. Ma, ị̀ ma ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-ebi n’udo? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, sị ya:] Lee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka. [Gụọ Jems 1:19.] Ọ bụrụ na anyị na-ege ibe anyị ntị, o gosiri na anyị hụrụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’anya. Isiokwu dị na peeji nke 12 na Teta! a kwuru ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere di na nwunye aka ịna-ege ibe ha ntị, meekwa ka ha biri n’udo.”