Akụkọ Ozi
Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na ndị nkwusa nyere akụkọ ozi ha n’ọnwa Ọgọst 2011 dị 330,316. Nke a bụ ọnụ ọgụgụ kacha elu anyị na-enwetụbeghị. E kee awa ole e ji gaa ozi ọma n’ọnwa Ọgọst, onye ọ bụla ketara ihe karịrị awa iri na otu, duziekwa ihe karịrị otu ọmụmụ Baịbụl. N’afọ ije ozi 2011, e mere 12,687 baptizim. Ọ bụ otú a ka anyị si pịachie afọ ije ozi 2011. Akụkọ ozi a gosiri na Jehova gọziri mbọ anyị gbara. Otú anyị ga-esi egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ n’otú o si gọzie anyị bụ ịgbalị na-ekwusa ozi ọma ma na-aga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị.—Ọma 116:12-14.