Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/12 p. 4
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 1/12 p. 4

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jenụwarị: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshọ ọ bụla ga-amasị ha. Febụwarị: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ Bịaruo Jehova Nso. Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Eprel: Ụlọ Nche na Teta!

◼ Malite n’ọnwa Febụwarị, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ: “Obi Ike Gị Ọ̀ Dị n’Ebe Jehova Nọ?”

◼ Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na n’afọ 2012, a ga-enwe mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ ndị ogbi n’ebe ndị a: Badagri (Febụwarị 18 na Jun 2-3); Bini Siti (Febụwarị 25-26 na Julaị 7); Ibadan (Eprel 14-15 na Julaị 14); Kwali (Mach 10-11. Ọ bụ naanị mgbakọ sekit ka a ga-enwe); Leki (Mee 19-20 na Ọgọst 26); Uli (Mee 5-6 na Ọgọst 18). A ga-enwe mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’asụsụ French n’Eprel 1 na Jun 9-10. Ọ bụ na Badagri ka a ga-enwe ya. N’ụbọchị ndị ahụ a ga-enwe mgbakọ n’asụsụ ndị ogbi, a ga-eme ihe omume niile n’asụsụ ndị ogbi. N’ụbọchị a ga-enwe ha n’asụsụ French, a ga-eme ihe omume niile n’asụsụ French. Ndị na-anụ asụsụ ndị ahụ nwere ike ịbịa mgbakọ ndị ahụ.

◼ E nwere isiokwu ọhụrụ ga na-agba n’Ụlọ Nche nke ọhaneze malite n’afọ a. Isiokwu ya bụ “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl.” Ndị nne na nna nwere ike iji ya na-akụziri ụmụ ha dị ihe dị ka afọ atọ ihe. A ga-ebido ibipụta isiokwu a n’Ụlọ Nche nke Febụwarị 1, 2012. A ga na-eme e bipụta nke ahụ n’ọnwa a, e bipụta “Kụziere Ụmụ Gị Ihe” n’ọnwa ọzọ, ya ruokwa n’oge ọzọ e bipụta “Maka Ndị Na-eto Eto.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya