Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 6
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 6
Abụ nke 101 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 16 ¶8-12, igbe dị na p. 132 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 47-51 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 51:1-11 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Kraịst Kwesịrị Ịna-akpọ Aha Chineke—td 20A (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Mere Chineke nke Ịhụnanya Ga-eji Bibie Mmadụ Ọ Bụla?—2 Tesa. 1:6-9 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Abụọ. Okwu si na Teta! Jenụwarị–Mach 2012, peeji nke 26-29.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Febụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji isiokwu ndị mbụ gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 1 nye ha magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ha. Meekwa otu ihe ahụ na Teta! Jenụwarị–Mach 2012. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ndị na-ege ntị otú ha ga-esi jiri ya nye mmadụ magazin ahụ. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche Jenụwarị 1 na Teta! Jenụwarị–Mach 2012.
Abụ nke 96 na Ekpere