Ì Kpebiela Otú Ị Chọrọ Ka E Si Gwọọ Gị ma Ihe Gbata Gbata Mee?
O nweghị onye ma ihe ga-eme echi. Mmadụ nwere ike ịda ọrịa na mberede. (Jems 4:14) N’ihi ya, onye ma ihe na-ejikere ejikere a dịghị ama ama. (Ilu 22:3) Ì kpebiela otú ị ga-achọ ka e si gwọọ gị? Ì depụtala ya na kaadị DPA gị? E wepụtara diiviidi bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights ka o nyere gị aka. Na diiviidi a, e nwere fim ọzọ a kpọrọ Transfusion-Alternatives—Documentary Series. Ọ bụrụ na ị na-anụ Bekee, kirie fim a ma gbalịa zaa ajụjụ ndị e depụtara n’okpuru ebe a. Ebe ọ bụ na e gosiri ebe ụfọdụ a na-awa mmadụ ahụ́ na fim a, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịma ihe ha ga-eme mgbe ha na ụmụ ha ndị obere na-ekiri ya.
(1) Gịnị mere ụfọdụ ndị dọkịta anaghịzi eji ọsọ amịnye ndị ha na-agwọ ọrịa ọbara? (2) Olee mmadụ atọ a wara ahụ́ na vidio ahụ, bụ́ ndị a na-amịnyeghị ọbara n’agbanyeghị na ahụ́ a wara ha tara ezigbote akpụ? (3) Gịnị mere ọtụtụ ndị dọkịta n’ụwa niile ji ekweta ịgwọ ndị mmadụ ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara? (4) Gịnị ka ndị mere nnyocha n’ụlọ ọgwụ dị iche iche n’oge na-adịbeghị anya chọpụtara? (5) Olee ụfọdụ nsogbu onye ọrịa nwere ike inwe ma a mịnye ya ọbara? (6) Gịnị ka ọtụtụ ndị ọkachamara kwuru, bụ́ ndị chọpụtarala uru ọ bara ịgwọ mmadụ n’ejighị ọbara? (7) Gịnị na-eme ka ọbara ghara ịdị mmadụ n’ahụ́? Oleekwa ihe e nwere ike ime ka onye ahụ nwekwuo ọbara? (8) Olee otú e nwere ike isi mee ka ahụ́ onye ọrịa mepụtakwuo mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara? (9) Olee ụzọ ndị e si eme ka ọbara ghara ịgbafusị mgbe a na-awa mmadụ ahụ́? (10) È nwere ike ịgwọ ụmụaka ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa nwere ike igbu ha n’amịnyeghị ha ọbara? (11) Olee ikike onye ọrịa nwere nke dọkịta ọ bụla na-enweghị ikike ịnapụ ya?
Ebe ọ bụ na ọ bụ Onye Kraịst ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-ekwe ka e jiri ụzọ ụfọdụ e gosiri na fim a gwọọ ya, ọ dị mkpa ka i kpebie ugbu a otú ị chọrọ ka e si gwọọ gị ma ihe gbata gbata mee. Gụọ akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke, isi nke 7, gụọkwa ebe ndị ọzọ akwụkwọ ahụ kwuru ka a gụọ. Gbalịakwa gụọ ihe ndị a kọwara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa Disemba 2006. Mgbe i mechara, hụ na i debara ihe niile ị họọrọ na kaadị DPA gị ma ọ bụrụ na e meela gị baptizim. Gbaakwa mbọ hụ na i ji kaadị ahụ na-aga ebe ọ bụla ị na-aga.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Ì kpebiela otú ị ga-achọ ka e si gwọọ gị? Ì depụtala ya na kaadị DPA gị?