Ị̀ Na-eyigharị Ya?
Eyigharị gịnị? Ọ bụ idejupụta kaadị DPA gị (durable power of attorney), bụ́ nke a na-enye Ndịàmà niile e mere baptizim. Ebe ọ bụ na ‘ị maghị ihe ndụ gị ga-abụ echi,’ ọ dị ezigbo mkpa ka i buru ụzọ kpebie otú ị ga-achọ ka e si gwọọ gị mgbe i nwere ihe mberede ma detuo ihe i kpebiri. (Jems 4:14; Ọrụ 15:28, 29) E wepụtara vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights ka o nyere gị aka. Ebe ọ bụ na e mere vidio a naanị n’asụsụ Bekee, kirie ya ma ọ bụrụ na ị na-aghọta Bekee, kpee ekpere banyere ya, ma jiri ihe ndị e depụtara n’okpuru ebe a tụgharịa uche n’ihe ndị ị mụtara.—Ihe ị ga-eburu n’uche: Ebe ọ bụ na e gosiri ebe ụfọdụ a na-awa ahụ́ na vidio ahụ, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịma ihe ha ga-eme mgbe ha na ụmụ ha ndị obere na-ekiri ya.
(1) Ụfọdụ ndị dọkịta na-elebagharịzi anya ma ọ̀ ka dịkwa mma ka ha na-amịnye ndị ọrịa ọbara mgbe ha na-agwọ ha n’ihi na ọtụtụ ndị ọrịa anaghị achọtụdị ka a mịnye ha ọbara. Ihe ọzọkwa bụ n’ihi ihe ize ndụ ndị na-adị n’ịmịnye mmadụ ọbara nakwa n’ihi na ọbara na-adazi ọnụ. (2) Ndị dọkịta awaala ndị mmadụ ụdị ịwa ahụ́ chọrọ mkpachara anya n’amịnyeghị ndị a wara ha ọbara. Atọ e gosiri na vidio a bụ: Ịwa ụmụaka ahụ́ n’obi, ịwa ahụ́ n’imeju, na ịwa ahụ́ n’ọkpụkpụ. (3) Ihe karịrị otu narị puku ndị dọkịta nọ ná mba otu narị na iri ise ekwetala na ha agaghị na-amịnye ndị ọrịa ọbara mgbe ha na-agwọ ha. Gịnị mere ha ji kweta? Ọ bụ iji kwanyere mkpebi onye ọrịa ùgwù.
(4) Nnyocha e mere n’ụlọ ọgwụ dị iche iche n’oge na-adịbeghị anya gosiri na e nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi na a na-amịnye ndị mmadụ ọbara mgbe ọ na-adịghị mkpa. A chọpụtakwala na ọtụtụ ndị ọbara kọrọ n’ahụ́ a na-amịnyeghị ọbara mgbe a na-agwọ ha na-aka agbake ngwa ngwa karịa ndị a mịnyere ọbara. (5) Ụfọdụ nsogbu onye ọrịa nwere ike inwe ma a mịnye ya ọbara bụ, ibute nje bakterịa, nje vaịrọs, ahụ́ ya agaghịzi na-alụso ọrịa ọgụ nke ọma, dọkịta ya nwekwara ike imehie ihe. (6) Ọtụtụ ndị ọkachamara achọpụtala uru ọ bara ịgwọ ndị mmadụ n’ejighị ọbara. Ụfọdụ n’ime uru ndị ọ bara bụ na ọ bụ otú ka mma isi gwọọ ọrịa, ọ na-ebeletakwa ego ịgwọ ọrịa na-efu. Ọ dịkwa mma ịmara na e nweelarị ọgwụ ndị na-adịghị ize ndụ, ndị na-arụ ọrụ, na ndị dị ọnụ ala.
(7) Ihe na-akpata ọbara ịkọ mmadụ n’ahụ́ bụ mgbe mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara na-adịghịzi ọtụtụ otú o kwesịrị ịdị n’ahụ́ onye ahụ. Ruo olee mgbe ka onye ọbara kọrọ n’ahụ́ nwere ike ịnọru ndụ? A chọpụtala na onye ọbara ya n’enweghị otú ọ ha aha nwere ike ịnọru ndụ karịa otú e cheburu. Ndị dọkịta kwuru na otú e nwere ike isi mee ka onye ọbara kọrọ n’ahụ́ nwekwuo ọbara bụ ịgbanye onye ahụ ihe ndị na-amụba ọbara n’ahụ́. (8) Olee otú e nwere ike isi mee ka ahụ́ onye ọrịa mepụtakwuo mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara? Ọ bụ inyekwu onye ahụ ọgwụ na-enye ayọn n’ahụ́. N’ahụ́ ndị ọrịa ụfọdụ, ọgwụ a na-akpọ erythropoietin (EPO) nwere ike ime ka ọbara ya haruo otú o kwesịrị. Ná mba ụfọdụ, EPO na-enwe albumin bụ́ nke e si n’ọbara enweta. Ọ dịịrị Onye Kraịst ọ bụla iji akọ na uche ya kpebie ma ọ̀ ga-anara ụdị ọgwụ a ma ọ bụ na ọ gaghị anara ya. (9) Olee ụzọ ndị e si eme ka ọbara ghara ịgbafusị mgbe a na-awa mmadụ ahụ́? Iji nlezianya waa ahụ́, iji ụzarị ọkụ chagbuo mkpụrụ ndụ ụfọdụ, bụ́ nke a na-akpọ electrocautery, ọgwụ ndị na-ebelata ọbara ọgbụgba, na iweghachi ọbara n’ahụ́ mgbe a na-awa ahụ́. Ọ dịịrị Onye Kraịst ọ bụla iji akọ na uche ya kpebie ma ọ̀ ga-anara ụdị ọgwụgwọ a ma ọ bụ na ọ gaghị anara ya.
(10) È nwere ike ịgwọ ụmụaka ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa nwere ike igbu ha n’amịnyeghị ha ọbara? Ee. Otu ihe atụ e gosiri bụ nke otu nwatakịrị dị afọ anọ nke obi ya nwere nnukwu nsogbu mgbe a mụrụ ya. A wakwara ya ahụ́ ugboro ugboro n’ejighị ọbara. N’otu n’ime ebe ndị kasị ekwo ekwo a na-agwọ ndị merụrụ ahụ́ n’Amerịka, bụ́ ebe a na-awa ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova jụrụ mmịnye ọbara ahụ́ tara akpụ kwa afọ n’ejighị ọbara, o yiri ka ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụnụ ò belatatụla. (11) Otu n’ime ụkpụrụ ndị bụ́ isi a na-eso mgbe a na-agwọ ndị mmadụ ọrịa bụ ịkwanyere ikike onye ọrịa nwere ịnara ma ọ bụ ịjụ ọgwụgwọ ụfọdụ ùgwù. Ná nchịkọta, ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst kpebie otú a ga-esi gwọọ ha n’amịnyeghị ha ọbara tupu ha adaa ọrịa ma ọ bụ merụọ ahụ́.
Ì kpebiela otú ị ga-achọ ka e si gwọọ ma gị ma ụmụ gị ma dejupụta kaadị DPA gị? Ị chọọ ebe a tụlere okwu a nke ọma, jiri nlezianya tụleghachi isi nke 7 n’akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke,” gụọkwa ebe ndị ọzọ akwụkwọ ahụ kwuru ka a gụọ. Gụọkwa ihe ndị a kọwara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke December 2006, nke isiokwu ya bụ, “Olee Ihe M Kwesịrị Ikpebi Ma A Chọọ Iji Ọbara M Gwọọ M Ọrịa Nakwa Ma A Chọọ Iji Ihe E Si n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Mejupụtara Ọbara Nweta, Gwọọ M Ọrịa?” Mgbe i mechara, hụ na i debara ihe niile ị họọrọ na kaadị DPA gị. I kwesịkwara ime ka ndị ị họọrọ ikwuchite ọnụ gị mgbe ị na-amaghị onwe gị na ndị ezinụlọ gị ndị na-abụghị Ndịàmà mata ihe niile i kpebiri.
[Igbe dị na peeji nke 3]
• Ì kpebiela otú ị ga-achọ ka e si gwọọ ma gị ma ụmụ gị?
• Ị̀ na-eji kaadị DPA i dejupụtarala aga ebe ọ bụla ị na-aga maka a dịghị ama ama?