Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/11 p. 2-3
  • Ị̀ Maara Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhọrọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhọrọ?
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Maara Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhọrọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Olee Ụdị Ọgwụgwọ Kasị Mma E Nwere?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ị̀ Na-eyigharị Ya?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Ị̀ Na-eyigharị Ya?
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 1/11 p. 2-3

Ị̀ Maara Ihe Ndị I Nwere Ike Ịhọrọ?

N’ebe dị iche iche n’ụwa taa, e nweela ọtụtụ ndị dọkịta na-awa ndị mmadụ ahụ́ n’ejighị ọbara. Ị̀ maara ụzọ dị iche iche dọkịta nwere ike isi gwọọ onye na-achọghị ka a mịnye ya ọbara? Ọ dị mkpa na ị ga-ama, ka i nwee ike kpebie ihe dị mma ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka a gwọọ gị ma ọ bụ waa gị ahụ́. Kirie vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge. I kirichaa ya, kpee ekpere banyere ihe ndị ị mụtara ma jiri ihe ndị e depụtara n’okpuru ebe a tụgharịa uche n’ihe ndị ị mụtara.—Ihe ị ga-eburu n’uche: Ebe ọ bụ na e gosiri ebe ụfọdụ a na-awa ahụ́ na vidio ahụ, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịma ihe ha ga-eme mgbe ha na ụmụ ha ndị obere na-ekiri ya.

(1) Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara n’ihi iwu Chineke nyere na Baịbụl n’Ọrụ 15:28, 29. Ebe ahụ kwuru ka anyị ‘zere ọbara.’ (2) A bịa n’ihe metụtara ịgwọ ọrịa, Ndịàmà Jehova na-achọ ka a gwọọ ha otú kacha mma n’ejighị ọbara. (3) Onye ọrịa ọ bụla nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme n’ahụ́ ya.

(4) Ihe mere o ji ka mma ịhọrọ ọgwụ ndị e ji edochi anya ọbara bụ na ọgwụ ndị e ji edochi anya ọbara adịghị emerụ ahụ́, ọ dịghịkwa ọghọm a na-enwe ma e jiri ha gwọọ ọrịa. A na-esi n’ịmịnye mmadụ ọbara ebute ọrịa ndị dị ka ịba ọcha n’anya, ọrịa o biri n’ájá ọcha, na ọrịa ndị ọzọ. Ọ bụ onye ọrịa ka ọ dịịrị ikpebi ụdị ọgwụgwọ ọ ga-anara ma ọ bụ nke ọ na-agaghị anara. (5) Ọ bụrụ na ọbara gbara mmadụ n’ahụ́ nnukwu, e nwere ihe abụọ bụ́ isi ọ dị mkpa ka ndị dọkịta mee ozugbo. Nke mbụ bụ ịkwụsị ọbara na-agba onye ahụ, nke abụọ abụrụ inye onye ahụ ọgwụ ga-eme ka ọbara dị n’ahụ́ ya mụbaa.

(6) Ihe anọ a na-eme iji hụ na a gwọrọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara bụ ịkwụsịlata ọbara na-agbafu, ichekwa mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara, inye onye ahụ ọgwụ ga-eme ka ahụ́ ya na-emepụtakwu ọbara, na inwetaghachi ọbara gbafuru agbafu.

(7) (a) Otú ndị dọkịta si akwụsịlata ọbara na-agbafu bụ iso ụzọ ndị e si awa ahụ́ ndị a na-akpachapụrụ nnọọ anya na ha, ndị gụnyere iji mmà na-eji ụzarị ọkụ eletrik akpụkọta ọbara (ya bụ, “electrocautery”), iji ígwè ọrụ na-eme ka ọbara kpụkọọ (ya bụ, “argon-beam coagulation”), nakwa ite gọm “fibrin” a na-ete n’ahụ́ iji kwụsị ọbara ọgbụgba (ya bụ, “fibrin glue”). (b) Otú ha si echekwa mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara bụ ịgwa ọbara (ya bụ, “hemodilution”). (ch) Ihe ha na-eme ka ahụ́ onye ọrịa na-emepụtakwu ọbara bụ inye ya ọgwụ na-amụba mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara bụ́ “erythropoietin” (ya bụ, EPO). (d) Otú ha si enwetaghachi ọbara gbafuru agbafu bụ ịzapụta mkpụrụ ndụ site n’ọbara ndị dị n’ebe a wara mmadụ ahụ́ ma ọ bụ n’ebe ọzọ ọbara na-agba mmadụ n’ahụ́  (ya bụ, “cell salvage”). (8) (a) Otú e si eme ihe ndị Bekee na-akpọ Hemodilution bụ: N’oge a na-awa ahụ́, a na-eme ka ọbara na-agbabanye n’ime akpa dị iche iche ma jirizie mmiri ọgwụ ndị na-eme ka ọbara mụbaa dochie anya ya. N’oge a na-awa onye ọrịa ahụ ahụ́ ma ọ bụ n’oge a wachara ya ahụ́, a na-eme ka ọbara ahụ gbabaghachi ya n’ahụ́. (b) Otú e si eme ihe ndị Bekee na-akpọ cell salvage bụ: A na-esi n’ebe a wara mmadụ ahụ́ ma ọ bụ n’ebe ọzọ ọbara na-agba mmadụ n’ahụ́ enweta ọbara. A na-aza ya ma mịnyeghachi ya n’ahụ́ onye ọrịa ahụ. (9) Anyị kwesịrị ịgwa dọkịta ọ bụla chọrọ ịgwọ anyị ka ọ kọwaara anyị uru na ọghọm ndị dị na ihe ọ bụla a chọrọ iji dochie anya ọbara.

(10) E nwere ike ịwa mmadụ ahụ́ maka ọrịa ndị dị ize ndụ n’amịnyeghị onye ahụ ọbara. Ihe atụ abụọ e gosiri na vidio ahụ bụ nke otu nwatakịrị nwaanyị a wara ahụ́ ọtụtụ ugboro iji gbazie ọkpụkpụ azụ ya gbagọrọ agbagọ na otu agadi nwaanyị, bụ́ onye a wara ahụ́ iji mezie ihe n’akwara fuliri afụli, bụ́ nke na-ebugharị ọbara n’afọ ya. (11) Ihe dị mma ndị dọkịta na-echebara mmadụ echiche na-emezi ugbu a bụ na ha na-eji ụzọ ọgbara ọhụrụ ndị e nwere na-agwọ Ndịàmà Jehova n’ejighị ọbara.

Onye ọ bụla ga-eji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie ma ọ̀ ga-anabata ụfọdụ n’ime ụzọ ndị e si agwọ ọrịa n’ejighị ọbara, bụ́ ndị e gosiri na vidio a. Ì kpebiela otú ị ga-achọ ka e si gwọọ ma gị ma ụmụ gị n’ejighị ọbara ma dejupụta kaadị DPA gị? Ị chọọ ebe a tụlere okwu a nke ọma, jiri nlezianya tụleghachi “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche June 15, 2004, na nke October 15, 2000. Leruzie anya n’ihe ndị a kọwara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke December 2006, nke isiokwu ya bụ, “Olee Ihe M Kwesịrị Ikpebi Ma A Chọọ Iji Ọbara M Gwọọ M Ọrịa Nakwa Ma A Chọọ Iji Ihe E Si n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Mejupụtara Ọbara Nweta, Gwọọ M Ọrịa?” ma kpebie ihe ndị ị ga-anabata na ihe ndị ị ga-ajụ. I mechaa, hụ na i debara ihe niile ị họọrọ na kaadị DPA gị. I kwesịkwara ime ka ndị ị họọrọ ikwuchite ọnụ gị mgbe ị na-amaghị onwe gị na ndị ezinụlọ gị ndị na-abụghị Ndịàmà mata ihe niile i kpebiri.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya