Olee Ụdị Ọgwụgwọ Kasị Mma E Nwere?
“A pụrụ ikwu na onye ọ bụla a wara ahụ́ n’amịnyeghị ya ọbara nwetara ụdị ọgwụgwọ kasị mma e nwere.” Nke ahụ bụ ihe Dr. Michael Rose, bụ́ onyeisi ụlọ ọgwụ nakwa dọkịta na-ahụ maka ọgwụ e ji akụnwụ ahụ́, kwuru. Olee ụzọ ndị a ga-esi gwọọ onye ọrịa nakwa ọgwụ ndị e ji edochi anya ọbara bụ́ ndị ọ ga-abụ e jiri gwọọ mmadụ ya abụrụ na a gwọrọ ya n’amịnyeghị ya ọbara? Ọ dị mkpa ka ị mara ya ka ọ ga-abụ, a chọọ ịgwọ gị ọrịa ma ọ bụ ịwa gị ahụ́, gị enwee ike ime mkpebi dị ka onye ma nke a na-akọ. Kirie vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge. I kirichaa ya, jiri ajụjụ ndị na-esonụ lee ma ị̀ ghọtakwara ihe i kiriri.—Ihe ị ga-arịba ama: Ebe ọ bụ na e gositụrụ ebe a na-awa ahụ́ na vidio ahụ, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji akọ mee ihe mgbe ha na ụmụ ha ndị obere na-ekiri ya.
(1) Olee ihe bụ́ isi mere na Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara? (2) A bịa n’ihe metụtara ịgwọ ọrịa, gịnị ka Ndịàmà Jehova na-achọ? (3) Olee ikike bụ́ isi onye ọrịa nwere? (4) Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya mmadụ ịhọrọ ọgwụ ndị e ji edochi anya ọbara kama ikwe ka a mịnye ya ọbara? (5) Ọ bụrụ na ọbara gbara mmadụ n’ahụ́ nnukwu, olee ihe abụọ bụ́ isi ọ dị mkpa ka ndị dọkịta mee ozugbo? (6) Mgbe mmadụ nọ n’ọnọdụ kwesịrị ka a mịnye ya ọbara, olee ihe anọ a na-eme iji hụ na a gwọrọ onye ahụ n’amịnyeghị ya ọbara? (7) Olee otú ndị dọkịta pụrụ isi mee (a) ka ọbara kwụsịlata ịgba mmadụ n’ahụ́, (b) ka mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara ghara ịpụ mmadụ n’ahụ́, (ch) ka ahụ́ mmadụ mepụtawakwuo ọbara, na (d) ka e nwetaghachi ọbara gbapụrụ mmadụ n’ahụ́? (8) Kọwaa ihe a na-eme n’ụdị ọgwụgwọ ndị Bekee na-akpọ (a) hemodilution na (b) cell salvage. (9) Olee ihe ị kwesịrị ikwu ka a kọwaara gị banyere ihe ọ bụla a chọrọ iji dochie anya ọbara? (10) È nwere ike ịwa mmadụ ahụ́ maka ọrịa ndị dị ize ndụ n’amịnyeghị onye ahụ ọbara? (11) Olee mgbanwe ndị dị mma ndị dọkịta na-emezi?
Ịnakwere ụfọdụ n’ime ụdị ọgwụgwọ ndị e gosiri na vidio a bụ́ ihe dịịrị mmadụ iji akọnuche ya e ji Bible zụọ kpebie. Ì kpebiela ụzọ ndị e si agwọ ọrịa n’amịnyeghị ọbara, bụ́ ndị ị ga-ekwe ka e siri na-agwọ ma gị ma ụmụ gị? I kwesịkwara ime ka ndị òtù ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà mara nke ọma banyere mkpebi gị na ihe ndị mere i ji mee mkpebi ahụ.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche June 15, 2004, na October 15, 2000.