Ị Ghaghị Ikiri Vidio Bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge
Olee ihe ndị ị maara banyere nhọrọ ndị a pụrụ ime n’ihe banyere ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara? Ị̀ maara ụfọdụ ihe ndị ọzọ a pụrụ iji dochie anya mmịnye ọbara na otú ha si arụ ọrụ? Kirie vidio a, ma jiri ajụjụ ndị na-esonụ nyochaa ihe ị maara.—Ihe ịrịba ama: N’ihi na e gosiri n’ụzọ dị mkpirikpi n’ime vidio a ebe ndị a na-awa ahụ́, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji akọ mee ihe mgbe ha na obere ụmụaka na-ekiri vidio ahụ.
(1) Olee isi ihe mere Ndịàmà Jehova ji ajụ mmịnye ọbara, oleekwa ebe a pụrụ ịchọta ụkpụrụ ahụ n’ime Bible? (2) Mgbe a bịara n’ihe banyere nlekọta ahụ́ ike, gịnị ka anyị chọrọ? (3) Gịnị bụ ihe bụ́ isi ruuru mmadụ nke onye ọrịa nwere? (4) Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya nakwa iji ihe akpọrọ ihe bụ́ ịjụ mmịnye ọbara? (5) Mgbe ọbara dị ukwuu pụrụ mmadụ n’ahụ́, olee ihe abụọ dị oké mkpa ndị dọkịta kwesịrị ibu ụzọ mee? (6) Olee ihe ize ndụ metụtara ahụ́ ike ndị e jikọtara ha na mmịnye ọbara? (7) Olee ụfọdụ n’ime ngwa ọrụ ndị na-awa ahụ́ nwere iji belata ọbara ọgbụgba n’oge a na-awa mmadụ ahụ́? (8) Olee ihe i kwesịrị ịchọ ka a kọwaara gị banyere ihe ọ bụla ọzọ a pụrụ ime kama ịnara mmịnye ọbara? (9) À pụrụ ịwa ahụ́ ndị siri ike ma taa akpụ n’amịnyeghị mmadụ ọbara? (10) Gịnị ka ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị dọkịta dị njikere imere Ndịàmà Jehova, gịnịkwa pụrụ imesịa ghọọ ụkpụrụ iji na-agwọ ndị ọrịa nile?
Obi abụọ adịghị ya na ọ ga-enye aka isoro onye ọ bụla a na-amụrụ Bible, di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị ikwu na-abụghị Ndịàmà, ndị ọrụ ibe anyị, ndị nkụzi, na ụmụ akwụkwọ ibe anyị bụ́ ndị pụrụ ịjụ ajụjụ banyere nguzo anyị n’ihe metụtara ọbara kirie vidio No Blood a. Ịnakwere ọgwụgwọ ọ bụla e gosiri na vidio ahụ bụ mkpebi mmadụ ga-eji akọ na uche ya meere onwe ya.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke June 15 na October 15, 2000.