Vidio nke Na-eme Ka Otu Ụzọ Dị Mkpa E Sizi Agwọ Ọrịa Pụta Ìhè
Ndị ọkàiwu na ndị ọkachamara n’okwu banyere ahụ́ ike na-elebakwu anya n’echiche ndị ọrịa nakwa n’ihe ndị ruuru ha. Nke a emewo ka e nwee usoro ọgwụgwọ ndị ọhụrụ, ndị Ndịàmà Jehova pụrụ irite uru na ha. (Ọrụ 15:28, 29) Nke ahụ bụ ebe vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights lekwasịrị anya. Kirie ya, ma tụlezie ihe ndị ị mụtara.—Ihe ịrịba ama: Ebe ọ bụ na vidio ahụ na-egosikwa ebe ndị a na-awa ahụ́ n’ụzọ dị mkpirikpi, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji akọ mee ihe mgbe ha na ụmụ ha ndị obere na-ekiri ya.
(1) N’ihi gịnị ka ndị ọrụ ahụ́ ike ji atụleghachi iji mmịnye ọbara agwọ ọrịa? (2) Nye ihe atụ atọ nke ịwa ahụ́ tara akpụ bụ́ ndị a wara n’ejighị ọbara. (3) N’ụwa nile, ndị dọkịta na ndị ọwa ahụ́ ole gosiworo na ha dị njikere ịgwọ ndị ọrịa n’ejighị ọbara? N’ihi gịnị ka ha ji dị njikere ime otú ahụ? (4) Gịnị ka nnyocha ndị e mere n’ụlọ ọgwụ n’oge na-adịbeghị anya kpughere banyere iji ọbara eme ihe? (5) Olee ihe ize ndụ metụtara ahụ́ ike ndị dị ná mmịnye ọbara? (6) Olee ihe ọtụtụ ndị ọkachamara kwubiri na ọ bụ uru ndị a na-erite site n’iji ihe ndị e ji edochi anya mmịnye ọbara eme ihe? (7) Gịnị na-akpata ụkọ ọbara? Ruo ókè ha aṅaa ka ahụ́ mmadụ pụrụ ịnagide ya? Gịnị ka a pụrụ ime iji wuliteghachi ọbara? (8) Olee otú a pụrụ isi mee ka ahụ́ onye ọrịa mepụtakwuo mkpụrụ ndụ ọbara uhie? (9) Olee usoro ndị a na-eji eme ihe iji belata ọbara ọgbụgba n’oge a na-awa mmadụ ahụ́? (10) Ihe ndị a na-eji edochi anya mmịnye ọbara hà pụrụ ịrụ ọrụ n’ahụ́ ụmụntakịrị ma ọ bụ n’ahụ́ ndị nọ n’ọnọdụ mberede ndị na-etinye ndụ n’ihe ize ndụ? (11) Gịnị bụ otu n’ime ụkpụrụ ndị bụ́ isi metụtara ezi nlekọta ahụ́ ike? (12) N’ihi gịnị ka o ji dị Ndị Kraịst mkpa ịhọrọ ụdị ọgwụgwọ a na-agaghị eji ọbara eme ihe na ha, bụ́ ndị ha ga-achọ, tupu oge eruo? Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?
Ịnakwere ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ ndị e gosiri na vidio a bụ mkpebi onye ọ bụla ga-emere onwe ya n’ikwekọ n’akọ na uche ya e ji Bible zụọ. Ì kpebiwo ihe ndị a pụrụ iji dochie anya mmịnye ọbara bụ́ ndị ị dị njikere ịnakwere maka onwe gị nakwa maka ụmụ gị? I kwesịkwara ime ka ndị òtù ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà mara banyere mkpebi gị nke ọma na ihe ndị mere i ji mee mkpebi ndị ahụ.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” ndị dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke June 15 na October 15, 2000.