Vidio nke Na-eme Ka Otu Ụzọ Dị Mkpa E Si Agwọ Ọrịa Pụta Ìhè
Ndị ọkàiwu na ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike elebakwuwela anya n’echiche ndị ọrịa nakwa n’ihe ndị ruuru ha. Nke a emeela ka e nwee ụzọ ndị ọhụrụ e si agwọ ọrịa bụ́ ndị Ndịàmà Jehova pụrụ irite uru na ha. (Ọrụ 15:28, 29) Nke ahụ bụ ebe vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights lekwasịrị anya. Kirie ya, ma tụlezie ihe ndị ị mụtara.—Ihe Ịrịba Ama: Ebe ọ bụ na e gositụrụ ebe ndị a na-awa ahụ́ na vidio ahụ, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji akọ mee ihe mgbe ha na ụmụ ha ndị obere na-ekiri ya.
(1) Gịnị mere ụfọdụ ndị dọkịta ji elebaghachi anya n’ihe metụtara ịmịnye mmadụ ọbara? (2) Nye ihe atụ atọ nke ebe a wara ndị mmadụ ahụ́ maka ọrịa ndị tara akpụ, bụ́ ndị a pụrụ ịwa n’amịnyeghị ọbara. (3) N’ụwa nile, ndị dọkịta ole gosirila na ha dị njikere ịgwọ ndị ọrịa n’amịnyeghị ha ọbara? Gịnị mere ha ji dị njikere ime otú ahụ? (4) Gịnị ka a chọpụtara ná nnyocha ndị e mere n’ụlọ ọgwụ n’oge na-adịbeghị anya banyere iji ọbara eme ihe? (5) Olee ụfọdụ ọrịa mmadụ pụrụ ibute ma a mịnye ya ọbara? (6) Gịnị ka ọtụtụ ndị ọkachamara kwurula banyere uru ndị dị n’iji ụzọ ndị ọzọ na-abụghị mmịnye ọbara, agwọ ọrịa? (7) Gịnị na-eme ka ọbara kọọ mmadụ n’ahụ́? Ókè ha aṅaa ka ọbara ga-akọru mmadụ n’ahụ́ ya aka nọgide na-adị ndụ? Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka ọbara onye ahụ gbagotetụkwuo? (8) Olee otú a pụrụ isi mee ka ahụ́ onye ọrịa mepụtakwuo mkpụrụ ndụ ọbara uhie? (9) Olee ụzọ ndị e si awa ahụ́ iji mee ka ọbara ga-agba mmadụ n’oge a na-awa ya ahụ́ ghara ibu ibu? (10) Ụzọ ndị ahụ e si agwọ ọrịa n’amịnyeghị mmadụ ọbara ọ̀ na-adị irè n’ahụ́ ụmụaka ma ọ bụ n’ahụ́ ndị nọ n’ọnọdụ ọ ga-abụ, ma e meghị ihe ngwa ngwa, ha anwụọ? (11) Olee otu n’ime ụkpụrụ ndị bụ́ isi dọkịta ma nke a na-akọ na-agbaso? (12) N’ihi gịnị ka o ji dị Ndị Kraịst mkpa ibu ụzọ họrọ ụzọ ndị a ga-esi agwọ ha n’ejighị ọbara, tupu a malite ịgwọ ha? Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?
Ịnakwere ụzọ ụfọdụ e si agwọ ọrịa bụ́ ndị e gosiri na vidio a bụ mkpebi onye ọ bụla ga-emere onwe ya n’ikwekọ n’akọ na uche ya e ji Bible zụọ. Ì kpebiela ụzọ ndị e si agwọ ọrịa n’amịnyeghị ọbara, bụ́ ndị ị ga-ekwe ka e siri na-agwọ ma gị ma ụmụ gị? I kwesịkwara ime ka ndị òtù ezinụlọ gị na-abụghị Ndịàmà mara banyere mkpebi gị nke ọma na ihe ndị mere i ji mee mkpebi ahụ.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” ndị dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 2004, nakwa na nke October 15, 2000.