Rite Uru Site ná Vidio Bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge
Olee ihe ndị ị maara banyere nhọrọ ndị a pụrụ ime n’ihe banyere ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara? Ị̀ maara ụfọdụ ihe ndị ọzọ a pụrụ iji dochie anya mmịnye ọbara na otú ha si arụ ọrụ? Kirie vidio a, ma jiri ajụjụ ndị na-esonụ nwalee ihe ị maara.—Ihe ịrịba ama: Ebe ọ bụ na e gosiri n’ụzọ dị mkpirikpi n’ime vidio a ebe ndị a na-awa mmadụ ahụ́, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iji akọ mee ihe n’ikpebi ma ụmụ ha ndị obere hà kwesịrị ikiri vidio a.
(1) Olee isi ihe mere Ndịàmà Jehova ji ajụ mmịnye ọbara, oleekwa ebe a na-achọta ụkpụrụ ahụ n’ime Bible? (2) A bịa n’ihe banyere nlekọta ahụ́ ike, gịnị ka anyị na-achọ? (3) Gịnị bụ ihe bụ́ isi ruuru mmadụ nke onye ọrịa nwere? (4) Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche na amamihe dị na ya ịjụ mmịnye ọbara? (5) Mgbe ọbara na-agba mmadụ hie nne, olee ihe abụọ dọkịta kwesịrị ibu ụzọ mee ngwa ngwa? (6) Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka mmịnye ọbara na-ewetara ahụ́ ike? (7) Olee ụfọdụ n’ime ngwá ọrụ ndị ndị na-awa ahụ́ nwere iji belata ọbara ọgbụgba n’oge a na-awa mmadụ ahụ́? (8) Olee ihe i kwesịrị ịchọ ka a kọwaara gị banyere ụzọ ọ bụla ọzọ a pụrụ isi gwọọ ọrịa n’amịnyeghị ọbara? (9) À pụrụ ịwa mmadụ ahụ́ ndị siri ike ma taa akpụ n’amịnyeghị ya ọbara? (10) Gịnị ka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị dọkịta dị njikere imere Ndịàmà Jehova, gịnịkwa pụrụ imesịa ghọọ ụkpụrụ a ga-eji na-agwọ ndị ọrịa nile?
Ịnakwere ụdị ọgwụgwọ ọ bụla e gosiri na vidio a bụ mkpebi mmadụ ga-eji akọ na uche ya meere onwe ya.—Lee Ụlọ Nche nke June 15, 2004, peeji nke 22-24, 29-31, na Ụlọ Nche nke October 15, 2000, peeji nke 30-31.