Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 24
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 24
Abụ nke 53 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 16 ¶15-20, igbe dị na peeji nke 171 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezra 6-10 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezra 7:1-17 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Jizọs Si Gosi na Ya Ruru Eru Ịbụ Eze (Nkeji 5)
Nke 3: Mụrụ Anya n’Ụzọ Ime Mmụọ Iji Mata Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ikpeazụ—td 23B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na Febụwarị, meekwa otu ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee ya.
Nkeji 20: “Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Ọ Bụla Aka.”—Nkebi nke 1. (Paragraf nke 1-6 na igbe dị na peeji nke 6.) Ajụjụ na azịza. Gbaa ndị na-ege ntị ume ka ha gbalịa mee ihe ndị a tụrụ aro ha n’igbe dị na peeji nke 6 ná mgbede ọzọ ha ga-enwe Ofufe Ezinụlọ. O ruzie n’izu ọzọ, mgbe a ga-atụle paragraf ndị fọrọ afọ, ha ga-enwezi ike ikwu uru ndị ezinụlọ ha ritere.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Magazin n’Ọnwa Febụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ dị na ha, ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ na amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ya ma ha nyefewe magazin nke ọ bụla. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 32 na Ekpere