Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Septemba
“Ndị mmadụ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị n’agbanyeghị mba ha ma ọ bụ chọọchị ha na-aga. Ì chere na Chineke na-anụ ekpere niile?” Chere ka ọ zaa. Nyezie ya Ụlọ Nche Septemba 1, gị na ya tụleekwa ihe e dere n’okpuru ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16. Gụọkwanụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu amaokwu Baịbụl e dere ebe ahụ. Unu mechazie, nyekwuo ya otu Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Septemba 1
Gosi onye nwe ụlọ ihu magazin ahụ ma jụọ ya, sị: “Ọ bụrụ gị ka a jụrụ ajụjụ a, gịnị ka ị ga-aza? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru n’okwu a. [Gụọ 1 Jọn 5:19.] Amaokwu Baịbụl a anyị gụrụ sị na ọ bụ “ajọ onye ahụ,” ya bụ, Ekwensu na-achị ụwa a. Ihe a Baịbụl kwuru nwere ike ime ka ị jụọ ajụjụ ndị dị ka: Ònye kere Ekwensu? È nwedịrị onye bụ́ Ekwensu? Chineke ọ̀ ga-ahapụ ya ka ọ chịruo ole mgbe? Magazin a kwuru ihe Baịbụl zara n’ajụjụ nke ọ bụla.”
Teta! Julaị–Septemba
“Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwukarị ibe ha okwu azụ. Olee ihe i chere mere ha ji eme ya? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru ihe kpatara ya na Jems 3:2. Magazin a kwuru ihe anọ anyị nwere ike ime iji na-ekwu okwu dị mma.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 20.