Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Septemba
“Ọtụtụ ndị kwere na ndị mmụọ ozi dị. Ì kwere na ndị mmụọ ozi dị? [Chere ka ọ zaa.] Anyị ma na ndị mmụọ ozi siri ezigbote ike, ma, ì chere na ha nwere ike inyere anyị aka? Baịbụl gwara anyị otú ha na-esi enyere anyị aka taa.” Gosi ya ihe dị n’azụ Ụlọ Nche Septemba 1, tụleenụ ihe dị n’okpuru ajụjụ nke mbụ. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl dị ebe ahụ. Nye ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, yiekwanụ mgbe ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Septemba 1
“Ì chere na ndị mmadụ emebiela ụwa a ruo otú a na-agaghị edozili ya edozi? [Chere ka ọ zaa.] Ọ bụ eziokwu na mmadụ agaghị edozili ụwa a, Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-edozi ya, gwakwa anyị ihe ọ ga-eme iji dozie ya. Lee ihe Baịbụl kwuru. [Gụọ Abụ Ọma 65:9. Ị gụchaa ya, sị:] Magazin a kwuru otú Chineke ga-esi emezi ụwa a na ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ibi na ya.” Nyezie ya magazin ahụ.
Teta! Septemba–Ọktoba
N’ụbọchị Satọdee ma ọ bụ Sọnde, i nwere ike ikwu ihe a ma ị chọọ inye mmadụ Teta!: “Anyị chọkwara inye gị Teta! a. Ọ zara ajụjụ bụ́, Olee Otú Ndị Mmadụ Ga-esi Na-adị n’Udo?”