Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye n’Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Septemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshuọ ọ bụla ga-amasị ha. Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Gbalịakwa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba: Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? Ọ bụrụ na unu enweghị broshuọ a, unu nwere ike inye ndị mmadụ broshuọ ndị ahụ e kwuru ka e nye n’ọnwa Ọgọst. Ọ bụrụkwa na unu nwere ya, unu nwekwara ike nyekọta ya na ndị nke ọnwa Ọgọst.
◼ Ná Nzukọ Ije Ozi ndị a ga-enwe n’ọdịnihu, anyị ga-atụle vidio abụọ bụ́: Jehovah’s Witnesses—Faith in Action, Part 1: Out of Darkness na The Wonders of Creation Reveal God’s Glory. Ọ bụrụ na i nweghị vidio ndị a, tụọ ọda ha ozugbo n’ọgbakọ unu.