Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 5
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 5
Abụ nke 75 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 9 ¶1-7, igbe ndị dị na peeji nke 68, na 70 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 119 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 119:49-72 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Baịbụl Ji Agwa Anyị Ka Anyị Na-atụ Egwu Jehova—Diut. 5:29 (Nkeji 5)
Nke 3: Ekwensu Ọ̀ Bụ Onye Dị Adị?—td 10A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Ọrụ 5:17-42. Kwurịtanụ otú akụkọ a kọrọ n’amaokwu Baịbụl ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi anyị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Gị na Ezinụlọ Gị Na-akwadebe Ozi Ọma. Ajụjụ ọnụ na ihe ngosi. Gbaa otu di na nwunye na-amụbeghị nwa ajụjụ ọnụ, gbaakwa di na nwunye ọzọ nwere ụmụaka ajụjụ ọnụ. Ha kwuo otú ha si akwadebe ozi ọma ma ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ. I mechaa, gwa otu n’ime ha ka ha jiri nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú ezinụlọ ha si eme ya.
Abụ nke 88 na Ekpere