Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọgọst 29, 2011.
1. Olee otú obiọma Chineke si “dị mma karịa ndụ”? (Ọma 63:3) [w01 10/15 p. 15 para. 17]
2. Gịnị ka Abụ Ọma nke iri asaa na-akụziri anyị gbasara Devid? [w08 9/15 p. 4 para. 4]
3. Gịnị ka Abụ Ọma 75:5 gwara anyị emela? [w06 7/15 p. 11 para. 3]
4. Olee mgbe anyị ga-akacha atụ anya ka Jehova zaa ekpere anyị kpekuru ya? (Ọma 79:9) [w06 7/15 p. 12 para. 5]
5. Gịnị bụ ‘ihe ndị e mere na nzuzo’ e kwuru okwu ya n’Abụ Ọma 90:7, 8? [w01 11/15 p. 12-13 para. 14-16]
6. Olee ọrụ dị mkpa Abụ Ọma 92:12-15 kwuru na Jehova nyere ndị merela agadi n’ọgbakọ? [w04 5/15 p. 13-14 para. 14-18]
7. Ihe ahụ otu ọbụ abụ dere n’Abụ Ọma 102:25-27 ọ̀ pụtara na ụwa agaghị adị ruo mgbe ebighị ebi otú Chineke si zube ya? (Jen. 1:28) [w08 4/1 p. 12 para. 1]
8. Gịnị ka Abụ Ọma 106:7 na-akụziri anyị banyere inwe nghọta? [w95 9/1 p. 19 para. 4–p. 20 para. 2]
9. Dị ka Abụ Ọma 110:1, 4 si kwuo, olee iyi Jehova ṅụrụ gbasara Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, ya bụ, Mesaya, oleekwa uru nke ahụ baara ụmụ mmadụ? [cl p. 194 para. 13]
10. Mgbe otu ọbụ abụ chebachaara uru ndị o riterela n’ozi o jeere Chineke echiche, gịnị ka nke a mere ka o mee? (Ọma 116:12, 14) [w09 7/15 p. 29 para. 4-5]