À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
“Olileanya dịịrị osisi na ọ ga-epute ọzọ, ma e gbutuo ya . . . Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?”—MOSIS, ONYE AMỤMA OGE OCHIE.
1-3. Olee otú ọtụtụ ndị si achọ nkasi obi mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha?
N’OTU ebe a na-edozi ozu na New York City, ndị enyi na ezinụlọ ji nwayọọ na-agafe n’akụkụ igbe ozu ghere oghe. Ha na-elegide anya n’ozu otu nwata nwoke dị afọ 17. O siiri ndị enyi ya n’ụlọ akwụkwọ ike ịmata ya. Iji ọgwụ agwọ ọrịa akpụwo ya isi; ọrịa cancer emewo ka ọ taa ahụ. Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ enyi ha n’ezie? Nanị ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, o jupụtara n’echiche, n’ajụjụ, n’ume—ná ndụ! Nne nwata ahụ obi gbawara na-agbalị inweta olileanya na nkasị obi n’echiche nke na n’ụzọ ụfọdụ nwa ya nwoke ka dị ndụ. Ugboro ugboro ọ na-eji anya mmiri na-ekwughachi ihe a kụziwooro ya: “Obi dị Tommy ụtọ ugbu a karị. Chineke chọrọ ka ya na Tommy nọrọ n’eluigwe.”
2 Ihe dị ka kilomita 11,000 site n’ebe ahụ, na Jamnagar, India, ụmụ atọ nke otu ọchụ nta ego dị afọ 58 na-enye aka ịdọkwasị ozu nna ha n’ebe a na-esu ozu ọkụ. N’anwụ etiti ụtụtụ ahụ na-eti gbaa, nwa ya nwoke nke kasị okenye amalite usoro isu ozu ọkụ ahụ site n’iji ọwa mụnye ogwe nkụ ọkụ na ịwụsa ngwakọta nke ihe ndị na-esi ísí ụtọ n’ozu nna ya. Mantras nke Brahman nọ na-ekwughachi n’asụsụ Sanskrit nke pụtara: “Ka mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ ma ọlị nọgide ná mgbalị ya ịbụ nke nwetara ịdị adị kasịnụ,” ekweghị ka a nụ ụda nke ọkụ ahụ.
3 Ka ụmụnne atọ ahụ na-ekiri ozu ahụ na-agba ọkụ, nke ọ bụla na-ajụ onwe ya n’obi ya, ‘M̀ kwere n’ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị?’ N’ịbụ ndị gụrụ akwụkwọ n’akụkụ dị iche iche n’ụwa, ha nyere azịza ndị dịgasị iche. Nke ha tọsịrị na-enwe obi ike na nna ha ha hụrụ n’anya ga-alọ ụwa gaa ná ndụ ọkwá ya ka elu. Nke etiti kwere n’otu echiche na ndị nwụrụ anwụ na-arahụ ụra, n’amaghị ihe ọ bụla ma ọlị. Nke tọsịrị ha na-anwa nanị ịnakwere ọnwụ ịbụ ihe na-eme eme, n’ihi na ọ na-eche na ọ dịghị onye pụrụ ịma n’ezie ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ.
Otu Ajụjụ, Ọtụtụ Azịza
4. Olee ajụjụ nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ nsogbu ruo ọtụtụ ọgbọ?
4 À na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị? bụ ajụjụ gbaworo ihe a kpọrọ mmadụ gharịị ruo ọtụtụ narị afọ iri. “Ọ na-esiri ọbụna ndị ọkà mmụta okpukpe ike mgbe e chere [ya] n’ihu ha,” ka Hans Küng, bụ́ ọkà mmụta Katọlik, na-ekwu. Ruo ọtụtụ ọgbọ, ndị mmadụ n’ọha na eze ọ bụla atụgharịwo uche n’okwu ahụ, ọ dịwokwa ọtụtụ ihe ndị e wepụtara ga-abụ azịza ya.
5-8. Gịnị ka okpukpe dị iche iche na-ezi banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
5 Ọtụtụ bụ́ ndị Kraịst n’ọnụ kwere n’eluigwe na hel. N’aka nke ọzọ, ndị Hindu kwere n’ịlọ ụwa. Ka ọ na-ekwu banyere echiche ndị Alakụba, Amir Muawiyah, osote onyeisi n’ogige okpukpe Alakụba, na-ekwu, sị: “Anyị kwere na a ga-enwe ụbọchị ikpe mgbe a nwụsịrị, mgbe ị ga-aga n’ihu Chineke, bụ́ Allah, nke ga-adị nnọọ ka ịbanye n’ụlọikpe.” Dị ka nkwenkwe Alakụba si dị, mgbe ahụ Allah ga-atụle ụzọ ndụ nke onye ọ bụla wee tinye mmadụ na paradaịs ma ọ bụ n’ọkụ mmụọ.
6 Na Sri Lanka, ma ndị Buddha ma ndị Katọlik na-emegheru ọnụ ụzọ na window n’isi mgbe ọnwụ gburu mmadụ n’ezinụlọ ha. A na-amụnye mpanaka, a na-adọwakwa igbe ozu ahụ ka ụkwụ onye ahụ nwụrụ anwụ na-eche ọnụ ụzọ mbata ụlọ ihu. Ha kwere na usoro ndị a na-eme ka mmụọ, ma ọ bụ mkpụrụ obi nke onye ahụ nwụrụ anwụ pụọ ngwa ngwa n’ụlọ ahụ.
7 Ndị Aborigine nke Australia, ka Ronald M. Berndt nke Mahadum Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia na-ekwu, kwere na “a pụghị ibibi mmụọ ụmụ mmadụ ebibi.” Ebo Africa ụfọdụ kwere na mgbe a nwụsịrị, ụmụ mmadụ nkịtị na-aghọ ndị mmụọ, ebe ndị a ma ama na-aghọ ndị nna oche bụ́ mmụọ, bụ́ ndị a ga-asọpụrụ ma kpọkuo dị ka ndị ndú a na-adịghị ahụ anya nke ógbè.
8 N’ala ụfọdụ, nkwenkwe banyere mkpụrụ obi ndị e weere na ha bụ nke ndị nwụrụ anwụ bụ ngwakọta ọdịnala obodo na Iso Ụzọ Kraịst n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, n’etiti ọtụtụ ndị Katọlik na ndị Protestant n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ bụ omenala ikpuchi enyo mgbe mmadụ nwụrụ ka onye ọ bụla ghara ile ya anya wee hụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Mgbe ahụ, ụbọchị 40 mgbe onye ahụ a hụrụ n’anya nwụsịrị, ezinụlọ na ndị enyi na-eme ememe maka nrịgo nke mkpụrụ obi ya n’eluigwe.
Isiokwu A Na-enwekarị
9, 10. Ná nkwenkwe bụ́ isi dị aṅaa ka ihe ka n’ọtụtụ okpukpe kwekọrịtara?
9 Azịza nye ajụjụ banyere ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ dịgasị iche dị ka omenala na nkwenkwe ndị na-aza ha dị. Ma, ihe ka n’ọtụtụ okpukpe kwetara n’otu echiche bụ́ isi: Ihe dị n’ime mmadụ—mkpụrụ obi, mmụọ—adịghị anwụ anwụ, ọ na-adịgidekwa ndụ mgbe a nwụsịrị.
10 Nkwenkwe n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi fọrọ nke nta ka ọ dịrị n’ọtụtụ puku okpukpe na ịrọ òtù nile nke Krisendọm. Ọ bụkwa ozizi a nakweere n’okpukpe ndị Juu. N’okpukpe Hindu nkwenkwe a bụ kpọmkwem ntọala nke ozizi ịlọ ụwa. Ndị Alakụba kwere na mkpụrụ obi na-eso anụ ahụ amalite ịdị ma na-adịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị. Okpukpe ndị ọzọ—okpukpe ọdịnala nke Africa, Shinto, ọbụnakwa okpukpe Buddha—na-ezi ụdị dị iche iche nke otu isiokwu a.
11. Olee otú ndị ọkà mmụta ụfọdụ sị ele echiche ahụ nke bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ anya?
11 Ndị ụfọdụ nwere echiche dị iche, na ndụ ịma ihe na-akwụsị n’ọnwụ. Nye ha, echiche nke na ndụ nke nwere mmetụta na ọgụgụ isi na-adịgide ná mkpụrụ obi e kewapụrụ n’anụ ahụ nke na-abụghị mmadụ, nke dị inyoghị inyoghị yiri ihe ezi uche na-adịghị na ya. Onye edemede na ọkà mmụta nke narị afọ nke 20 si Spain bụ́ Miguel de Unamuno na-ede, sị: “Ikwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ ịchọ ka mkpụrụ obi ghara ịnwụ anwụ, ma ịchọ ya ná mkpebisi ike nke na ọchịchọ a ga-eme ka e leghara ihe ezi uche dị na ya anya. N’ime ndị jụrụ ikwere n’anwụghị anwụ nke mmadụ bụ ndị ọkà ihe ọmụma oge ochie a ma ama, bụ́ Aristotle na Epicurus, onye dibịa bụ́ Hippocrates, David Hume bụ́ onye Scotland bụ́ ọkà ihe ọmụma, Averroës bụ́ onye Arab bụ́ ọkà mmụta, na praịm minista mbụ nke India mgbe ha nweresịịrị onwe ha, bụ́ Jawaharlal Nehru.
12, 13. Olee ajụjụ ndị dị mkpa na-ebilite banyere ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
12 Ajụjụ bụ, Ànyị nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ n’ezie? Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ n’ezie, oleezi otú ozizi ụgha dị otú ahụ pụrụ isi bụrụ akụkụ dị mkpa nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe nke taa? Olee ebe echiche ahụ malitere? Ọ bụrụkwa n’ezie na mkpụrụ obi na-akwụsị ịdị ndụ n’ọnwụ, olee olileanya pụrụ ịdị maka ndị nwụrụ anwụ?
13 Ànyị pụrụ ịchọta azịza ndị bụ eziokwu, na-ejukwa afọ maka ajụjụ ndị dị otú ahụ? Ee! Ndị a na ajụjụ ndị ọzọ ka a ga-aza na peji ndị na-esonụ. Na mbụ, ka anyị tụlee otú ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si malite.