Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Ndị Mmadụ Kweere?
“Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?”—JOB 14:14.
1, 2. Olee otú ọtụtụ ndị si achọ nkasị obi mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha?
N’OTU ebe a na-edozi ozu na New York City, ndị enyi na ezinụlọ ji nwayọọ na-agafe n’akụkụ igbe ozu ghere oghe nke otu nwata nwoke dị afọ 17 bụ́ onye ọrịa cancer gburu mgbe ọ ka na-eto eto. Nne ya obi gbawara na-eji anya mmiri na-ekwughachi ugboro ugboro, sị: “Obi dị Tommy ụtọ ugbu a karị. Chineke chọrọ ka ya na Tommy nọrọ n’eluigwe.” Nke ahụ bụ ihe a kụziwooro ya ka o kwere.
2 Ihe dị ka kilomita 11,000 site n’ebe ahụ, na Jamnagar, India, nke kasị okenye n’ime ụmụ nwoke atọ mụnyere ọkụ ná nkụ ndị dị n’ebe a na-esu ozu ọkụ maka nna ha nwụrụ anwụ. N’elu ụda nke ọkụ ahụ, Brahman nọ na-ekwu mantras n’asụsụ Sanskrit: “Ka mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ ma ọlị nọgide ná mgbalị ya ịbụ nke nwetara ịdị adị kasịnụ.”
3. Olee ajụjụ ndị ndị mmadụ tụgharịworo uche na ha ruo ọtụtụ ọgbọ?
3 Ịdị adị nke ọnwụ gbara anyị gburugburu. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị anyị iche ma ọnwụ ọ̀ bụ njedebe nke ihe nile. N’ịtụgharị uche n’usoro uto ebumpụta ụwa nke ihe ọkụkụ, Job, bụ́ ohu Jehova Chineke kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie, kwuru, sị: “Olileanya dịịrị osisi na ọ ga-epute ọzọ, ma e gbutuo ya, na ome ya agaghị akwụsịkwa.” Gịnịzi banyere ụmụ mmadụ? “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” ka Job jụrụ. (Job 14:7, 14) N’ime ọgbọ nile, ndị mmadụ n’obodo ọ bụla atụgharịwo uche n’ajụjụ ndị bụ́: À na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị? Ọ bụrụ otú ahụ, ụdị ndụ dị aṅaa? N’ihi ya, gịnị ka ndị mmadụ kwerewooro? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
Ọtụtụ Azịza, Otu Isiokwu
4. Gịnị ka ndị mmadụ nọ n’okpukpe dị iche iche kweere banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
4 Ọtụtụ ndị bụ́ ndị Kraịst egbugbere ọnụ kweere na mgbe ha nwụsịrị, ndị mmadụ na-aga n’eluigwe ma ọ bụ na hel. N’aka nke ọzọ, ndị Hindu kweere n’ịlọ ụwa. Dị ka nkwenkwe Alakụba si dị, a ga-enwe ụbọchị ikpe mgbe a nwụsịrị, mgbe Allah ga-atụle ụzọ ndụ onye ọ bụla wee tinye mmadụ nke ọ bụla na paradaịs ma ọ bụ n’ọkụ mmụọ. N’ala ụfọdụ, nkwenkwe banyere ndị nwụrụ anwụ bụ ngwakọta dị mgbagwoju anya nke ọdịnala obodo na Iso Ụzọ Kraịst egbugbere ọnụ. Dị ka ihe atụ, na Sri Lanka, ma ndị Buddha ma ndị Katọlik na-emegheru ọnụ ụzọ na windo n’isi mgbe ọnwụ gburu mmadụ n’ezinụlọ ha, ha na-adọwakwa igbe ozu ahụ ka ụkwụ onye ahụ nwụrụ anwụ na-eche n’ọnụ ụzọ mbata ụlọ. Ha kweere na usoro ndị a na-eme ka mmụọ, ma ọ bụ mkpụrụ obi nke onye ahụ nwụrụ anwụ pụọ ngwa ngwa. N’ime ọtụtụ ndị Katọlik na ndị Protestant nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ bụ omenala ikpuchi enyo mgbe mmadụ nwụrụ ka onye ọ bụla ghara ile ya anya wee hụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Mgbe ahụ, ụbọchị 40 mgbe e mesịrị, ezinụlọ na ndị enyi na-eme ememe maka nrịgo nke mkpụrụ obi ya n’eluigwe.
5. Nkwenkwe dị aṅaa bụ́ isi ka ihe ka n’ọtụtụ okpukpe kwekọrịtara?
5 N’agbanyeghị ọdịiche a, o yiri ka ihe ka n’ọtụtụ okpukpe na-ekwekọrịta n’otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ma ọ dịkarịa ala. Ha kwere na ihe dị n’ime mmadụ—ma à na-akpọ ya mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ—adịghị anwụ anwụ, na ọ na-adịgidekwa ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọtụtụ narị okpukpe na òtù nile nke Krisendọm na-akwado nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Nkwenkwe a bụkwa ozizi a nakweere n’okpukpe ndị Juu. Ọ bụ kpọmkwem ntọala nke ozizi ịlọ ụwa nke okpukpe Hindu. Ndị Alakụba kweere na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị. Ndị Aborigine nke Australia, okpukpe ọdịnala nke Africa, Shinto, ọbụna Buddha, na-ezicha ụdị dị iche iche nke otu isiokwu a.
6. Olee otú ndị ọkà mmụta ụfọdụ si ele echiche ahụ nke bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ anya?
6 N’aka nke ọzọ, e nwere ndị nwere echiche na ndụ ịma ihe na-akwụsị n’ọnwụ. Nye ha, echiche bụ́ na ndụ nke nwere mmetụta na ọgụgụ isi na-adịgide n’ime mkpụrụ obi na-abụghị mmadụ, nke dị inyoghi inyoghi, nke na-enweghị anụ ahụ, yiri ihe ezi uche na-adịtụghị na ya. Onye ọkà mmụta nke narị afọ nke 20 si Spain bụ́ Miguel de Unamuno na-ede, sị: “Ikwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụ ịchọ ka mkpụrụ obi ghara ịnwụ anwụ, ịchọkwa ya ná mkpebisi ike nke na ọchịchọ a ga-eme ka e leghara ihe ezi uche dị na ya anya.” Ndị ọzọ bụ́ ndị kweere n’ụzọ yiri nke a gụnyere ndị dị iche iche dị ka ndị ọkà ihe ọmụma oge ochie a ma ama, bụ́ Aristotle na Epicurus, onye dibịa bụ́ Hippocrates, David Hume bụ́ onye Scotland bụ́ ọkà ihe ọmụma, Averroës bụ́ onye Arab bụ́ ọkà mmụta, na praịm minista mbụ nke India mgbe ha nweeresịrị onwe ha, bụ́ Jawaharlal Nehru.
7. Olee ajụjụ ndị dị mkpa banyere nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi nke a na-aghaghị ịtụle ugbu a?
7 N’ịbụ ndị echiche na nkwenkwe ndị dị otú ahụ na-emegide onwe ha chere ihu, anyị aghaghị ịjụ, sị: Ànyị nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ n’ezie? Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ n’ezie, oleezi otú ozizi ụgha dị otú ahụ pụrụ isi bụrụ akụkụ dị mkpa nke ọtụtụ okpukpe nke taa? Olee ebe echiche ahụ si bịa? Ọ dị oké mkpa ka anyị chọta azịza ndị bụ́ eziokwu, na-ejukwa afọ nye ajụjụ ndị a n’ihi na ọdịnihu anyị dabeere na ya. (1 Ndị Kọrint 15:19) Ma, na mbụ, ka anyị tụlee otú ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si malite.
Mmalite nke Ozizi Ahụ
8. Òkè dị aṅaa ka Socrates na Plato keere n’ịkwalite echiche bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ?
8 E kwuru na ndị ọkà ihe ọmụma Gris nke narị afọ nke ise T.O.A., bụ́ Socrates na Plato so ná ndị mbụ kwalitere nkwenkwe bụ́ na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ. Ma, ha abụghị ndị malitere echiche ahụ. Kama nke ahụ, ha nụchara ma mee ka ọ ghọọ nkụzi nkà ihe ọmụma, si otú ahụ na-eme ka ọ masịkwuo ndị gụrụ akwụkwọ nke ụbọchị ha na mgbe ọ gasịrị. Eziokwu bụ na ndị òtù Zoroaster nke Peasia oge ochie na ndị Ijipt bu ha ụzọ kwerekwara n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Ajụjụ bụzi, Olee ebe e si nweta ozizi a?
9. Olee ebe ihe nwere mmetụta n’ọdịnala oge ochie nke Ijipt, Peasia, na Gris si?
9 “N’ụwa oge ochie,” ka akwụkwọ bụ́ The Religion of Babylonia and Assyria na-ekwu, “Ijipt, Peasia, na Gris nwere mmetụta nke okpukpe Babilọn.” Banyere nkwenkwe okpukpe ndị Ijipt, akwụkwọ ahụ na-aga n’ihu ikwu, sị: “N’ihi mmekọrịta Ijipt na Babilọn nwere site na gboo, dị ka mbadamba nkume nke El-Amarna si kpughee, o doro anya na e nwere nnọọ ọtụtụ ohere iji gwakọta echiche na omenala Babilọn n’usoro ofufe Ijipt.”a A pụrụ ikwu nnọọ otu ihe ahụ banyere ọdịnala ochie nke ndị Peasia na ndị Gris.
10. Gịnị bụ echiche Babilọn banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
10 Ma ndị Babilọn ochie hà kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi? N’ebe a, Prọfesọ Morris Jastrow, Jr., nke Mahadum Pennsylvania, U.S.A., dere, sị: “Ọ dịghị mgbe ma ndị mmadụ ma ndị ndú nke echiche okpukpe [nke Babilọn] zutere ikwe omume nke mgbuchapụ kpam kpam nke ihe e meburu ka ọ dị adị. Ọnwụ [n’echiche ha] bụ ụzọ e si abanye n’ụdị ndụ ọzọ, nanị ihe ịgọnarị anwụghị anwụ [nke ndụ a dị ugbu a] na-eme bụ imesi ike ekweghị omume nke ịlanarị mgbanwe n’ịdị adị nke ọnwụ na-akpata.” Ee, ndị Babilọn kweere na ụdị ndụ ụfọdụ, n’ụzọ ụfọdụ, na-adịgide mgbe a nwụsịrị. Ha gosipụtara nke a site n’ilikọta ndị nwụrụ anwụ na ngwongwo ndị ha ga-eji eme ihe ná Ndụ Mgbe A Nwụsịrị.
11, 12. Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, olee ebe ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere?
11 N’ụzọ doro anya, ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere laa azụ na Babilọn ochie. Nke ahụ ọ̀ dị ịrịba ama? N’ezie ọ dị, n’ihi na dị ka Bible si kwuo, ọ bụ Nimrọd, bụ́ nwa nwa Noa, guzobere obodo ukwu Bebel, ma ọ bụ Babilọn. Mgbe Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ n’ụbọchị Noa gasịrị, mmadụ nile sụrụ otu asụsụ ma nwee otu okpukpe. Ọ bụghị nanị na Nimrọd bụ onye “[na-emegide, NW] Jehova” kama ya na ụmụazụ ya chọrọ ‘imere onwe ha aha.’ N’ihi ya, site n’iguzobe obodo ukwu ahụ na iwu ụlọ elu n’ebe ahụ, Nimrọd malitere okpukpe dị iche.—Jenesis 10:1, 6, 8-10; 11:1-4.
12 Dị ka ọdịnala si kwuo, Nimrọd nwụrụ ọnwụ ike. Mgbe ọnwụ ya gasịrị, n’ụzọ echiche dị n’ime ya ndị Babilọn ga-achọworị ịkwanyere ya nnukwu ùgwù dị ka onye guzobere, onye wuru, na eze mbụ obodo ukwu ha. Ebe e lere chi bụ́ Marduk (Merodak) anya dị ka onye guzobere Babilọn, ọbụna ọtụtụ ndị eze Babilọn zakwara aha ya, ndị ọkà mmụta ụfọdụ atụwo aro na Marduk na-anọchite anya Nimrọd e mere chi. (2 Ndị Eze 25:27; Aịsaịa 39:1; Jeremaịa 50:2) Ọ bụrụ na nke a dị otú ahụ, mgbe ahụ echiche nke na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị aghaghị ịdịworị adị ma ọ dịghị mgbe ọzọ n’oge ọnwụ Nimrọd. Otú o sina dị, akụkọ ihe mere eme na-ekpughe na mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ebe ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere bụ na Bebel, ma ọ bụ Babilọn.
13. Olee otú ozizi nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ si gbasazuo n’elu ụwa, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
13 Bible gara n’ihu igosi na Chineke mebiri mgbalị nke ndị ahụ na-ewu ụlọ elu na Bebel site n’ịghagbu asụsụ ha. N’ịbụ ndị na-enweghịzi ike isoro ibe ha kwurịta okwu, ha gbahapụrụ ihe owuwu ha, ‘e sikwa n’ebe ahụ gbasaa ha n’elu ụwa nile.’ (Jenesis 11:5-9) Anyị kwesịrị iburu n’uche na ọ bụ ezie na a ghagbuwo asụsụ ndị a gaara ewu ụlọ elu, a ghagbubeghị echiche ha. N’ihi ya, ebe ọ bụla ha gara, ha ji echiche okpukpe ha gaa. N’ụzọ a, ozizi okpukpe ndị Babilọn—gụnyere nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi—gbasapụrụ n’elu ala ma ghọọ ntọala nke okpukpe ndị bụ́ isi nke ụwa. N’ihi ya, e guzobere alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke a kọwara n’ụzọ ziri ezi n’ime Bible dị ka “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.”—Mkpughe 17:5.
Alaeze Ụwa nke Okpukpe Ụgha Agbasapụ Ruo n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ
14. Olee otú nkwenkwe okpukpe ndị Babilọn si gbasaa baa n’ógbè ndị mejupụtara ala sara mbara nke India?
14 Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-asị na ihe karịrị 3,500 afọ gara aga, ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịkwaga n’obodo ọzọ mere ka ndị Aryan akpụkpọ ahụ ha na-acha anwụ anwụ si n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ gaa ná Ndagwurugwu Indus, bụ́ nke dịzi karịsịa na Pakistan na India. Site n’ebe ahụ ha gbasara baa n’ala dị larịị nke Osimiri Ganges ma gafee India. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-asị na echiche okpukpe nke ndị ahụ kwafere n’obodo ọzọ dabeere n’ozizi nke Iran na Babilọn oge ochie. Echiche okpukpe ndị a ghọziri mkpọrọgwụ nke okpukpe Hindu.
15. Olee otú echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ si emetụta okpukpe Hindu nke oge a?
15 N’India echiche anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi dị n’ụdị ozizi ịlọ ụwa. Ndị nkụzi Hindu, bụ́ ndị ha na nsogbu nke ihe ọjọọ na ahụhụ zuru ụwa ọnụ n’etiti ụmụ mmadụ nọ na-agba mgba, chepụtara ihe a na-akpọ iwu nke Karma, iwu nke ihe kpatara ihe na ihe ọ rụpụtara. N’ijikọta iwu a na nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ha malitere ozizi ịlọ ụwa, bụ́ nke na-asị na a na-enyeghachi ihe ọma e mere ma ọ bụ ihe ọjọọ e mere n’otu oge ndụ ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ntaramahụhụ ya ná ndụ ọzọ. Ihe mgbaru ọsọ nke onye kwesịrị ntụkwasị obi bụ moksha, ma ọ bụ ntọhapụ pụọ n’usoro mmụghachi na ijikọta ya na ihe a na-akpọ ịdị adị kasịnụ, ma ọ bụ Nirvana. N’ime ọtụtụ narị afọ, ka okpukpe Hindu na-agbasa, otú a ka ozizi ịlọ ụwa na-agbasa. Nkwenkwe a abụrụwokwa isi sekpụ ntị nke okpukpe Hindu oge a.
16. Nkwenkwe dị aṅaa banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị jupụtara n’echiche na n’omume nke ụba mmadụ nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia?
16 Okpukpe ndị ọzọ dị ka okpukpe Buddha, okpukpe Jain, na okpukpe Sikh sitere n’okpukpe Hindu. Ndị a kwa kwere n’ịlọ ụwa. Ọzọkwa, ka okpukpe Buddha na-abami ihe ka ọtụtụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia—China, Korea, Japan, na ebe ndị ọzọ—o nwere oké mmetụta n’ọdịbendị na okpukpe nke ógbè ahụ dum. Nke a mere ka e nwee okpukpe ndị na-egosipụta ngwakọta nke nkwenkwe dị iche iche, na-agụnye ihe ndị sitere n’okpukpe Buddha, mgbaasị, na ofufe ndị nna ochie. Ndị kasị nwee ikike n’ime ndị a bụ okpukpe Tao, okpukpe Confucius, na okpukpe Shinto. N’ụzọ a, nkwenkwe nke na ndụ na-adịgide mgbe anụ ahụ nwụsịrị ejupụtawo n’echiche na n’omume dị iche iche nke okpukpe nke ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nọ n’akụkụ ụwa ahụ.
Gịnị Banyere Okpukpe Ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba?
17. Gịnị ka ndị Juu oge ochie kweere banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
17 Gịnị ka ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, okpukpe Krisendọm, na Alakụba kweere banyere ndụ mgbe a nwụsịrị? N’ime okpukpe ndị a, okpukpe ndị Juu kasị ochie. Mkpọrọgwụ ya dịrị laa azụ n’ihe dị ka afọ 4,000 n’oge Abraham—ogologo oge tupu Socrates na Plato amalite ozizi ha nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Ndị Juu oge ochie kweere ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụghịkwa n’anwụghị anwụ e ketara eketa nke mkpụrụ obi mmadụ. (Matiu 22:31, 32; Ndị Hibru 11:19) Oleezi otú ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si banye n’okpukpe ndị Juu? Akụkọ ihe mere eme na-enye azịza ya.
18, 19. Olee otú nkwenkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si banye n’okpukpe ndị Juu?
18 Na 332 T.O.A., Alexander Onye Ukwu meriri Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, tinyere Jerusalem. Ka ndị nọchiri anya Alexander gara n’ihu n’atụmatụ ya nke Mgbasa Ọdịbendị Ndị Gris, ngwakọta nke ọdịbendị abụọ ahụ—nke ndị Gris na nke ndị Juu—weere ọnọdụ. Ka oge na-aga, ndị Juu malitere ịmara echiche ndị Gris, ọbụnakwa ụfọdụ ghọrọ ndị ọkà ihe ọmụma.
19 Philo onye Alexandria, nke narị afọ mbụ O.A., bụ otu onye ọkà ihe ọmụma Juu dị otú ahụ. Ọ sọpụụrụ Plato ma gbalịa iji nkà ihe ọmụma ndị Gris akọwa okpukpe ndị Juu, wee si otú a sụọrọ ndị Juu oge ikpeazụ na-eche echiche ụzọ. Talmud—nkọwa e dere ede nke iwu ndị e nyere n’ọnụ sitere n’aka ndị rabaị—bụkwa nke echiche ndị Gris metụtara. “Ndị rabaị nke Talmud,” ka Encyclopaedia Judaica na-ekwu, “kweere ná ndịgide nke mkpụrụ obi mgbe a nwụsịrị.” Akwụkwọ ihe omimi nke ndị Juu e mesịrị nwee, dị ka Cabala, rudịrị n’ókè nke ịkụzi ịlọ ụwa. Ya mere, echiche nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi banyere n’okpukpe ndị Juu n’ụzọ na-apụtaghị ìhè site ná nkà ihe ọmụma ndị Gris. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mbanye nke ozizi ahụ n’ime Krisendọm?
20, 21. (a) Gịnị bụ nguzo ndị Kraịst oge mbụ banyere nkà ihe ọmụma Plato, ma ọ bụ Gris? (b) Gịnị dugara n’ịgwakọta echiche Plato na ozizi ndị Kraịst?
20 Ezi Iso Ụzọ Kraịst ji Jisọs Kraịst malite. Banyere Jisọs, Miguel de Unamuno, bụ́ onye e hotara ná mbụ, dere, sị: “O kweere ná mbilite n’ọnwụ nke anụ ahụ, dị ka ụzọ ndị Juu sị dị, ọ bụghị n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, dị ka ụzọ Plato [ndị Gris] si dị.” O kwubiri, sị: “Anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi . . . bụ nkwenkwe nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị.” N’ihi nke a, anyị pụrụ ịhụ ihe mere Pọl onyeozi ji dọsie ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ná ntị ike megide “nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu dị ka ọdịnala ndị mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8, NW.
21 Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka “nkwenkwe nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị” a si gbebata na Krisendọm? The New Encyclopædia Britannica na-akọwa, sị: “Malite n’etiti narị afọ nke 2 AD ndị Kraịst nwetụrụ ọzụzụ ná nkà ihe ọmụma ndị Gris malitere iche na ọ dị mkpa igosipụta okwukwe ha n’ụzọ kwekọrọ na ya, ma n’ihi iji mejuo ọchịchọ nke ọgụgụ isi ha ma iji tọghata ndị na-ekpere arụsị gụrụ akwụkwọ. Nkà ihe ọmụma nke kasị dabara ha bụ ozizi Plato.” Ndị ọkà ihe ọmụma abụọ oge mbụ dị otú ahụ kpara ike dị egwu n’ozizi Krisendọm bụ Origen nke Alexandria na Augustine nke Hippo. Echiche Plato nwere mmetụta miri emi n’ebe ha abụọ nọ, ha bụkwa ndị e ji mee ihe n’ijikọta echiche ndị ahụ na nkụzi ndị Kraịst.
22. Olee otú ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi siworo nọgide na-abụ nke na-ewu ewu n’Alakụba?
22 Ọ bụ ezie na echiche anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi e nwere n’okpukpe ndị Juu na Krisendọm bụ n’ihi mmetụta nke ozizi Plato, a kụbara echiche ahụ n’Alakụba site ná mmalite ya. Koran, bụ́ akwụkwọ nsọ nke ndị Alakụba, na-akụzi na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị. Ọ na-ekwu banyere ọdịnihu ikpeazụ a kara aka nke mkpụrụ obi dị ka nke ga-abụ ndụ n’ime ubi paradaịs eluigwe ma ọ bụ ntaramahụhụ n’ime hel na-ere ọkụ. Nke a apụtaghị na ndị ọkà mmụta Arab agbalịbeghị ịgwakọta nkụzi Alakụba na nkà ihe ọmụma ndị Gris. N’ezie, ọrụ Aristotle metụtara ógbè ndị Arab ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Otú ọ dị, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi ka bụkwa nkwenkwe ndị Alakụba.
23. Ajụjụ ndị dị aṅaa na-arụgide arụgide banyere ndụ mgbe a nwụsịrị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
23 N’ụzọ doro anya, okpukpe ndị dị gburugburu ụwa emewo ka e nwee usoro nkwenye ndị na-agbagwoju anya ná Ndụ Mgbe A Nwụsịrị, bụ́ ndị dabeere n’echiche nke na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ. Ozizi dị otú ahụ emetụtawokwa, ee, ọbụna chịkwaa ma mee ka ọtụtụ nde ndị mmadụ nọrọ n’ohu. N’ịbụ ndị e chere ihe ndị a nile n’ihu, a na-arụgide anyị ịjụ: Ọ̀ pụrụ ikwe omume ịmata eziokwu banyere ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ? À na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị? Gịnị ka Bible nwere ikwu banyere ya? Nke a ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a El-Amarna bụ mkpọmkpọ ebe nke obodo Ijipt bụ́ Akhetaton, nke a sịrị na e wuru na narị afọ nke 14 T.O.A.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị bụ otu isiokwu dị ná nkwenkwe nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
◻ Olee otú akụkọ ihe mere eme na Bible si atụ aka na Babilọn oge ochie dị ka ebe nkwenkwe nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ malitere?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka nkwenkwe Babilọn nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ si emetụta okpukpe ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ?
◻ Olee otú ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si banye n’okpukpe ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba?
[Foto dị na peeji nke 12, 13]
Mmeri nke Alexander Onye Ukwu dugara n’ịgwakọta ọdịbendị ndị Gris na ndị Juu
Augustine nwara ịgwakọta nkà ihe ọmụma Plato na Iso Ụzọ Kraịst
[Ebe e si Nweta Foto]
Alexander: Musei Capitolini, Roma; Augustine: Site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women