Anwụghị Anwụ nke Mkpụrụ Obi—Mmalite nke Ozizi Ahụ
“Ọ dịghị isiokwu metụtara ndụ ime mmụọ ya nke rikpuworo uche mmadụ dị ka nke ọnọdụ ya mgbe ọ nwụsịrị.”—“ENCYCLOPÆDIA OF RELIGION AND ETHICS.”
1-3. Olee otú Socrates na Plato si kwalite echiche nke na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ?
A NA-EBO ọkà mmụta na onye nkụzi gbara afọ 70 ebubo maka enweghị nsọpụrụ na imebi uche ndị ka na-eto eto site ná nkụzi ya. Ọ bụ ezie na ọ gọpụrụ onwe ya nke ọma mgbe a na-ekpe ya ikpe, ndị òtù ikpe nwere obi ọjọọ megide ya kwuru na ikpe mara ya ma maa ya ikpe ọnwụ. Nanị hour ole na ole tupu e gbuo ya, onye nkụzi ahụ meworo agadi gwara ụmụ akwụkwọ gbara ya gburugburu ọtụtụ okwu iji kwado na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ nakwa na ọnwụ abụghị ihe a ga-atụ egwu.
2 Nwoke ahụ a mara ikpe abụghị onye ọzọ karịa Socrates, onye ọkà ihe ọmụma Gris a ma ama nke narị afọ nke ise T.O.A.a Nwata akwụkwọ ya bụ́ Plato deturu ihe omume ndị a n’edemede ndị bụ́ Apology na Phaedo. E kwuru na Socrates na Plato so ná ndị mbụ kwalitere echiche anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Ma ha abụghị ndị malitere ozizi a.
3 Dị ka anyị ga-ahụ, mmalite echiche nke na mmadụ adịghị anwụghị anwụ malitere n’oge dị nnọọ anya gara aga. Otú ọ dị, Socrates na Plato nụchara echiche ahụ ma mee ka ọ ghọọ nkụzi nkà ihe ọmụma, si otú ahụ na-eme ka ọ masịkwuo ndị gụrụ akwụkwọ nke ụbọchị ha na mgbe ọ gasịrị.
Site na Pythagoras Gaa na Pyramid
4. Tupu Socrates, gịnị bụ echiche ndị Gris banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
4 Ndị Gris bu Socrates na Plato ụzọ kwekwara na mkpụrụ obi na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị. Pythagoras, onye ọkà mgbakọ na mwepụ a ma ama nke Gris na narị afọ nke isii T.O.A., kwere na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ nakwa na o nwere ike isi n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. Tupu oge ya, Thales nke Militọs, bụ́ onye e chere na ọ bụ onye ọkà ihe ọmụma Gris kasị ochie a maara, chere na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ dị ọ bụghị nanị n’ime mmadụ, anụmanụ, na osisi kamakwa n’ụdị ihe ndị dị ka ígwè ndọta ihe, ebe ọ bụ na ha pụrụ ịdọrọ ígwè. Ndị Gris oge ochie zọọrọ na a na-eburu mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ gafee osimiri Styx ruo n’ógbè sara mbara dị n’okpuru ala a na-akpọ ala mmụọ. N’ebe ahụ, ndị ọkàikpe na-ama mkpụrụ obi ikpe imekpa ha ahụ n’ụlọ mkpọrọ mgbidi ya dị elu ma ọ bụ inwe ọṅụ zuru oké n’Elysium.
5, 6. Olee otú ndị Peasia si lee mkpụrụ obi anya?
5 N’Iran, ma ọ bụ Peasia, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, onye amụma aha ya bụ́ Zoroaster pụtara n’ọgbọ na narị afọ nke asaa T.O.A. Ọ malitere ụzọ ofufe nke a bịara mara dị ka okpukpe Zoroaster. Nke a bụ okpukpe nke Alaeze Ukwu Peasia, bụ́ nke chịrị ụwa tupu Gris aghọọ ike ụwa bụ́ isi. Akwụkwọ nsọ ndị Zoroaster na-ekwu, sị: “N’Anwụghị Anwụ ka mkpụrụ obi ndị Ezi Omume ga-enwe Ọṅụ mgbe nile, ma ná mmekpa ahụ ka mkpụrụ obi Onye Ụgha ga-anọrịrị. Ahura Mazda [nke pụtara, “chi nwere amamihe”] enyewokwa Iwu ndị a site n’ikike Ya kasị elu.”
6 Ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi bụkwa akụkụ nke okpukpe Iran tupu Zoroaster. Dị ka ihe atụ, ebo ndị e nwere n’Iran n’oge ochie lekọtara mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ site n’inye ha ihe oriri na ákwà ga-abara ha uru n’ala mmụọ.
7, 8. Gịnị ka ndị Ijipt oge ochie kweere banyere mkpụrụ obi ịdịgide ndụ mgbe ahụ nwụsịrị?
7 Nkwenkwe ná ndụ mgbe a nwụsịrị dị oké mkpa n’okpukpe Ijipt. Ndị Ijipt kwere na Osiris, bụ́ chi kasịnụ na-achị ala mmụọ, ga-ekpe mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ ikpe. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ papyrus a sịrị na e dere eri narị afọ nke 14 T.O.A., na-egosi Anubis, bụ́ chi nke ndị nwụrụ anwụ, ebe o du mkpụrụ obi onye odeakwụkwọ bụ́ Hunefer na-agakwu Osiris. A tụrụ mkpụrụ obi onye odeakwụkwọ ahụ, nke nọchitere anya akọ na uche ya na abụba nke chi nwanyị nke eziokwu na ikpe ziri ezi tunyere n’isi ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Thoth, nke bụ́ chi ọzọ na-edekọ ihe si na ya pụta. Ebe obi Hunefer na-adịghị arọ n’ihi amamikpe, ọ dịrughị arọ ka abụba ahụ, e wee kwere ka Hunefer bata n’ógbè Osiris wee nata anwụghị anwụ. Papyrus ahụ na-egosikwa nwanyị obi ọjọọ na-eguzo n’akụkụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ, na-adị njikere iripịa onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na obi ya adaa ule ahụ. Ndị Ijipt na-agbasikwa ndị ha nwụrụ anwụ, ha na-echekwakwa ozu ndị fero na pyramid ndị buru ibu, ebe ha chere na ndịgide ndụ nke mkpụrụ obi dabeere n’ichekwa ahụ.
8 Mgbe ahụ, ọtụtụ ọdịnala oge ochie kwekọrịtara n’otu nkụzi—anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Hà nwetara nkụzi a site n’otu ebe?
Ebe Ọ Malitere
9. Olee okpukpe nwere mmetụta n’ụwa oge ochie nke Ijipt, Peasia, na Gris?
9 “N’ụwa oge ochie,” ka akwụkwọ bụ́ The Religion of Babylonia and Assyria na-ekwu, “Ijipt, Peasia, na Gris nwere mmetụta nke okpukpe Babilọn.” Akwụkwọ a na-aga n’ihu ịkọwa, sị: “N’ihi mmekọrịta Ijipt na Babilọn nwere site na gboo, dị ka mbadamba nkume El-Amarna si kpughee, o doro anya na e nwere nnọọ ọtụtụ ohere iji gwakọta echiche na omenala Babilọn n’usoro ofufe Ijipt. Na Peasia, usoro ofufe Mithra na-ekpughe mmetụta doro anya nke echiche Babilọn . . . Ndị ọkà mmụta n’ozuzu ha kwetara na e nwere ngwakọrịta siri ike nke ozizi ndị Juu ma n’akụkọ ọdịbendị ndị mbụ na-emeghị eme nke Gris ma n’usoro ofufe dị iche iche nke ndị Gris nke na oké okwu adịkwaghị mkpa. N’ụzọ dị ukwuu ozizi ndị Juu ndị a sitere Babilọn kpọmkpem.”b
10, 11. Gịnị bụ echiche Babilọn banyere ndụ mgbe a nwụsịrị?
10 Ma ọ̀ bụ na echiche Babilọn nke ihe na-eme mgbe a nwụsịrị adịghị nnukwu iche n’echiche nke ndị Ijipt, ndị Peasia na ndị Gris? Dị ka ihe atụ, tụlee Epic of Gilgamesh nke Babilọn. Onye bụ dike na ya meworo agadi, bụ́ Gilgamesh, n’ịbụ onye eziokwu nke ọnwụ nyere nsogbu, buliri njem ịchọ anwụghị anwụ ma ọ chọtaghị ya. Ọbụna otu nwanyị na-ere mmanya o zutere ka ọ na-eme njem ya gbara ya ume ka o jiri ndụ ọ dị ugbu a mee ihe kasịnụ, n’ihi na ọ gaghị ahụ ndụ agwụghị agwụ ọ na-achọ. Ozi nke uri ahụ dum bụ na ọnwụ ga-egburịrị na olileanya nke anwụghị anwụ bụ echiche ụgha. Nke a ọ̀ ga-egosi na ndị Babilọn ekweghị ná Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
11 Prọfesọ Morris Jastrow, Jr., nke Mahadum Pennsylvania, U.S.A., dere, sị: “Ọ dịghị mgbe ma ndị mmadụ ma ndị ndú nke echiche okpukpe [nke Babilọn] zutere ikwe omume nke mgbuchapụ kpamkpam nke ihe e meburu ka ọ dị adị. Ọnwụ [n’echiche ha] bụ ụzọ e si abanye n’ụdị ndụ ọzọ, nanị ihe ịgọnarị anwụghị anwụ na-eme bụ imesi ike ekweghị omume nke ịlanarị mgbanwe n’ịdị adị nke ọnwụ na-akpata.” Ee, ndị Babilọn kwekwara na ụdị ndụ ụfọdụ, n’ụzọ ụfọdụ, na-adịgide mgbe a nwụsịrị. Ha gosipụtara nke a site n’ilikọta ndị nwụrụ anwụ na ngwongwo ndị ha ga-eji eme ihe ná Ndụ Mgbe A Nwụsịrị.
12-14. (a) Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, olee ebe ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere? (b) Olee otú nkwenkwe ahụ si gbasazuo n’ụwa?
12 N’ụzọ doro anya, ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere laa azụ na Babilọn ochie. Dị ka Bible, bụ́ akwụkwọ nke nwere akara nke ezi akụkọ ihe mere eme si kwuo, ọ bụ Nimrọd, bụ́ nwa nwa Noa, guzobere obodo ukwu Bebel, ma ọ bụ Babilọn.c Mgbe Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ n’ụbọchị Noa gasịrị, e nwere nanị otu asụsụ na otu okpukpe. Site n’iguzobe obodo ukwu ahụ na iwu ụlọ elu n’ebe ahụ, Nimrọd malitere okpukpe ọzọ. Ihe ndekọ Bible na-egosi na mgbe a ghagbusịrị asụsụ na Bebel, ndị ahụ na-ewu ụlọ elu ihe na-agaghịrị nke ọma gbasara ma malite ndụ n’isi, na-ewere okpukpe ha na-aga. (Jenesis 10:6-10; 11:4-9) Ozizi okpukpe dị iche iche nke Babilọn si otú a gbasazuo n’ụwa.
13 Ọdịnala kwuru na Nimrọd nwụrụ ọnwụ ike. Mgbe ọnwụ ya gasịrị, n’ụzọ echiche dị n’ime ya ndị Babilọn ga-achọworị ịkwanyere ya nnukwu ùgwù dị ka onye guzobere, onye wuru, na eze mbụ nke obodo ukwu ha. Ebe e lere chi bụ́ Marduk (Merodak) anya dị ka onye guzobere Babilọn, ndị ọkà mmụta ụfọdụ atụwo aro na Marduk na-anọchite anya Nimrọd e mere chi. Ọ bụrụ na nke a dị otú ahụ, mgbe ahụ echiche nke na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị aghaghị ịdịworị adị ma ọ dịghị mgbe ọzọ n’oge ọnwụ Nimrọd. Otú o sina dị, akụkọ ihe mere eme na-ekpughe na mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ebe ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi malitere bụ na Bebel, ma ọ bụ Babilọn.
14 Ma, n’ụzọ dị aṅaa ka nkwenkwe a si ghọọ akụkụ dị mkpa nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe nke oge anyị? Nkebi na-esonụ ga-atụle mbanye ya n’okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a T.O.A pụtara “Tupu Oge Anyị.” O.A. na-egosi “Oge Anyị,” nke a na-akpọkarị A.D., maka Anno Domini, nke pụtara “n’ime afọ nke Onyenwe anyị.”
b El-Amarna bụ mkpọmkpọ ebe nke obodo Ijipt bụ́ Akhetaton, nke a sịrị na e wuru na narị afọ nke 14 T.O.A.
c Lee The Bible—God’s Word or Man’s?, peji nke 37-54, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Echiche Ijipt banyere mkpụrụ obi n’ala mmụọ
[Foto dị na peeji nke 7]
Socrates rụrụ ụka na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ