Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 7/15 p. 3
  • À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Ndụ A Na-adị Mgbe A Nwụsịrị—Ajụjụ Ndị A Na-azabeghị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Ndị Mmadụ Kweere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ?
    Ì Nwere Mmụọ Na-adịghị Anwụ Anwụ?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 7/15 p. 3

À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?

“Ọ BỤRỤ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” ka nna ochie ahụ bụ́ Job jụrụ n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga. (Job 14:14) Ajụjụ a agbagwojuwo ihe a kpọrọ mmadụ anya ruo ọtụtụ puku afọ. N’ime ọgbọ nile, ndị mmadụ n’obodo ọ bụla atụgharịwo uche n’okwu a ma chepụta nkwenkwe dị iche iche.

Ọtụtụ ndị Kraịst elu ọnụ kweere n’ịga eluigwe na hel. N’aka nke ọzọ, ndị Hindu kweere n’ịlọ ụwa. N’ikwu banyere echiche ndị Alakụba, Emir Muawiyah, bụ́ osote onyeisi n’ogige okpukpe Alakụba, na-ekwu, sị: “Anyị kweere na a ga-enwe ụbọchị ikpe mgbe a nwụsịrị, mgbe ị ga-aga n’ihu Chineke, bụ́ Allah, nke ga-adị nnọọ ka ịbanye n’ụlọikpe.” Dị ka nkwenkwe Alakụba si dị, mgbe ahụ Allah ga-atụle ụzọ ndụ nke onye ọ bụla wee tinye mmadụ na paradaịs ma ọ bụ n’ọkụ mmụọ.

Na Sri Lanka, ma ndị Buddha ma ndị Katọlik na-emegheru ọnụ ụzọ na windo n’isi mgbe mmadụ nwụrụ n’ezinụlọ ha. A na-amụnye mpanaka, a na-adọwakwa igbe ozu ahụ ka ụkwụ onye ahụ nwụrụ anwụ na-eche ọnụ ụzọ mbata ụlọ ihu. Ha kweere na usoro ndị a na-eme ka mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ pụọ ngwa ngwa.

Dị ka Ronald M. Berndt nke Mahadum Ebe Ọdịda Anyanwụ Australia si kwuo, ndị Aborigine nke Australia kweere na “a pụghị ibibi mmụọ ụmụ mmadụ ebibi.” Ebo ụfọdụ dị n’Africa kweere na mgbe a nwụsịrị, ụmụ mmadụ nkịtị na-aghọ ndị mmụọ, ebe ndị a ma ama na-aghọ ndị nna ochie bụ́ mmụọ bụ́ ndị a ga-asọpụrụ ma kpọkuo dị ka ndị ndú a na-adịghị ahụ anya nke ógbè.

N’ala ụfọdụ, nkwenkwe ndị e nwere banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ bụ ngwakọta nke ọdịnala obodo na ihe a sị na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst. Dị ka ihe atụ, n’etiti ọtụtụ ndị Katọlik na ndị Protestant nọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ bụ omenala ikpuchi enyo mgbe mmadụ nwụrụ ka onye ọ bụla ghara ilenye ya anya wee hụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ.

N’ezie, azịza ndị mmadụ na-enye ajụjụ ahụ bụ́ ‘Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?’ dị iche iche. Ma, otu echiche bụ́ isi bụ: Ọ dị ihe na-adịghị anwụ anwụ nke dị n’ime mmadụ, ọ na-adịgidekwa ndụ mgbe a nwụsịrị. Ụfọdụ kweere na “ihe” ahụ bụ mmụọ. Dị ka ihe atụ, n’akụkụ ụfọdụ nke Africa na Esia nakwa n’ógbè nile nke Polynesia, Melanesia, na Micronesia bụ́ ndị dị na Pacific, ọtụtụ ndị kweere na mmụọ—ọ bụghị mkpụrụ obi—adịghị anwụ anwụ. N’ezie, e nweghịdị okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” n’asụsụ ụfọdụ.

Ọ̀ dị mmụọ nke dị n’ime mmadụ dị ndụ? Mmụọ ahụ ọ̀ na-ahapụ ahụ n’ezie mgbe mmadụ nwụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị na-eme ya? Gịnịkwa bụ olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ? E kwesịghị ileghara ajụjụ ndị a anya. N’agbanyeghị okpukpe ma ọ bụ ọdịbendị ọ bụla e nwere n’ebe i si, ọnwụ bụ ihe a na-aghaghị iche ihu. N’ihi ya, okwu ndị ahụ gbasara gị n’ụzọ dị ukwuu. Anyị na-agba gị ume ilebara okwu ahụ anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya