Mkpụrụ Obi Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Anwụ Anwụ?
N’EMEGHỊ mkpọtụ, ndị enyi na ezinụlọ na-agafe n’akụkụ igbe ozu ahụ ghere oghe. Ha na-elegide anya n’ozu ahụ, bụ́ nke nwatakịrị nwoke dị afọ 17. O siiri ndị enyi ya sitere n’ụlọ akwụkwọ ike ịmata ya. Iji ọgwụ agwọ ọrịa akpụwo ya isi; ọrịa cancer emewo ka ọ taa ahụ nke ukwuu. Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ enyi ha n’ezie? Nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ, o jupụtara n’echiche, n’ajụjụ, n’ume—ná ndụ! Nne nwatakịrị nwoke ahụ ji anya mmiri kwuo ugboro ugboro, sị: “Obi dị Tommy ụtọ ugbu a karị. Chineke chọrọ ka ya na Tommy nọrọ n’eluigwe.”
Nne a obi gbawara na-enweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke olileanya na nkasi obi n’echiche nke na n’ụzọ ụfọdụ nwa ya nwoke ka dị ndụ. Na chọọchị a kụzielere ya na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ, na ọ bụ isi nke ọdịdị mmadụ, echiche, ikike ncheta—“onye” ahụ. O kwenyere na mkpụrụ obi nwa ya nwoke anwụbeghị ma ọlị; onye mmụọ dị ndụ, ọ hapụrụ ahụ ya mgbe ọ nwụrụ ma gaa n’eluigwe ije soro Chineke na ndị mmụọ ozi nọrọ.
N’oge ọdachi, obi mmadụ na-araparasi ike ná ntakịrị olileanya ọ bụla, ya mere o sighị ike ịhụ ihe mere nkwenkwe a ji na-adọrọ mmasị dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, tụlee ụzọ ọkà mmụta okpukpe bụ́ J. Paterson-Smyth si kwupụta uche ya n’akwụkwọ bụ́ The Gospel of the Hereafter: “Ọnwụ bụ nnọọ ihe nta ma e ji ya tụnyere ihe na-abịa ma ọ gasịa—ụwa ahụ dị oké ebube nke Ọnwụ na-eduba anyị.”
Gburugburu ụwa na n’ọtụtụ okpukpe na ọdịbendị, ndị mmadụ kwere na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ n’ime ya, mmụọ maara ihe na-aganụ nke na-anọgide na-adị ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na nkwenkwe ahụ dị ebe nile n’ọtụtụ puku okpukpe na ịrọ òtù nke Krisendọm. Ọ bụkwa ozizi a nakweere n’okpukpe ndị Juu. Ndị Hindu kwere na e kere atman, ma ọ bụ mkpụrụ obi ná mmalite nke oge, a tụọ ya mkpọrọ n’ime ahụ n’ọmụmụ, ma gaa n’ahụ ọzọ mgbe a nwụrụ n’usoro na-aga n’ihu nke ịlọ ụwa. Ndị Alakụba kwere na mkpụrụ obi na-eso anụ ahụ malite dịrị ma dịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị. Okpukpe ndị ọzọ—ndị okpukpe ọdịnala nke Africa, ndị Shinto, ọbụna ndị Buddha n’ụzọ ụfọdụ—na-ezi ihe dị iche iche n’otu isiokwu a.
Ụfọdụ Ajụjụ Ndị Na-enye Nsogbu n’Obi
Ọ bụ ezie na echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na-adọrọ mmasị n’ụzọ na-enweghị ngọpụ na n’ụzọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile, n’agbanyeghị nke ahụ ọ na-ewelite ajụjụ ndị na-enye nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ na-eche ebe mkpụrụ obi nke onye a hụrụ n’anya na-aga ma ọ bụrụ na onye ahụ ebighị ndụ bụ ihe nlereanya. À ga-eme ka ọ lọ ụwa dị ka ụfọdụ ụdị nke ndụ dị ala? Ka à na-ezije ya pọgatrị, bụ́ ebe a ga-eji usoro itinye n’ọkụ sachaa ya ruo mgbe e chere na o ruola ịga eluigwe? Nke ka njọ, à ga-ata ya ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ? Ka ọ̀ bụ mmụọ a na-aghaghị ime ka obi ya jụrụ, dị ka ọtụtụ ndị okpukpe ọdịnala na-akụzi?
Ụdị echiche ndị ahụ na-akpatara ndị dị ndụ ịtụ anya ihe ndị dị arọ. Ànyị ga-eme ka obi nke mmụọ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ jụrụ ka ha ghara ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ anyị? Ò kwesịrị ka anyị nyere ha aka ịpụta na pọgatrị dị njọ? Ka nanị ihe anyị ga-eme ọ̀ bụ ịma jijiji n’ụjọ a na-amaghị ihe a ga-eme n’echiche nke ahụhụ ha na-ata n’ime hel? Ka ànyị ga-emeso ụfọdụ anụmanụ dị ndụ omume dị ka a ga-asị na ha bu mkpụrụ obi nke ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ?
Ajụjụ ndị na-ebilite banyere Chineke n’onwe ya na-enyekwa nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nne na nna, dị ka nne ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-enweta nkasi obi site n’echiche nke na Chineke “weere” mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke nwa ha gaa n’eluigwe isoro ya nọrọ. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, n’oge na-adịghị anya ha ga-amalite iche ụdị Chineke nke ga-ewetara nwa aka ya dị ọcha ọrịa ọjọọ, na-anapụ onye ahụ a hụrụ n’anya n’aka nne na nna obi gbawara nanị iji kpọga nwa ahụ n’eluigwe tupu oge ya eruo. Ebee ka ikpe ziri ezi, ịhụnanya, obi ebere, dị n’ime Chineke dị otú ahụ? Ọbụna ụfọdụ na-enwe obi abụọ banyere amamihe nke Chineke dị otú ahụ. Ha na-ajụ ihe mere Chineke nwere amamihe ga-eji tinye mkpụrụ obi ndị a nile n’ụwa ná mmalite ma ọ bụrụ na ha nile kwesịrị imesịa biri n’eluigwe? Nke ahụ ọ́ gaghị apụta na okike nke ụwa bụ n’ezie mgbalị furu ọhịa nke ukwuu?—Tụlee Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 103:8; Aịsaịa 45:18; 1 Jọn 4:8.
Ya mere, n’ụzọ doro anya, ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, n’ụdị ọ bụla a na-ezi ozizi ahụ, na-ewelite ajụjụ ndị na-agbagwoju anya, ọbụna ndị na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi gịnị? Nsogbu ya dị ukwuu metụtara mmalite nke ozizi a. Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-enye nghọta inyocha mkpọrọgwụ ndị a ná mkpirikpi; ọ pụkwara ịtụ gị n’anya ịmụta ihe Bible n’onwe ya na-ekwu banyere mkpụrụ obi. Ọ na-enye olileanya dị nnọọ mma maka ndụ mgbe a nwụsịrị karịa nke okpukpe nke ụwa na-ezikarị.