Ikwusara Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Ozi Ọma
1. Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ọgbakọ anyị, olee ndị anyị nwere ike ịhụ?
1 Jizọs Kraịst buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile “ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.” Ndị niile na-eso n’ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe maara na ihe a e kwuru dị mkpa. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ka anyị na-ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị mmadụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị nwere ike ịhụ ndị si ala ọzọ ma ọ bụ ndị Nigeria asụsụ ha dị iche na nke anyị. Ndị a kwesịkwara ịnụ ozi Alaeze ahụ ma nabata eziokwu ahụ tupu ụbọchị Jehova nke dị oké egwu abịa. (Mal. 3:18) Olee otú anyị ga-esi enyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ nọ n’ókèala ọgbakọ anyị aka?
2. Olee otú anyị ga-esi ṅomie Jehova mgbe anyị hụrụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ n’ozi ọma?
2 Na-ele Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha: Iji gosi na anyị hụrụ mmadụ niile nọ n’ókèala anyị n’anya otú Jehova si hụ ha, o kwesịrị ịgụsi anyị agụụ ike inyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova, n’agbanyeghị asụsụ ha na-asụ. (Ọma 83:18; Ọrụ 10:34, 35) Ọ bụ eziokwu na ndị anyị na-ebukarị n’obi izi ozi ọma bụ ndị na-asụ asụsụ anyị ji amụ ihe n’ọgbakọ, anyị kwesịkwara iburu n’obi na anyị nwere ike ịhụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ, ma chọọ ụzọ zie ha ozi ọma Alaeze Chineke. Ịhapụ izi ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma na-egosi na anyị anaghị emezu nzube Jehova, nke bụ́ ka e kwusaara ndị nke mba niile ozi ọma ahụ. Oleezi otú anyị ga-esi enyere ndị na-anaghị asụ asụsụ anyị aka?
3. Olee ngwá ọrụ bara uru e nyere anyị, oleekwa otú anyị ga-esi kwadebe maka iji ya na-ezi ozi ọma?
3 Jiri Akwụkwọ Nta Bụ́ Good News for People of All Nations (Ozi Ọma Maka Ndị Mba Niile) Na-eje Ozi: E mere akwụkwọ nta a ka anyị jiri ya na-ezi ndị na-asụ asụsụ dị iche na nke anyị ozi ọma. Hụ na akwụkwọ nta a na-adị n’akpa gị oge niile, mụta otú e si eji ya ezi ozi ọma, ma kwadebe iji ya zie ozi ọma. I nwere ike ịkanye ihe n’asụsụ ndị ị ma na e nwere ndị na-asụ ya n’ókèala unu ka o nwee ike ịdịrị gị mfe nchọta. Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ anyị ndị dị n’asụsụ ndị ahụ, ọ ga-adị mma ma i nweta ole na ole ị ga-enye mmadụ mgbe ọ gụchara ihe e dere n’akwụkwọ nta ahụ.
4. Olee otú anyị ga-esi na-eji akwụkwọ nta bụ́ Good News for People of All Nations na-ezi ozi ọma?
4 Ị nọrọ n’ozi ọma hụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ya abụrụkwa na ị maghị asụsụ ọ bụ, gosi onye ahụ ihu akwụkwọ nta ahụ. Sapeta ebe e sere maapụ ụwa. Tụọ onwe gị aka ma tụọ aka ebe i si na maapụ ahụ, meekwa ka ọ mara na ị ga-achọ ịma ebe yanwa si nakwa asụsụ ọ na-asụ. Ị mata asụsụ ọ na-asụ, sapeta ebe e depụtara aha asụsụ dị iche iche n’akwụkwọ ahụ, gaa na peeji e depụtara ozi ọma ahụ n’asụsụ ya. Gosi onye ahụ ihe e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo n’elu peeji ahụ, tụọrọ ya aka n’ihe e dere na peeji ahụ ka ọ gụọ ya. Ya gụchaa ya, nye ya traktị e dere n’asụsụ ya ma ọ bụ tụọrọ ya aka n’ahịrịokwu ahụ ụcha ya dị iche na peeji ahụ, bụ́ ebe e kwuru na ị ga-achọ ịlaghachi wetara ya akwụkwọ ọzọ e dere n’asụsụ ya. Tụziere ya aka n’ebe e dere “aha m” n’aka okpotokpo, ma kpọọrọ ya aha gị otú ọ ga-edo ya anya. Tụọ aka n’ebe e dere “aha gị” n’aka okpotokpo ma cherezie ka ọ gwa gị aha ya. Gị na ya kwuo mgbe ọzọ ị ga-abịa na nke ya.
5. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị hụ onye na-asụ asụsụ ọzọ gosiri mmasị n’ozi ọma?
5 Ihe Anyị Ga-eme Mgbe Anyị Hụrụ Onye Nwere Mmasị: E kwesịrị ịgba mbọ gaghachi na nke ndị gosiri mmasị n’ozi Alaeze anyị, n’agbanyeghị asụsụ ha na-asụ. Ozugbo anyị chọpụtara na mmadụ nwere mmasị na Chineke nakwa n’Okwu ya, anyị kwesịrị idejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ma hụ na anyị nyere ya odeakwụkwọ ọgbakọ n’egbughị oge. Ọ ga-ezigaziri ya alaka ụlọ ọrụ (ma ọ bụ ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-eji asụsụ ahụ amụ ihe ma ọ bụrụ na ọ maara ya) ka ha nwee ike ịgwa nwanna na-asụ asụsụ onye ahụ ka ọ gaa leta ya. Alaka ụlọ ọrụ ga-ezigakwara ọgbakọ na-asụ asụsụ ahụ fọm ahụ. A nata ya, a ga-aga na nke onye ahụ n’egbughị oge. Odeakwụkwọ ọgbakọ nwere ike inye onye nlekọta ije ozi otu fọm ahụ ka o nwee ike ịma asụsụ e nwere onye na-egosi mmasị na ya. Naanị mgbe a ga-edejupụta fọm a bụ mgbe a hụrụ onye nwere ezigbo mmasị.
6. Ọ bụrụ na anyị ahụ onye na-asụ asụsụ ọzọ gosiri mmasị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
6 O nwere ike iwetụ oge tupu onye nkwusa maara asụsụ onye ahụ agaa na nke onye ahụ nwere mmasị ma odeakwụkwọ zigachaa fọm S-43 ahụ. N’ihi ya, onye nkwusa ahụ dejupụtara fọm S-43 ka nwekwara ike na-aga na nke onye ahụ nwere mmasị iji hụ na mmasị ya anyụghị ọkụ ruo mgbe nwanna maara asụsụ ya bịara. N’ebe ụfọdụ, e nwere ike ịmalitere onye ahụ nwere mmasị ọmụmụ Baịbụl. Ma olee otú onye nkwusa ahụ ga-esi enweta akwụkwọ e dere n’asụsụ onye ahụ nwere mmasị tupu onye maara asụsụ ya abịa?
7. Olee ndokwa e mere maka inwetara ndị anyị hụrụ n’ozi ọma akwụkwọ anyị n’asụsụ ha?
7 Akwụkwọ Dị n’Asụsụ Ọzọ: Ọgbakọ ekwesịghị ibuju ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere n’asụsụ ọzọ. Ma, ọ bụrụ na onye nlekọta ije ozi achọpụta na e nweela ọtụtụ ndị na-asụ otu asụsụ ọzọ n’ókèala ha, bụ́ ndị na-egosi mmasị n’ozi anyị, o nwere ike ikwu ka a tụọ ọda akwụkwọ ole na ole n’asụsụ ahụ ma hụ na ọ na-adị mgbe niile ka ndị nkwusa nwee ike iji ya na-eje ozi. Ọ bụrụ na nke e nwere agwụ, a ga-atụ ọda ọzọ. O nwekwara ike iwetụ oge tupu akwụkwọ ndị a alọta. N’ihi ya, e meela ndokwa ka a na-esi n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org na-ebiri akwụkwọ anyị ụfọdụ. N’ebe ahụ, e nwere ọtụtụ akwụkwọ anyị ndị dị n’ọtụtụ narị asụsụ, nke onye nkwusa nwere ike ịchọta ma ọ bụ gwa onye ahụ nwere mmasị ka ọ gaa ebe ahụ gụọ ya. O doro anya na ndokwa a ga-aba uru mgbe anyị na-enyere ndị nwere mmasị na-asụ asụsụ ọzọ aka.
8. Olee otú ọgbakọ si ahụ na e nyeere ndị na-asụ asụsụ ọzọ nwere mmasị aka?
8 Ọrụ Dịịrị Ọgbakọ: N’ókèala ọgbakọ ebe a na-enwekwu ndị na-asụ asụsụ ọzọ, o nwere ike agaghị enwe ọgbakọ dị nso na-eji asụsụ ahụ amụ ihe. Mgbe ọ dị otú ahụ, ndị nkwusa kwesịrị ịgwa ndị nwere mmasị na-asụ asụsụ ọzọ ha hụrụ n’ozi ọma ka ha bịawa ọmụmụ ihe ha. Otú ụmụnna ga-esi nabata ha ma gosi ha na ha hụrụ ha n’anya nwere ike ịgba ha ume ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya. Ná mmalite, o nwere ike isitụrụ ha ike n’ihi na ha anaghị aghọta ihe a na-asụ ma ọ bụ n’ihi na otú e si eme ihe ụfọdụ dị iche; ma Ndịàmà Jehova n’ụwa niile anaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie ha igosi ụmụnna ha ezi ịhụnanya. (Zef. 3:9; Jọn 13:35) Ò nwere asụsụ ala ọzọ ị maara asụ nke ọma—asụsụ ndị dị ka, French, German, Arabic ma ọ bụkwanụ asụsụ ala ọzọ ọ bụla? Ọ bụrụ na e nwere, ya abụrụkwa na ị dị njikere ịga na nke onye nwere mmasị na-asụ asụsụ ahụ, biko gwa odeakwụkwọ ọgbakọ unu ka o nwee ike gwa alaka ụlọ ọrụ. Nke a ga-aba uru mgbe alaka ụlọ ọrụ ga-achọ onye nkwusa ga-aga na nke onye nwere mmasị.
9. Olee mgbe e nwere ike ịmalite klas a na-akụziri ndị nkwusa asụsụ ọzọ, oleekwa otú a ga-esi amalite ya?
9 Ịmụ Asụsụ Ọzọ: Mgbe ị na-enyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka, ọ kacha mma ịgba ha ume ka ha gawa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ a na-asụ asụsụ ha ma ọ bụrụ na e nwere nke dị ha nso. Ma ọ bụrụ na nke ahụ agaghị ekwe omume, ụfọdụ ndị nkwusa nwere ike ikpebi ịmụ asụsụ ahụ ka ha nwee ike inyere ndị ọhụrụ a nwere mmasị aka. Ma ọ bụrụ na enweghị ọgbakọ dị nso ji asụsụ ahụ amụ ihe, alaka ụlọ ọrụ nwere ike kpebie ka a malite klas a ga na-akụzi asụsụ ahụ, ebe ọ bụ na e nweela ọtụtụ ndị bịara abịa na-asụ ya. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, alaka ụlọ ọrụ nwere ike ime ka ọgbakọ ndị dị nso mara mkpa a e nwere, ha ga-ekwukwa ka a maa ọkwa na a ga-enwe klas a ga-akụzi asụsụ ahụ. Ndị ga-achọ iso na klas ahụ ga-eburu n’uche na ha ga-agafe n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ìgwè ahụ na-asụ asụsụ ọzọ iji nyere ndị ahụ nwere mmasị aka.
10. Olee mgbe e nwere ike iguzobe ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe, oleekwa ihe a ga-eji mara na ha ruru eru maka ya?
10 Iguzobe Ìgwè Ji Asụsụ Ọzọ Amụ Ihe: Ọ bụrụ na a chọrọ iguzobe ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe, e nwere ihe anọ dị mkpa a ga-emerịrị. (1) E kwesịrị inwe ọtụtụ ndị nwere mmasị, chọpụtakwa na e nwere ndị ọzọ na-asụ asụsụ ahụ nwere ike inwe mmasị n’ọdịnihu. (2) A ga-enwerịrị ndị nkwusa ụfọdụ ma asụsụ ahụ ma ọ bụ ndị na-amụ asụsụ ahụ. (3) E kwesịrị inwe otu okenye ma ọ bụ otu ohu na-eje ozi ruru eru idu ndú na iduzi ọmụmụ ihe ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu ugbo n’izu n’asụsụ ahụ. (4) E kwesịrị inwe òtù ndị okenye dị njikere ilekọta ìgwè ahụ. Mgbe e mezuru ihe ndị a niile ruo ókè o kwere mee, òtù ndị okenye ga-edegaziri alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ, kọwaara ha ihe niile banyere ìgwè ahụ, gwakwa ha na ọ bụ ọgbakọ ha na-elekọta ìgwè ahụ na-asụ asụsụ ọzọ. (Gụọ Ndị A Haziri, peeji nke 105 para. 4-106 para. 3.) Okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi nke na-elekọta ìgwè ahụ ga-abụ “onye nlekọta ìgwè” ma ọ bụ “ohu na-ahụ maka ìgwè.”
11. Gịnị mere ikwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ nọ n’ókèala ọgbakọ anyị ozi ọma ji bụrụ ihe ùgwù?
11 Ikwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ nọ n’ókèala ọgbakọ anyị ozi ọma so n’ọrụ dị oké mkpa a na-arụ n’ụwa niile, nke Jizọs Kraịst, bụ́ Onye anyị na-eso nzọụkwụ ya, bidoro. Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi mee òkè anyị n’ọrụ a ma hụ otú Jehova si na-eme ka mba niile maa jijiji ma na-akpọbata ndị niile bụ́ ihe a na-achọsi ike nke mba niile. (Hag. 2:7) Anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị na-akwado nnọọ ọrụ a! Ka Jehova gọzie mgbalị niile anyị na-eme iji hụ na anyị na-ekwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ nọ n’ókèala ọgbakọ anyị ozi ọma. Ka anyị chetakwa na n’agbanyeghị asụsụ a na-asụ n’ókèala anyị na-ezi ozi ọma, ọ bụ Chineke nwere ike ime ka o too!—1 Kọr. 3:6-9.