Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Na-anaghị Asụ Asụsụ Anyị Ozi Ọma
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Jehova chọrọ ka ndị si “mba ọ bụla” nụ ozi ọma Alaeze ya. (Ọrụ 10:34, 35) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo na a ga-ekwusa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Zekaraya bukwara amụma na “ndị si n’asụsụ niile nke mba dị iche iche” ga-aghọ ndị na-efe Jehova. (Zek. 8:23) N’ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ, e gosiri ya na ndị Chineke ga-echebe n’oké mkpagbu ‘ga-esi ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile.’ (Mkpu. 7:9, 13, 14) N’ihi ya, anyị gaa ozi ọma hụ ndị na-asụ asụsụ dị iche na nke anyị, anyị kwesịrị ịgba mbọ zie ha ozi ọma.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
N’Ofufe Ezinụlọ ọzọ unu ga-enwe, meenụ ihe ngosi otú e nwere ike isi zie onye na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma.