ISI NKE 9
Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
JIZỌS ji ozi ọma kpọrọ ihe. Ndị na-eso ụzọ ya kwesịkwara iji ozi ọma kpọrọ ihe. Ọ gara n’ụlọ ndị mmadụ zie ha ozi ọma ma kụziere ha ihe. Ọ kụzikwaara ndị mmadụ ihe n’ihu ọha. (Mat. 9:35; 13:36; Luk 8:1) Jizọs zikwara ndị mmadụ ozi ọma otu otu, kụziekwara ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe naanị ha na ya nọ. O nwekwara oge ọ kụziiri ọtụtụ puku mmadụ ihe otu mgbe. (Mak 4:10-13; 6:35-44; Jọn 3:2-21) O ji ohere ọ bụla dapụtaranụ gwa ndị mmadụ okwu gbara ha ume ma mee ka ha nwee olileanya. (Luk 4:16-19) O nwedịrị mgbe o ji oge ọ chọrọ iji zuru ike zie ndị mmadụ ozi ọma. (Mak 6:30-34; Jọn 4:4-34) Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe Baịbụl kwuru banyere otú Jizọs si kwusaa ozi ọma, ọ ga-eme ka anyị na-eme ka ya otú ahụ ndịozi ya mere.—Mat. 4:19, 20; Luk 5:27, 28; Jọn 1:43-45.
2 Ugbu a, ka anyị leba anya n’ụzọ dị iche iche Ndị Kraịst nwere ike isi zie ndị mmadụ ozi ọma a Jizọs Kraịst malitere ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga.
IZI OZI ỌMA N’ỤLỌ N’ỤLỌ
3 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ma na izi ozi ọma Alaeze Chineke n’ụlọ n’ụlọ bara ezigbo uru. Anyị esila otú a kwusaa ozi ọma ọtụtụ ebe nke na ọ bụzi ihe e ji mara anyị. Ọ bakwara ezigbo uru n’ihi na anyị ejirila ya zie ọtụtụ nde mmadụ ozi ọma n’ime afọ ole na ole. (Mat. 11:19; 24:14) Ọ bụkwa otu ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya.—Mat. 22:34-40.
4 Ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụlọ n’ụlọ amaliteghị taa. Pọl onyeozi kwuru na ya kụziiri ndị mmadụ ihe n’ụlọ ha. Ọ gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs, sị: ‘Malite n’ụbọchị mbụ m batara n’ógbè Eshia, alaghị m azụ ịgwa unu nke ọ bụla n’ime ihe ndị bara uru ma ọ bụ izi unu ihe site n’ụlọ ruo n’ụlọ.’ Pọl si n’izi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ na n’ụzọ ndị ọzọ ‘gbasiere ma ndị Juu ma ndị Grik àmà ike banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.’ (Ọrụ 20:18, 20, 21) Ndị chịrị Rom n’oge ahụ na-eme ka ndị ha na-achị na-ekpere arụsị, ọtụtụ ndị ‘na-ekpekwara chi dị iche iche.’ Ọ bụ ihe mere e ji kwesị ime ngwa ngwa gwa ndị mmadụ n’oge ahụ ka ha chọọ “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya,” Onye ‘na-agwa ha na ha niile kwesịrị ichegharị.’—Ọrụ 17:22-31.
5 E kwesịdịrị ime ngwa ngwa ugbu a zie ndị mmadụ ozi ọma karịa otú e mere n’oge ndịozi. Oge Chineke ga-eji ebibi ụwa ọjọọ a adịla ezigbo nso. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O nweghị ụzọ ọzọ kacha mma anyị ga-esi zie ndị chọrọ ịnụ okwu Chineke ozi ọma ma ọ́ bụghị ịga n’ụlọ n’ụlọ. Izi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ bara uru taa otú ahụ ọ bara n’oge Jizọs na ndịozi ya.—Mak 13:10.
6 Ị̀ na-ezi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ otú i nwere ike? Ọ bụrụ otú ahụ, obi kwesịrị isi gị ike na ozi a ị na-eje na-atọ Jehova ụtọ. (Ezik. 9:11; Ọrụ 20:35) Izi ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ nwere ike ọ gaghị adịchara gị mfe. O nwere ike ịbụ na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụkwanụ na ọtụtụ ndị bi n’ókèala unu anaghị ege ntị n’ozi ọma. O nwedịrị ike ịbụ na gọọmenti obodo unu sịrị unu ekwusakwala ozi ọma. O nwekwara ike ịbụ na ị bụ onye ihere, ya ana-esiri gị ike ịgwa ndị ị na-amaghị okwu. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ị gara ozi ụlọ n’ụlọ, ụjọ ana-atụ gị. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, adala mbà. (Ọpụ. 4:10-12) Otú ọ dị gị ka ọ dị ọtụtụ ụmụnna gị nọ n’obodo dị iche iche.
7 Jizọs kwere anyị nkwa, sị: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) Nkwa a na-eme ka anyị na-akata obi ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ na-adị anyị otú ọ dị Pọl onyeozi, bụ́ onye sịrị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) Soro ọgbakọ unu na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na gị na ndị ọzọ ana-eso aga ozi ọma, ha ga-agba gị ume ma nyere gị aka. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imeri nsogbu ndị ị na-enwe, na-agbasikwa mbọ ike na-ekwusa ozi ọma.—1 Jọn 5:14.
8 Ọ bụrụ na ị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, ọ ga-eme ka ị na-akọrọ ha ‘ihe mere i ji nwee olileanya i nwere.’ (1 Pita 3:15) Ị ga-amatakwu ihe dị iche ná ndị na-atụ anya Alaeze Chineke na ndị na-anaghị atụ anya ya. (Aịza. 65:13, 14) Obi ga na-atọ gị ụtọ na ị na-eme ‘ka ìhè gị na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ’ otú Jizọs kwuru. Jehova nwekwara ike iji gị nyere ndị ọzọ aka ha amata ya ma mụta eziokwu ga-eme ka ha nwee ndụ ebighị ebi.—Mat. 5:16; Jọn 17:3; 1 Tim. 4:16.
9 Ọgbakọ dị iche iche na-aga ozi ụlọ n’ụlọ n’ime izu nakwa ná ngwụcha izu. N’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọcha n’ụlọ n’ụtụtụ ma ọ bụ n’ehihie, ọgbakọ ụfọdụ na-aga ozi ọma ná mgbede. Ndị mmadụ na-anabatakarị ndị ọbịa ná mgbede karịa n’ụtụtụ.
ỊCHỌPỤTA NDỊ KWESỊRỊ EKWESỊ
10 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘chọpụta’ ndị kwesịrị ekwesị. (Mat. 10:11) Ọ bụghị naanị n’ụlọ n’ụlọ ka o ziri ndị mmadụ ozi ọma. O ziri ndị mmadụ ozi ọma ma mgbe ọ nọ n’ozi ma mgbe ọ na-anọghị n’ozi. (Luk 8:1; Jọn 4:7-15) Ndịozi Jizọs zikwara ndị mmadụ ozi ọma n’ebe dị iche iche.—Ọrụ 17:17; 28:16, 23, 30, 31.
Anyị chọrọ izi onye ọ bụla ozi ọma Alaeze Chineke
11 Otú ahụ ka anyị na-emekwa taa. Anyị chọrọ izi onye ọ bụla ozi ọma Alaeze Chineke. Nke a pụtara na anyị ga na-ekwusa ozi ọma otú Jizọs na ndịozi ya si kwusaa ya, na-agbanwe otú anyị si ekwusa ya ma ihe gbanwee n’ụwa, na-agakwa n’oge anyị nwere ike ịhụ ndị mmadụ n’ụlọ zie ha ozi ọma. (1 Kọr. 7:31) Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa na-aga n’ebe ndị mmadụ na-azụ ahịa ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ha ezi ha ozi ọma. N’ọtụtụ mba, ụmụnna na-ezi ọtụtụ ndị ozi ọma n’okporo ámá, n’ogige ntụrụndụ, n’ebe a na-adọba ụgbọala, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ha hụrụ ndị mmadụ. Ọgbakọ ụfọdụ na-edowe tebụl ma ọ bụ ihe a na-akwagharị akwagharị n’ókèala ha ma dosa akwụkwọ anyị na ya. Ihe ọzọkwa bụ na n’ebe ndị mmadụ na-ekwo ekwo n’obodo dị iche iche, alaka ụlọ ọrụ na-ahazi ebe a na-edosa akwụkwọ anyị ka ụmụnna si n’ọgbakọ dị iche iche nọrọ ebe ndị ahụ na-enye ndị chọrọnụ akwụkwọ anyị. Anyị na-esi otú a ezi ụfọdụ ndị anyị na-anaghị ahụ n’ụlọ ozi ọma.
12 Ọ bụrụ na anyị ezie ndị nwere mmasị ịmụ Baịbụl ozi ọma n’ebe ohaneze na-anọkarị, anyị nwere ike inye ha akwụkwọ ga-enyere ha aka ịghọtakwu Baịbụl. Iji mee ka onye ahụ nwekwuo mmasị, i nwere ike ịgwa ya ebe i bi na nọmba ekwentị gị ma hazie otú ị ga-esi gaara ya nletaghachi. I nwekwara ike ịgwa ya ka ọ gaa na jw.org ma ọ bụ gị agwa ya ebe ọgbakọ kacha dịrị ya nso na-anọ amụ ihe. I soro na-ezi ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọkarị, ị ga-achọpụta na ọ bụ ụzọ magburu onwe ya anyị nwere ike isi zikwuo ndị mmadụ ozi ọma.
13 Ma, ọ bụghị naanị izi ndị mmadụ ozi ọma ka a gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme taa. Ọ bụrụ na ị chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha mụta eziokwu ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi, ị ga na-aga n’ụlọ ha akụziri ha ihe ka ha nwee ike ịbata n’ọgbakọ, okwukwe ha abụrụkwa a kwaa a kwụrụ.
IME NLETAGHACHI
14 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Unu ga-abụ ndị àmà m ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Ọrụ 1:8) Ihe ọzọ ọ gwara ha bụ: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:19, 20) Obi na-atọ ma anyị ma ndị anyị ziri ozi ọma ụtọ ma anyị gaghachi na nke ha kụzikwuoro ha ihe. Ịga n’ụlọ ha kụzikwuoro ha Baịbụl nwere ike ime ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha ghọta na ha kwesịrị ife Chineke. (Mat. 5:3) Ọ bụrụ na ị kwadebe nke ọma ma gaa n’oge gị na ha kwuru ị ga-eji bịa, i nwere ike ịmalite ịmụrụ ha Baịbụl. Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi agaghachi na nke ndị mmadụ bụ ka anyị mụwara ha Baịbụl. Ihe anyị na-eme abụghị naanị ịkụ mkpụrụ nke eziokwu, kama, anyị na-agbakwa ya mmiri.—1 Kọr. 3:6.
15 Ọ naghị adịrị ụfọdụ ndị mfe ime nletaghachi. O nwere ike ịbụ na ị mụtala nnọọ otú e si eji nkeji ole na ole zie mmadụ ozi ọma, ya ana-atọkwa gị ụtọ. Ma, i cheta ịgaghachi na nke onye i ziri ozi ọma, obi awụnye gị n’afọ. Ịkwadebe nke ọma ga-eme ka ị katakwuo obi. Gbalịa na-eme ihe ndị a na-atụrụ anyị arọ ga-eme ka ozi anyị ka mma n’ọmụmụ ihe etiti izu mgbe ị gaghachiri na nke onye i ziri ozi oma. I nwekwara ike ịgwa nwanna ma nke a na-akọ ka o soro gị gaa.
ỊMỤRỤ NDỊ MMADỤ BAỊBỤL
16 E nwere otu ụbọchị otu nwoke na-eso ụzọ ndị Juu nọ na-agụ Okwu Chineke, Filip ahụ ya ma jụọ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Nwoke ahụ azaa ya, sị: “N’ezie, olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?” Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi isi asatọ gwara anyị na Filip ji amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị nwoke ahụ na-agụ “zisaara ya ozi ọma banyere Jizọs.” (Ọrụ 8:26-36) Anyị amaghị awa ole Filip ji zie nwoke ahụ ozi ọma. Ihe anyị ma bụ na Filip ziri ya ozi ọma nke ọma nke na nwoke ahụ ghọrọ onye kwere ekwe, gwakwa Filip ka o mee ya baptizim. Mgbe e mechara ya baptizim, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.
17 N’oge anyị a, ọtụtụ ndị amachaghị Baịbụl. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịga ọtụtụ ugboro kụziere ha ya. Ma, o nwere ike iwe ọtụtụ izu, ọtụtụ ọnwa, otu afọ ma ọ bụ karịa tupu okwukwe ha esie ike, ha eruokwa eruo ime baptizim. Ọ bụrụ na i nwee ndidi ma jiri obiọma na-enyere ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ ga-abara gị ezigbo uru. Jizọs kwuru uru ọ ga-abara gị. Ọ sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
18 O doro anya na ị ga-achọ iji otu n’ime akwụkwọ anyị ndị e ji amụrụ mmadụ Baịbụl mụwara mmadụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị ahụ a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe etiti izu, gị na ndị bụ́ aka ochie n’izi ihe ana-arụkwa n’ozi ọma, ị ga-enwe ike ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl nke ọma ma nyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.
19 Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl, gwa otu n’ime ndị okenye unu ma ọ bụ nwanna bụ́ aka ochie n’ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl ka o nyere gị aka. Ihe ndị e kwuru n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ na ihe ngosi ndị a na-eme n’ọmụmụ ihe ga-enyekwara gị aka. Tụkwasị Jehova obi ma gwa ya ka o nyere gị aka. (1 Jọn 3:22) Gbalịsie ike ka i nwee onye ị ga na-amụrụ Baịbụl gụnyere nke ị na-amụrụ ndị ezinụlọ gị. Ọ bụrụ na i nwee ndị ị na-amụrụ Baịbụl, ozi ọma ga na-atọkwu gị ụtọ.
ỊGWA NDỊ NWERE MMASỊ KA HA NA-ABỊA ỌMỤMỤ IHE
20 Ọ bụrụ na anyị enyere ndị mmadụ aka, ha amụta banyere Jehova Chineke ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, ha na-aghọ ụmụnna anyị. Ọ bụrụkwa na ndị anyị na-amụrụ ihe amata nke bụ́ nzukọ Jehova ma na-eme ihe nzukọ a na-agwa ha, ha ga na-eme nke ọma n’ọgbakọ, ụkwụ ga-esikwa ha ike na ya. Anyị kwesịrị ịkụziri ha otú ha ga-esi mata nzukọ Jehova na otú ha ga-esi na-eso ya ụkwụ na ụkwụ. E wepụtara vidio anyị ụfọdụ na broshọ anyị bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? ka anyị jiri ha na-agwa ha banyere nzukọ Jehova. Ihe ụfọdụ e kwuru n’isi nke anọ n’akwụkwọ a nwekwara ike inyere ha aka.
21 Gị na mmadụ malitehaala ịmụ Baịbụl, kọọrọ ya gbasara nzukọ Jehova nakwa na Jehova ji nzukọ a eme ka a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile taa. Kọwaara ya uru akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl bara nakwa otú e si ebipụta ha ma na-ekesara ha ọhaneze. Gwa ya na a naghị akwụ ndị na-arụ ihe ndị a ụgwọ, kama, ha wepụtara onwe ha ijere Chineke ozi. Gwakwa ya ka o soro gị gaa ọmụmụ ihe anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bịa, mee ka ya na ụmụnna ndị ọzọ mata, kọwakwaara ya otú anyị si amụ ihe. O soro gị gaa mgbakọ sekit ma ọ bụ mgbakọ ukwu, mee ka ya na ụfọdụ ụmụnna anyị matakwa. Ná nnọkọ ọ bụla anyị na-enwe, mee ka ọ hụ otú Ndịàmà Jehova si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya, nke bụ́ ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Ọ bụrụ na ihe a na-eme ná nzukọ Jehova ana-edokwu ya anya, ọ ga-eme ka ọ bịarukwuo Jehova nso.
IJI AKWỤKWỌ ANYỊ EZI OZI ỌMA
22 Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst ji Okwu Chineke kụziere ndị mmadụ ihe. Ha depụtara nke ha ga-agụ n’ụlọ na nke ha ga-eji na-amụ ihe n’ọgbakọ. Ha gbara ndị mmadụ ume ka ha na-agụ Okwu Chineke. Ndị nke ha ji aka ha depụta dị ole na ole, ma ha ji ha kpọrọ ihe. (Kọl. 4:16; 2 Tim. 2:15; 3:14-17; 4:13; 1 Pita 1:1) Taa, Ndịàmà Jehova na-eji ígwè ndị bụ́ ọkpọka ebipụta ọtụtụ narị nde Baịbụl na ihe ndị e ji amụ Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha bụ traktị, broshọ, akwụkwọ, na Ụlọ Nche na Teta! A na-ebipụtakwa ha n’ọtụtụ narị asụsụ.
23 Ka ị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, gbalịa na-enye ha akwụkwọ ndị nzukọ Jehova bipụtara e ji amụ Baịbụl. I cheta uru akwụkwọ anyị ndị ị gụrụla baara gị, ọ ga-eme ka ị na-enye ya ndị ọzọ.—Hib. 13:15, 16.
24 Ọtụtụ ndị taa na-aga n’Ịntanet ma ha chọọ ịmata ihe ụfọdụ. E wezụga inye ndị mmadụ akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl, anyị na-ejikwa jw.org ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’ebe dị iche iche n’ụwa taa, ndị mmadụ nwere ike iji kọmputa ha gụọ Baịbụl na akwụkwọ anyị dị iche iche ma ọ bụ gere ha n’ọtụtụ narị asụsụ. Ụfọdụ ndị na-anaghị achọ ige anyị ntị ma ọ bụ ndị bi n’ebe Ndịàmà Jehova na-anọchaghị anọrọla n’ụlọ ha gaa na jw.org gụọ ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi.
25 Ọ bụ ya mere anyị ji na-agwa ndị mmadụ mgbe ọ bụla ka ha na-aga na jw.org. Ọ bụrụ na onye anyị na-ezi ozi ọma ajụọ anyị ajụjụ gbasara ihe anyị na-akụzi, anyị nwere ike iji ekwentị na ihe ndị yiri ya ma ọ bụ kọmputa gaa na jw.org gosi onye ahụ azịza ya ozugbo. Anyị hụ onye na-asụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ onye ogbi, anyị nwere ike ịgwa ya ka ọ gaa na jw.org gụọ Baịbụl na akwụkwọ anyị ndị dị n’asụsụ ya. Ọtụtụ ndị nkwusa ejirila otu n’ime vidio anyị dị na jw.org malite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl.
IZI MMADỤ OZI ỌMA MGBE ANYỊ NA-ANỌGHỊ N’OZI
26 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Mat. 5:14-16) Ndị na-eso ụzọ ya ndị ahụ mere uche Chineke otú Jizọs mere. Jizọs kwuru na ya ‘bụ ìhè nke ụwa.’ Dị ka Jizọs, Ndị Kraịst kwesịrị ime ka ‘ìhè nke ndụ’ na-enwu n’ihi na ọ ga-abara ndị na-ege ha ntị uru.—Jọn 8:12.
27 Pọl onyeozi bụ onye ọzọ anyị kwesịrị ịmụta ihe n’aka ya. (1 Kọr. 4:16; 11:1) Mgbe ọ nọ n’Atens, ọ na-ezi ndị nọ n’ọma ahịa ozi ọma kwa ụbọchị. (Ọrụ 17:17) Ndị Kraịst nọ na Filipaị mekwara ka Pọl. Ọ bụ ya mere Pọl ji degara ha akwụkwọ ozi ma gwa ha na ha bi ‘n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, nke hịgọkwara ahịgọ, bụ́ ndị ha na-enwu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.’ (Fil. 2:15) Anyị nwekwara ike ime ka ìhè nke eziokwu Alaeze na-enwu. Otú anyị nwere ike isi na-eme ya bụ izi ndị mmadụ ozi ọma n’oge ọ bụla dapụtaranụ na ịkpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst mgbe niile. Nke bụ́ eziokwu bụ na àgwà ọma anyị na-eme ka ndị mmadụ mara na anyị dị iche. Ma ọ bụrụ na anyị ezie ha ozi ọma, ha ga-amata ihe mere anyị ji dị iche.
28 Ọtụtụ ndị Jehova na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ha na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụgbọala ọhaneze ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ha gara. Mgbe anyị na-eme njem, anyị nwere ike izi ndị anyị na ha so na-eme njem ozi ọma. Anyị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, anyị kwesịrị ịgba mbọ mee ka anyị si n’ihe ahụ anyị na ha na-ekwu zie ha ozi ọma. Anyị niile kwesịrị iji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ndị mmadụ ozi ọma.
29 Ọ bụrụ na anyị eburu n’uche na ozi ọma anyị na-ezi na-eme ka a na-eto Onye kere anyị, na-emekwa ka a na-asọpụrụ aha ya, ọ ga-eme ka anyị jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ezi ozi ọma. Ime otú ahụ nwere ike ime ka anyị nyere ndị chọrọ ife Jehova aka ka ha mụta banyere ya ma soro anyị na-efe ya ma na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ihi okwukwe ha nwere na Jizọs Kraịst. Iji ohere ọ bụla dapụtaranụ ezi ndị mmadụ ozi ọma so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova, ọ na-atọkwa ya ụtọ.—Hib. 12:28; Mkpu. 7:9, 10.
ÓKÈALA
30 Jehova chọrọ ka e kwusaa ozi ọma n’ụwa niile, ma n’obodo mepere emepe ma n’ime ime obodo. Ọ bụ ya mere alaka ụlọ ọrụ ji ekenye ọgbakọ dị iche iche ókèala, na-ekenyekwa ndị na-eje ozi n’ebe ọgbakọ na-adịghị ókèala. (1 Kọr. 14:40) Ọ bụkwa ihe e mere n’oge ndịozi n’ihi na ọ bụ ihe Chineke kwuru ka e mee. (2 Kọr. 10:13; Gal. 2:9) Ebe ọ bụ na a na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke n’ọtụtụ ebe n’oge ikpeazụ a, ọgbakọ ịhazi otú ha ga-esi na-arụ ókèala ha nke ọma ga-eme ka ozi ọma na-aga aga.
31 Ọ bụ onye nlekọta ije ozi na-ahazi otú a ga-esi na-eje ozi n’ókèala ọgbakọ. E nwere ike ịgwa otu ohu na-eje ozi ka ọ na-ekenye ụmụnna ókèala. E nwere ụdị ókèala abụọ. Nke mbụ bụ nke a na-ekenye ìgwè dị iche iche. Nke abụọ abụrụ nke e nwere ike ikenye ụmụnna otu otu. Ọ bụrụ na ókèala ọgbakọ ebughị ibu, a ga-ekenye ndị nlekọta ìgwè dị iche iche ókèala ndị nkwusa nọ n’ìgwè ha ga na-eje ozi ọma. Ma, e nwee ókèala buru ibu, e nwere ike ikenye onye nkwusa ọ bụla chọrọnụ ókèala nke ya.
32 Ọ bụrụ na onye nkwusa enwee ókèala nke ya, ọ ga-eme ka o nwee ebe ọ ga-aga kwusaa ozi ọma mgbe a na-agaghị enwe nzukọ ozi ubi ma ọ bụ mgbe ọ na-agaghị agali ozi ọma n’ebe ndị ọzọ gara. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna na-enwe ókèala n’ebe dị nso n’ebe ha na-arụ ọrụ ma na-aga ozi ọma na ya ma ha kwụsịtụ ọrụ n’ehihie ma ọ bụ ma ha gbasaa ọrụ. Ezinụlọ ụfọdụ na-enwe ókèala nke ha n’ebe ha bi ma na-aga ekwusa ozi ọma na ya ná mgbede. Ọ bụrụ na onye nkwusa enwee ókèala nke ya n’ebe ga-adịrị ya mfe ịga zie ozi ọma, ọ ga-eme ka ọ ghara igbu oge tupu ya amalite ozi ọma. O nwekwara ike ịkpọrọ ndị nkwusa ndị ọzọ gaa n’ókèala e kenyere ya mgbe e nwechara nzukọ ozi ubi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka e kenye gị ókèala nke gị, i nwere ike ịgwa nwanna na-elekọta ókèala ọgbakọ unu ka o kenye nke gị.
33 E kenye ìgwè ozi ubi ókèala ha ga na-arụ, onye nlekọta ìgwè ozi ubi ahụ ga-ahụ na a rụrụ ya nke ọma. E kenyekwa onye nkwusa ókèala ọ ga na-arụ, onye nkwusa a ga-agba mbọ zie ndị niile bi n’ókèala e kenyere ya ozi ọma. Otú ọ bụla a haziri isi na-arụ ókèala nke ọma kwesịrị ịdaba n’ihe iwu obodo unu kwuru gbasara ichekwa ihe mmadụ gwara gị banyere onwe ya, ma ọ bụrụ na unu nwere ụdị iwu ahụ. Onye nlekọta ìgwè kwesịrị ịhụ na a rụchara ókèala e kenyere ìgwè ya n’ime ọnwa anọ. Onye nkwusa e kenyere ókèala kwesịkwara ime otú ahụ. A rụchaa ya, e kwesịrị ịgwa nwanna na-ahụ maka ókèala. Mgbe ụfọdụ, onye nlekọta ìgwè nwere ike kpebie ka ìgwè ya rụghachi ókèala ahụ ma ọ bụ gwa nwanna na-ahụ maka ókèala ka o nye ha ọzọ. Onye nkwusa e kenyere ókèala nwekwara ike ime otú ahụ.
34 Ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ana-arụ ókèala ha otú e si hazie ka a na-arụ ya, ọ ga-eme ka ha na-arụzu ya. Ọ ga-emekwa ka ọ ghara ịbụ otu ndị zichaa ozi ọma pụọ, ndị ọzọ agaakwa otu ebe ahụ izi ozi ọma n’ihi na o nwere ike iwe ndị nwe ụlọ iwe. Anyị ga-esi otú a gosi na anyị na-echebara ma ụmụnna anyị ma ndị anyị na-ezi ozi ọma echiche.
IZI NDỊ NA-ASỤ ASỤSỤ ỌZỌ OZI ỌMA
35 E kwesịrị ịkụziri mmadụ niile gbasara Jehova Chineke, Ọkpara ya, na Alaeze ya. (Mkpu. 14:6, 7) Anyị chọrọ inyere mmadụ niile aka, n’agbanyeghị asụsụ ha na-asụ, ka ha na-akpọku aha Jehova ka e nwee ike ịzọpụta ha nakwa ka ha nwee ike ịna-akpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst. (Rom 10:12, 13; Kọl. 3:10, 11) Olee nsogbu ụfọdụ a na-enwe izi ozi ọma n’ebe ndị na-asụ asụsụ dị iche iche bi? Olee ihe anyị nwere ike ime iji zie ọtụtụ n’ime ha ozi ọma Alaeze Chineke n’asụsụ ha?—Rom 10:14.
36 A na-ekenye ọgbakọ ókèala ebe ndị na-asụ asụsụ ha na-eji amụ ihe bi. Mana n’ókèala ebe ndị na-asụ asụsụ dị iche iche bi na ya, ọgbakọ dị iche iche na-anaghị eji otu asụsụ amụ ihe nwere ike ịna-aga ozi ọma ebe ahụ. N’ebe ndị ọ dị otú a, ọ kacha mma ka ndị nkwusa nke ọgbakọ ọ bụla na-ezi ndị na-asụ asụsụ ha na-eji amụ ihe ozi ọma. Ha ga-emekwa otu ihe ahụ mgbe ha na-ekesa akwụkwọ ndị anyị ji akpọ ndị mmadụ òkù. Ma, ọ bụrụ na ndị nkwusa na-ezi ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọkarị ma ọ bụ mgbe ha na-anọghị n’ozi, ha nwere ike izi onye ọ bụla ha hụrụ ozi ọma, nyekwa ya akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ na-abụghị nke ọgbakọ ya ji amụ ihe.
37 Mgbe ụfọdụ, ọgbakọ ndị ọzọ na-asụ asụsụ ọzọ anaghị enwe ike ịrụzu ókèala ha dị n’ebe dị anya. Ụdị ihe a mee, ndị nlekọta ije ozi ọgbakọ ndị okwu a gbasara kwesịrị ikwurịta otú ka mma ha ga-esi jee ozi nke ọma n’ókèala ahụ. Ọ ga-eme ka onye ọ bụla nwee ike ịnụ ozi ọma, meekwa ka ọ ghara ịbụ otu ndị zichaa ozi ọma pụọ, ndị ọzọ agaakwa otu ebe ahụ izi ozi ọma.—Ilu 15:22.
38 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na onye anyị bịara izi ozi ọma anaghị asụ asụsụ anyị? Anyị ekwesịghị ịhapụ ya, na-eche na Onyeàmà Jehova na-asụ asụsụ ya ga-abịa zie ya ozi ọma. Ọ na-abụ ụfọdụ ụmụnna chọpụta na e nwere ndị na-asụ asụsụ ọzọ n’ebe ha na-ekwusa ozi ọma, ha amụọ okwu ole na ole ha ga-eji zie ha ozi ọma n’asụsụ ahụ. Anyị nwere ike igosi mmadụ otú o nwere ike isi gụọ akwụkwọ anyị n’asụsụ ya na jw.org ma ọ bụ otú o nwere ike isi danloduo ya. Anyị nwekwara ike ịgwa ya na anyị ga-ewetara ya akwụkwọ anyị n’asụsụ ya.
39 Ọ bụrụ na onye ahụ nwere ezigbo mmasị, anyị kwesịrị ịgba mbọ chọta onye ruru eru ma asụsụ ya ga-amụrụ ya ihe. Anyị nwekwara ike ịgwa ya ebe dị nso ọ ga na-aga ọmụmụ ihe n’asụsụ ya. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ka onye ma asụsụ ya na-abịa amụrụ ya ihe, anyị nwere ike igosi ya otú ọ ga-esi dejupụta adres ya na jw.org. Alaka ụlọ ọrụ nweta ya, ha ga-agba mbọ chọta onye nkwusa, ìgwè, ma ọ bụ ọgbakọ nọ nso ga-enyekwuru onye ahụ aka.
40 Anyị kwesịrị ịna-aga na nke onye ahụ ka anyị na ya na-amụ ihe ruo mgbe ọ gwara anyị na e nweela nwanna na-asụ asụsụ ya na-abịa amụrụ ya ihe. Mgbe ụfọdụ, alaka ụlọ ọrụ ga-agwa ndị okenye ọgbakọ nọ nso n’ebe onye ahụ bi na e nweghị onye ha hụrụ na-asụ asụsụ onye ahụ. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, anyị kwesịrị ịgbalị na-aga na nke onye ahụ enyere ya aka ka mmasị ahụ o nwere ghara ịnyụ ka ọkụ. Ọ bụrụ na o kwere omume, anyị nwere ike iji akwụkwọ anyị e dere n’asụsụ ya na-amụrụ ya Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị egosi ya foto ndị dị n’akwụkwọ ahụ ma gwa ya gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị na ya, ọ ga-aghọta ihe ụfọdụ Baịbụl na-akụzi. Ọ bụrụkwa na e nwere onye ezinụlọ ya ma asụsụ ya nakwa asụsụ anyị, o nwere ike iji asụsụ ya na-akọwara ya ihe anyị na ya na-amụ.
41 Ka onye ahụ anyị na-amụrụ ihe nwee ike ịbata n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịgwa ya ka ọ bịawa ọmụmụ ihe, ọ bụrụgodị na o nwere ike ọ gaghị aghọtacha ihe niile a ga-amụ. A kpọọ ebe a ga-agụ na Baịbụl, ya abụrụkwa na o ji Baịbụl e dere n’asụsụ ya, anyị kwesịrị inyere ya aka sapeta ebe ahụ na Baịbụl ya. Ọ bụ eziokwu na ọ gaghị aghọtacha ihe a na-amụ, ya na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akparịta, ọ ga-agba ya ume, nyekwara ya aka inwe ọganihu n’ọgbakọ.
42 Ndị na-abụbeghị ìgwè: Ndị a bụ ndị nkwusa ụfọdụ na-eji asụsụ ọzọ na-abụghị asụsụ ọgbakọ ha na-eji amụ ihe, ezi ozi ọma, ọ bụ eziokwu na e nwebeghị okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi nwere ike iduzi ọmụmụ ihe kwa izu n’asụsụ ahụ. Alaka ụlọ ọrụ nwere ike ikwe ka e nwee ndị na-abụbeghị ìgwè n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na:
(1) Ọtụtụ ndị bi n’ebe ọgbakọ ahụ na-ezi ozi ọma na-asụ asụsụ na-abụghị asụsụ ọgbakọ ahụ ji amụ ihe.
(2) E nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ, ndị nkwusa ole na ole ma asụsụ ahụ ma ọ bụ ndị dị njikere ịmụ ya.
(3) Ndị okenye dị njikere ịhazi otú a ga-esi na-ezi ozi ọma n’asụsụ ahụ.
Ọ bụrụ na ndị okenye chọrọ ka e nwee ndị na-abụbeghị ìgwè n’ọgbakọ ha, ha ga-eme ka onye nlekọta sekit mara gbasara ya. O nwere ike ịbụ na ọ ma ọgbakọ ndị ọzọ na-agbalị ezi ndị na-asụ asụsụ ahụ ozi ọma. O nwekwara ike ikwu ihe ndị bara uru ga-enye aka ikpebi ọgbakọ nke ndị a na-abụbeghị ìgwè ga-anọ na ya na-amụ ihe. Ozugbo e kpebiri ọgbakọ nke ọ ga-abụ, ndị okenye ha ga-edegara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ma kwuo ka e kwe ka ndị ahụ na-abụbeghị ìgwè nọrọ n’ọgbakọ ha.
43 Ìgwè: Alaka ụlọ ọrụ nwere ike ikwe ka ọgbakọ hiwe ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe ma ọ bụrụ na:
(1) E nweela ndị na-asụ asụsụ ahụ nwere mmasị ịmụta eziokwu, e nwekwara ike inwe ndị ọzọ ga-enwe mmasị n’ọdịnihu.
(2) E nwere ndị nkwusa ole na ole ma asụsụ ahụ ma ọ bụ na-amụ ya.
(3) E nwere okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ga na-eji asụsụ ahụ eduzi, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla, dị ka okwu ihu ọha ma ọ bụ Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.
Ọ bụrụ na e nwezuo ihe ndị a, ndị okenye ga-edegara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ma kọọrọ ha ihe niile banyere ìgwè ahụ, kwuokwa ka e kwe ka ìgwè ahụ ga-eji asụsụ ọzọ amụ ihe dịrị n’aha ọgbakọ ha. Ọ bụrụ okenye ga na-edu ìgwè ahụ, ọ ga-abụ “onye nlekọta” ya. Ma ọ bụrụ ohu na-eje ozi, ọ ga-abụ “ohu na-ahụ maka ìgwè” ahụ.
44 E nwehaala ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe n’ọgbakọ, ndị okenye ga-ekpebi ma ìgwè ahụ hà kwesịrị ịna-enwe ọmụmụ ihe ndị ọzọ, kpebiekwa ugboro ole ha kwesịrị ịna-amụ ha n’ọnwa. E nwekwara ike ịhazi ka ìgwè a na-enwe nzukọ ozi ubi nke ha. Ọ bụ ndị okenye ìgwè ahụ dị n’aha ọgbakọ ha ga na-elekọta ya. Ndị okenye ahụ ga na-enye ha ntụziaka ga-abara ha uru ma na-eme ihe ndị ọzọ iji nyere ha aka. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit eleta ọgbakọ ìgwè ahụ dị n’aha ya ma soro ìgwè ahụ gaa ozi ọma, ọ ga-akọtụrụ alaka ụlọ ọrụ otú ìgwè ahụ si na-eme, kọọkwara ha mkpa ọ bụla ha nwere. Ìgwè ahụ nwere ike imecha ghọọ ọgbakọ. Ọ bụrụ na ndi niile nọ n’ọgbakọ nakwa n’ìgwè ahụ ana-eme ihe nzukọ Jehova gwara ha, ọ ga-eme ka obi na-atọ Jehova ụtọ.—1 Kọr. 1:10; 3:5, 6.
OZI ÌGWÈ
45 Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-ezi ndị ọzọ ozi ọma. E nwere ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi na-eme ya. Ma, ọtụtụ n’ime anyị na-achọ ka anyị na ndị ọzọ soro gaa ozi ọma. (Luk 10:1) Ọ bụ ya mere ọgbakọ ji enwe nzukọ ozi ubi ma n’ime izu ma ná ngwụcha izu. Ọgbakọ na-ejekwa ozi ọma n’oge ezumike ndị ụwa n’ihi na ọtụtụ ụmụnna anyị anaghị aga ọrụ n’oge ahụ. Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-ahụ na e nwere nzukọ ozi ubi n’ebe nakwa n’oge ga-akara ụmụnna mma, ma ọ̀ bụ n’ụtụtụ ma ọ bụkwanụ ná mgbede.
46 Ozi ìgwè na-eme ka ndị nkwusa na ibe ha na-ejekọ ozi ọma. Ọ na-emekwa ka ha ‘na-agbarịta ibe ha ume.’ (Rom 1:12) Ndị nkwusa ọhụrụ na ndị bụ́ aka ochie nwere ike ịrụkọ ka ha nwee ike inyere ha aka. N’ihi otú ihe ọjọọ si arị ibe ya elu n’ebe ụfọdụ, ọ kacha mma ka ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ rụkọọ n’ozi ọma. Ọ bụrụgodị na ị chọrọ ịrụ naanị gị n’ozi ọma, ọ dị mma ka i soro mgbe a na-enwe nzukọ ozi ubi n’ihi na a na-eji ya agba ndị niile ga-eje ozi ọma n’ụbọchị ahụ ume. Obi ga-esi gị ike n’ụbọchị ahụ ma ị hụ na e nwere ndị ọzọ nọ n’ozi ọma n’otu ebe ahụ. Ọ bụghị iwu na ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị nkwusa niile chọrọ ịga ozi ọma ga-anọ ya ná nzukọ ozi ubi niile ọgbakọ na-enwe, karịchaa, ma ọ bụrụ na a na-enwe ya kwa ụbọchị. Ma, ọ dị mma ka ha na-aga ụfọdụ n’ime nzukọ ozi ubi ọgbakọ na-enwe n’izu ọ bụla.
47 Ka anyị niile na-ekwusa ozi ọma otú Jizọs na ndịozi ya si kwusaa ya. Ka obi siekwa anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ niile anyị na-agba iji hụ na anyị kwusara ozi ọma Alaeze ya nke ọma.—Luk 9:57-62.