ISI NKE 4
Otú E Si Ahazi Ọgbakọ na Otú E Si Eduzi Ya
N’AKWỤKWỌ OZI mbụ Pọl onyeozi degaara ndị Kọrịnt, ọ gwara ha otu ihe dị mkpa banyere Chineke. O kwuru, sị: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama nke udo.” Ọ gwakwara ha gbasara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, sị: “Ka e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”—1 Kọr. 14:33, 40.
2 Ná mbido mbido akwụkwọ ozi ahụ, Pọl onyeozi gwara ọgbakọ Kọrịnt ihe ha ga-eme gbasara esemokwu ha nwere. Ọ gwara ha ka ha “na-ekwu otu ihe” nakwa ka ha “dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.” (1 Kọr. 1:10, 11) Ọ gwakwara ha ihe ha ga-eme banyere nsogbu ndị ọzọ mere ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ ha. Pọl ji ahụ́ mmadụ meere ha ihe atụ. Ọ gwara ha na ha kwesịrị ịdị n’otu ma na-emekọ ihe ọnụ otú akụkụ ahụ́ dị iche iche si eme. Ọ gwara Ndị Kraịst niile ka ha na-ahụ ibe ha n’anya ma na-enyere ibe ha aka n’agbanyeghị ọrụ onye ọ bụla n’ime ha na-arụ n’ọgbakọ. (1 Kọr. 12:12-26) Tupu Ndị Kraịst enwee ike ịrụkọ ọrụ ọnụ otú ahụ Pọl kwuru, a ga-ahazi ha ahazi.
3 Ma olee otú e kwesịrị isi ahazi ọgbakọ Ndị Kraịst? Ònye ga-ahazi ya? Olee otú ihe ga-esi na-aga na ya? Ole ndị ga na-edu ndú na ya? Baịbụl ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a nke ọma.—1 Kọr. 4:6.
A HAZIRI YA OTÚ CHINEKE CHỌRỌ
4 A malitere ọgbakọ Ndị Kraịst n’ụbọchị Pentikọst afọ 33. Olee otú e si hazie ọgbakọ a? A haziri ya ma duzie ya otú Chineke chọrọ. Ihe Baịbụl kọrọ merenụ na Jeruselem n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga gosiri n’eziokwu na ọ bụ Chineke malitere ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 2:1-47) Ọ bụ ụlọ Chineke wuru, bụrụkwa ezinụlọ ya. (1 Kọr. 3:9; Efe. 2:19) Otú e si ahazi ọgbakọ Ndị Kraịst taa na otú e si eduzi ya adịghị iche n’otú e si mee ya n’oge ndịozi.
Otú e si ahazi ọgbakọ Ndị Kraịst taa na otú e si eduzi ya adịghị iche n’otú e si mee ya n’oge ndịozi
5 N’ụbọchị a malitere ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi, ha dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ. Chineke wụkwasịrị ha niile mmụọ ya iji mezuo ihe e kwuru na Joel 2:28, 29. (Ọrụ 2:16-18) N’ụbọchị ahụkwa, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ baptizim, ha abata n’ọgbakọ. Ha nabatara ihe ndị a kụziiri ha banyere Kraịst, ‘nọrọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi.’ Ka oge na-aga, “Jehova nọkwa na-atụkwasịrị” ọgbakọ Ndị Kraịst “kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.”—Ọrụ 2:41, 42, 47.
6 Otú ọtụtụ ndị si bata n’ọgbakọ dị na Jeruselem mere ka nnukwu onye nchụàjà ndị Juu jiri iwe kwuo na ndị na-eso ụzọ Jizọs emeela ka ozizi ha jupụta Jeruselem. Ọtụtụ ndị nchụàjà ndị Juu so ná ndị ahụ batara ọhụrụ n’ọgbakọ.—Ọrụ 5:27, 28; 6:7.
7 Jizọs kwuru, sị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ihe a o kwuru mechara mee. Mgbe e gbuchara Stivin, a malitere ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Jeruselem, ọtụtụ n’ime ha agbaga Judia na Sameria. Ma ebe ọ bụla ha ruru, ha nọ na-ekwusa ozi ọma, ọtụtụ ndị ghọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ ndị Sameria sokwa na ha. (Ọrụ 8:1-13) E mechakwara zie ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu ozi ọma, ụfọdụ n’ime ha abatakwa n’ọgbakọ. (Ọrụ 10:1-48) Ozi ọma a ndị na-eso ụzọ Jizọs ziri n’ebe dị iche iche mere ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, meekwa ka e hiwe ọgbakọ n’obodo ndị ọzọ na-abụghị Jeruselem.—Ọrụ 11:19-21; 14:21-23.
8 Gịnị na gịnị ka e mere iji hazie ọgbakọ ọhụrụ ndị a ma na-eduzi ha otú Chineke chọrọ? Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka a họpụta ndị okenye ga na-elekọta ha. Pọl na Banabas họpụtara ndị okenye n’ọgbakọ dị iche iche ha letara mgbe ha na-eje ozi ala ọzọ nke mbụ ha. (Ọrụ 14:23) Luk kọrọ banyere nnọkọ Pọl na ndị okenye nọ n’ọgbakọ Efesọs nwere. Pọl gwara ha, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:17, 28) Ihe mere e ji họpụta ndị okenye ndị ahụ bụ na ha ruru ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru e ji ama ndị okenye. (1 Tim. 3:1-7) Pọl nyekwara Taịtọs ikike ka ọ họpụta ndị okenye n’ọgbakọ Krit.—Taị. 1:5.
9 Ka a na-ehiwe ọgbakọ ndị ọhụrụ, ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem nọgidere na-elekọta ọgbakọ niile. Ọ bụ ha bụ òtù na-achị isi e nwere n’oge ahụ.
10 N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ Efesọs, ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha ana-akpa àgwà e ji mara ndị mmụọ nsọ na-achị, ha ga-adị n’otu, na-emekwa ihe onyeisi ha bụ́ Jizọs Kraịst kwuru. Ọ gwakwara ha ka ha na-adị umeala n’obi, nọgide “n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ,” na-adị n’udo ma na-emekọ ihe ọnụ. (Efe. 4:1-6) O kwuziri ihe e dere n’Abụ Ọma 68:18 ma kọwaa na otú Jehova si na-eme ihe e dere ebe ahụ bụ na ọ na-ahọpụta ụmụnna nwoke ndị ruru eru ka ha bụrụ ndịozi, ma ọ bụ ndị amụma, ma ọ bụ ndị ozizi, ma ọ bụ ndị na-ekwusa ozi ọma, ma ọ bụkwanụ ndị ọzụzụ atụrụ. Ụmụnna ndị a bụ onyinye si n’aka Jehova. Ọ bụkwa ha ka Jehova ji mee ka okwukwe ụmụnna sie ezigbo ike n’oge ahụ, bụ́ nke tọrọ ya ụtọ.—Efe. 4:7-16.
OTÚ E SI HAZIE ỌGBAKỌ N’OGE NDỊOZI KA E SI HAZIE YA TAA
11 N’oge anyị a, a haziri ọgbakọ niile nke Ndịàmà Jehova otú e si hazie ya n’oge ndịozi. Ọ bụ ya mere Ndịàmà Jehova ji dịrị n’otu n’ụwa niile. Ọ bụkwa Ndị Kraịst e tere mmanụ ka e ji malite ya. (Zek. 8:23) Ma, onye na-eme ka ihe a niile nwee isi bụ Jizọs Kraịst. O kwuru na ya ga-anọnyere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” Ọ na-emekwa ihe a o kwuru. Ndị na-abata n’ọgbakọ a bụ ndị e ziri ozi ọma banyere Chineke, ha ejiri obi ha niile nyefee Jehova onwe ha, e mee ha baptizim, ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 28:19, 20; Mak 1:14; Ọrụ 2:41) Ha kwetara na Jizọs Kraịst, bụ́ “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” bụ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst a bụ ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ.” (Jọn 10:14, 16; Efe. 1:22, 23) Ha niile bụ “otu ìgwè atụrụ” ma dịrị n’otu. Ihe mere ha ji dịrị n’otu bụ na ha ji obi ha niile na-erubere Kraịst, bụ́ Onyeisi ha isi ma na-eme ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-agwa ha. Ka anyị jiri obi anyị niile na-atụkwasị ohu a Kraịst họpụtara obi.—Mat. 24:45.
URU ỤLỌ ỌRỤ DỊ ICHE ICHE NZUKỌ JEHOVA JI ARỤ ỌRỤ BARA
12 Nzukọ a enweela ụlọ ọrụ dị iche iche ha ji arụ ọrụ, bụ́ ndị na-enyere ha aka ịkụziri nzukọ Jehova ihe n’oge kwesịrị ekwesị nakwa ime ka e kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke tupu ọgwụgwụ ụwa a eruo. Ná mba ọ bụla e nwere ụlọ ọrụ ndị a, iwu mba ahụ kwadoro ha. Ụlọ ọrụ ndị a na-arụkọkwa ọrụ ọnụ. Ha na-enye aka eme ka ozi ọma anyị na-ezi n’ụwa niile na-aga n’ihu n’ihu.
OTÚ E SI AHAZI ALAKA ỤLỌ ỌRỤ
13 Mgbe ọ bụla e hiwere alaka ụlọ ọrụ, a na-ahọpụta Kọmitii Alaka ga na-ahazi ozi ọma n’obodo ahụ e nwere ya ma ọ bụ n’obodo ndị ọzọ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta. Ndị na-eso na kọmitii a na-abụ ndị okenye atọ ma ọ bụ karịa. Otu n’ime ha na-abụ onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ.
14 Alaka ụlọ ọrụ na-ahazi ọgbakọ ndị ha na-elekọta na sekit na sekit. Ihe na-ekpebi ọgbakọ ole ga-adị n’otu sekit bụ ebe ha dị, asụsụ ha ji amụ ihe nakwa ọgbakọ ole alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta. A na-ahọpụta onye nlekọta sekit ga na-aga eleta ọgbakọ ọ bụla dị na sekit ya. Alaka ụlọ ọrụ na-enye ndị nlekọta sekit ntụziaka gbasara otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ha.
15 Ọgbakọ niile na-eme ihe niile otú nzukọ a si hazie ya n’ihi na ọ na-abara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ uru. Obi dị ha ụtọ maka ndị okenye a na-ahọpụta ka ha na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụ sekit dị iche iche, ma ọ bụkwanụ ọgbakọ dị iche iche. Ọ bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-akụziri ọgbakọ niile Okwu Chineke n’oge kwesịrị ekwesị. Ndị so n’ohu ahụ taa na-erubere Kraịst isi mgbe niile, na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-ekwe ka mmụọ nsọ na-edu ha. Ọ bụrụ na anyị niile agbaa mbọ dịrị n’otu, ọ ga-abara anyị uru otú ahụ ọ baara Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Ọ ga-eme ka “ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe,” meekwa ka anyị ‘na-amụba n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.’—Ọrụ 16:5.