Ihe Ị Ga-eme Mgbe Onye Nwe Ụlọ Na-asụ Asụsụ Ọzọ
1. Olee ihe mere o ji dịkwuo mkpa ka a na-arụkọ ọrụ ọnụ mgbe a na-arụ ókèala?
1 Mgbe mgbe, ndị nkwusa Alaeze nọ n’akụkụ niile nke ụwa na-ahụ ndị nwere mmasị bụ́ ndị na-asụ asụsụ dị iche na nke ọgbakọ ha na-asụ. Iji nyere ndị dị otú ahụ aka n’ozi ha, ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ ahụla na ọ dị mkpa ihiwe ìgwè na ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ dị iche. Ebe ọ bụ na e nwere ike ịdị na-asụ ọtụtụ asụsụ n’otu ógbè, ọgbakọ dị iche iche ndị na-eji asụsụ dịgasị iche amụ ihe nwere ike ịdị na-ekwusa ozi ọma n’otu ókèala. Olee otú ọgbakọ ndị dị otú ahụ nwere ike isi rụkọọ ọrụ ọnụ iji hụ na a rụrụ ọrụ nkwusa ahụ n’usoro?—1 Kọr. 14:33.
2. Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, olee otú anyị na ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe nwere ike isi rụkọọ ọrụ ọnụ?
2 Ịrụkọ Ọrụ Ọnụ: Mgbe onye nkwusa na-agba àmà okporo ámá ma ọ bụ mgbe ọ na-agba àmà mgbe ọ na-anọghị n’ozi, o kwesịrị inwere onwe ya ịgwa onye ọ bụla ọ hụrụ okwu, bụ́ nke gụnyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ, nyekwa ha akwụkwọ n’asụsụ nke kaara ha mma. Ma, mgbe onye nkwusa na-arụ ókèala ndị ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe na-arụkwa, o kwesịrị ilekwasị anya ná ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ nke ya na-eji amụ ihe. Mgbe ọgbakọ dị iche iche na-ekwusa ozi ọma n’otu ógbè, ọ dị ezigbo mkpa ka ha na-enwe ezigbo ihe ndekọ. Ndị nlekọta ije ozi nke ọgbakọ ndị ahụ kwesịrị ịdị na-arụkọ ọrụ ọnụ ma na-ahazi ihe otú ọ na-adịghị ọgbakọ nke ga-eche na a na-emegbu ya emegbu. (Ilu 11:14) Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye nkwusa ezute onye na-asụ asụsụ ọzọ mgbe ọ nọ n’ozi ụlọ na ụlọ, ya abụrụkwa na e nweghị ọgbakọ dị nso na-asụ asụsụ onye ahụ, onye nkwusa ahụ kwesịrị ịgba mbọ ịgbara ya àmà ma nọgide na-enyere ya aka ịmụta eziokwu ahụ.
3. Olee ihe anyị kwesịrị ime mgbe anyị hụrụ ndị nkwusa nke ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ na-asụ asụsụ ọzọ ka ha na-ezi ozi ọma n’ókèala anyị gara izi ozi ọma na ya?
3 Otu Ọrụ Ahụ: Olee ihe e kwesịrị ime mgbe ndị nkwusa si n’ọgbakọ dị iche iche gara ozi ọma n’otu ógbè n’otu ụbọchị? N’ezie, ịhụnanya anyị nwere n’etiti onwe anyị dị ka Ndị Kraịst ga-ewepụ ọdịiche ọ bụla e nwere n’asụsụ, ihe mmadụ niile ga na-echekwa bụ otú a ga-esi gboo mkpa nke ndị bi n’ókèala ahụ. (Jọn 13:34, 35) N’ihi ya, ndị na-eduzi ozi ubi ga-eji nchebara echiche na ịhụnanya kpebie ma otu ọgbakọ hà ga-agatụgodị n’ókèala ọzọ.—Jems 3:17, 18.
4. Olee amụma na-emezu taa?
4 Baịbụl buru amụma na ndị si n’asụsụ dị iche iche ga-anụ ozi ọma ahụ. (Mkpu. 14:6, 7) Ọ bụrụ na ndị niile o metụtara arụkọọ ọrụ ọnụ, a ga-enwe ike izere ndị nkwusa abụọ ịgawara otu onye nletaghachi, a ga-ekwusakwara ọtụtụ ndị ọhụrụ ozi ọma, nke gụnyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ.—Efe. 4:16.