Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na June 30, 2008. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke May 5 ruo n’izu nke June 30, 2008.
NKÀ OKWU
1. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji hụ na a ghọtara ihe atụ anyị nke ọma? [be-IB p. 242 para. 3–p. 243 para. 1]
2. Gịnị mere ihe atụ ndị dị mfe nghọta, bụ́ ndị e nwetara site n’ọnọdụ ndị a ma ama, ji kasị aba uru? [be-IB p. 245 para. 2-4]
3. Olee otú iji ihe atụ ndị a na-ahụ anya eme ihe n’ụzọ dị irè dịruru ná mkpa, oleekwa otú Jehova si jiri ha kụzie ihe ndị dị mkpa? (Jen. 15:5; Jere. 18:6; Jona 4:10, 11) [be-IB p. 247 para. 1-2]
4. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ihe atụ ndị a na-ahụ anya mee ka ihe anyị na-akụzi dokwuo anya? [be-IB p. 248 para. 1-3]
5. Mgbe anyị na-akụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ihe, olee otú anyị nwere ike isi jiri map mee ka ha jiri anya nke uche ha hụ ihe anyị na-akụziri ha nke ọma? [be-IB p. 248 para. 4]
IHE OMUME NKE 1
6. Site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, gịnị ka ọmụmụ Baịbụl ga-enyere anyị aka ịghọta? [be-IB p. 32 para. 3-4]
7. Olee otú anyị nwere ike isi jiri Baịbụl n’onwe ya mee nnyocha iji mara ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ pụtara? [be-IB p. 34 para. 4–p. 35 para. 2]
8. Olee otú nchegbu Jizọs maka ndị mmadụ si pụta ìhè n’ọrụ ya dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma nke lekọtara ndị na-eso ụzọ ya yiri atụrụ? [w90 3/15-IB p. 25 para. 1]
9. Olee ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mere e ji kwuo na ọ bụ ọgwọ ọrịa bụ́ Luk dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi? [w90 5/15-IB p. 24 para. 3, 5]
10. Olee otú mmadụ nwere ike isi kwadebe ihe ndepụta ọ ga-eji kwuo okwu? [be-IB p. 39-41]
ỌGỤGỤ BAỊBỤL KWA IZU
11. Olee ụlọ nsọ nke “e ji afọ iri anọ na isii wuo”? (Jọn 2:20) [w08 4/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn”]
12. Olee ndị ‘si n’ọnwụ gafere ná ndụ’? (Jọn 5:24, 25) [w08 4/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn”]
13. Olee otú Jizọs ga-esi ‘kwadebere’ ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi ebe n’eluigwe? (Jọn 14:2) [w08 4/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn”]
14. Gịnị mere Jizọs ji gwa Meri Magdalin ka ọ kwụsị ịrapara ya n’ahụ́? (Jọn 20:17) [w08 4/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jọn”]
15. Gịnị ka Jizọs ịbịa “otú” o si rịgoro n’eluigwe pụtara? (Ọrụ 1:9-11) [gt isi 131 para. 8-9; lee it-1-E p. 186 para. 8]