Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/08 p. 2-3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 6/08 p. 2-3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na June: Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. July na August: E nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi Ị̀ Chọtawo Ya? September: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji malite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ anyị nyefere ha akwụkwọ a. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enweela akwụkwọ a enwee, mee ka ha hụ otú ha pụrụ isi rite uru na ya site n’igosi ha, n’ụzọ dị nkenke, otú e si eji ya amụ Baịbụl.

◼ Ebe ọ bụ na August nwere ngwụsị izu ise zuru ezu, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Onye onyeisi oche ndị nlekọta họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ nke ọnwa March, April, na nke May. Mgbe e nyochasịrị ya, e kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa na e nyochaala ya mgbe ọzọ a ga-agụrụ ọgbakọ akụkọ ndekọ ego.—Lee Instructions for Congregation Accounting (S-27).

◼ A na-atụ aro ka a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ fọm ndị chọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge niile dejupụtara, ọ dịkarịa ala iri ụbọchị atọ tupu ụbọchị ha chọrọ ịmalite eruo. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịtụleghachi fọm ndị ahụ iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ịhọrọ otu ụbọchị o nwere ike ịbụ ma detuo ya edetuo. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na kaadị Congregation’s Publisher Record (S-21).

◼ Kemgbe January 2008, anọọla na-etinye Ụlọ Nche na Teta! e nwere ike igere egere n’asụsụ Bekee na Spanish n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nke adres ya bụ www.pr418.com. Ọ kaara ụfọdụ ndị mma isi ebe ahụ na-ewere magazin ndị a ha ga-egere, bụ́ ndị na-apụta tupu ọgbakọ dị iche iche enweta ndị a na-akpọnye na MP3. Mgbe ọ bụla onye ọ bụla gara were magazin ahụ a na-egere egere, ego anyị na-akwụ na-amụba. Ma, isi otú a kesaa magazin ndị a a na-egere egere dị ọnụ ala karịa ịkpọnye ha na disc na ibugara ha mba ndị chọrọ ha. N’ihi ya, a na-agba ndị nkwusa niile na-enweta magazin ndị a na-egere egere site n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet ume ka ha gaa na nke onye na-ahụ maka magazin ma kagbuo ọda ha tụrụ maka ndị nke dị n’ụdị MP3. Anyị ga-eji nke nta nke nta tinye magazin ndị a na-egere egere n’asụsụ ndị ọzọ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nke adres ya bụ www.pr418.com.

◼ Biko, burunụ n’obi na a gaghị enwe akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche a ga-eji kpọọ ndị mmadụ òkù maka mgbakọ distrikti nke afọ 2008. Ma, anyị na-eme atụmatụ maka otu mkpọsa ga-akpụ ọkụ n’ọnụ a ga-eme n’ụwa niile n’oge na-adịghị anya. Anyị ga-akọkwuru unu maka ya ka oge na-aga.

◼ O nwere ike ịbụ na unu ahụla na n’Ebe Ndị A Ga-anọ Mee Mgbakọ Distrikti nke Afọ 2008/2009 bụ́ nke anyị bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke April 2008, mgbakọ distrikti ga-amalite n’Uyo n’October 3-5, malitekwa na Badagry n’October 10-12. Biko, maranụ na kama nke ahụ, mgbakọ distrikti ga-amalitezi ma na Badagry ma n’Uyo na September 26-28.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya