Unu Nwere Ike Ịga Chọọ Ha Tupu Unu Agaa Ozi Ọma
1. Olee ihe mere e ji enye ọgbakọ ọ bụla ókèala ebe ndị na-asụ asụsụ ha ji amụ ihe bi?
1 Mgbe a wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst n’afọ 33 O.A., ha ‘malitere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche.’ Ndị si ebe ndị dị anya bịa ememme ahụ na-anụkwa asụsụ ndị ahụ. (Ọrụ 2:4) Ihe ha nụrụ mere ka ha chegharịa, e meekwa ihe dị ka puku mmadụ atọ baptizim n’ụbọchị ahụ. Ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ bịara Jeruselem n’ụbọchị ahụ na-anụ Hibru ma ọ bụ Grik. Ma, Jehova chọrọ ka onye ọ bụla n’ime ha nụ ozi ọma Alaeze n’asụsụ ya. Ihe mere o ji chọọ ka ha nụ ozi ọma n’asụsụ ha bụ na ndị mmadụ na-egekarị ntị n’ozi ọma ma e zie ha ya n’asụsụ ha. Ọ bụ ya mere taa, a bịa n’obodo ọ bụla a na-asụ ọtụtụ asụsụ, a na-enye ọgbakọ ọ bụla dị ebe ahụ ókèala ebe ndị na-asụ asụsụ ha ji amụ ihe bi. (Gụọ akwụkwọ Ndị A Haziri p. 107, para. nke 2-3.) Ọ bụrụ na ọgbakọ nwere ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe, a naghị ekenye ìgwè ahụ ókèala ha ga na-ezi ozi ọma, kama ọ bụ n’ókèala ọgbakọ ha ma ọ bụ n’ókèala ọgbakọ ndị dị ha nso ka ha ga na-ekwusa ozi ọma. Ndị ha ga na-ezi ozi ọma bụ ndị na-asụ asụsụ ìgwè ha ji amụ ihe.
2. (a) Olee ndị anyị kwesịrị ịchọ? Oleekwa ebe ọ ga-abụ anyị biri anyị amara na anyị ga na-achọ ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ anyị ji amụ ihe? (b) Olee otú ọgbakọ ndị dị n’ebe e nwere ọtụtụ ọgbakọ ji asụsụ dị iche iche amụ ihe ga-esi na-enyerịtara ibe ha aka? (ch) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị hụ onye nwere mmasị n’ozi anyị nke na-asụ asụsụ na-abụghị nke ọgbakọ anyị ji amụ ihe?
2 Ọ bụrụ na i bi ebe mmadụ niile na-asụ otu asụsụ, izi ozi ọma ga na-adịrị gị mfe, ebe ọ bụ na i si n’otu ụlọ, gị abaa n’ọzọ. Ma, ịga ozi ọma agaghị adịrị gị mfe otú ahụ ma i biri n’obodo ndị bi ya na-asụ ọtụtụ asụsụ. Ókèala ọgbakọ ji asụsụ ọzọ amụ ihe nwere ike ịdị nke unu nso. Mgbe ụfọdụ, ndị si ọgbakọ ọzọ nwere ike ịgwa unu na ha hụrụ onye na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe. Ma, ọ bụ ọgbakọ unu ka ọ dịịrị ịchọta ndị na-asụ asụsụ unu ji amụ ihe ka unu nwee ike izi ha ozi ọma. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ́ “Na-enyerenụ Ibe Unu Aka.”) N’ihi ya, unu nwere ike ịchọ ndị nọ n’ókèala unu na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe. Olee otú unu ga-esi na-achọ ha?
3. Olee ihe ga-enyere ndị nkwusa aka ịma ebe ha ga-aga achọ ndị na-asụ asụsụ ha ji amụ ihe? Gịnịkwa ga-enyere ha aka ịma awa ole ha ga-eji na-achọ ha?
3 Otú A Ga-esi Hazie Ya: Ọ bụ otú ókèala ọgbakọ unu dị ka unu ga-eji ama awa ole unu ga-eji na-achọ ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe. Dị ka ihe atụ, mmadụ ole na-asụ asụsụ ahụ n’ókèala unu? Ndị nkwusa ole ka ọgbakọ unu nwere? Mmadụ ole ka ndị nkwusa ọgbakọ unu chọtarala? Otú ọgbakọ si achọ ndị mmadụ otu ebe nwere ike ịdị iche n’otú ha si achọ ha ebe ọzọ. Ha nwere ike ilekwasị anya karịchaa n’ebe ọtụtụ mmadụ bi nakwa n’ókèala ha ndị dịtụ anya. Ma, ihe dị mkpa bụ ka a hazie otú e si achọ ha nke ọma, ka e nwee ike inyere ọtụtụ ndị aka ịkpọku aha Jehova.—Rom 10:13, 14.
4. (a) Olee otú ndị okenye kwesịrị isi hazie ndị nkwusa ka ọ dịrị ha mfe ịchọ ndị na-asụ asụsụ ha ji amụ ihe? (b) Olee ihe ụfọdụ ga-enye aka ịchọta ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ ji amụ ihe?
4 Ndị okenye, nke ka nke onye nlekọta ije ozi, kwesịrị ịhazi ihe niile nke ọma ma hụ na ha na-aga otú ha kwesịrị. Nke a ga-eme ka ndị nkwusa ghara ịga ebe ibe ha garala. (1 Kọr. 9:26) Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere ìgwè ji asụsụ mba ọzọ amụ ihe, ndị okenye ọgbakọ unu kwesịrị ịhọpụta nwanna ga na-ahazi ya. Ma, ọ ga-akacha mma ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe, ndị okenye ọgbakọ unu nwere ike ịhazi ka ndị nkwusa niile nọ n’ọgbakọ unu soro ígwè ahụ gaa chọọ ndị bi n’ókèala unu na-asụ asụsụ ígwè ahụ ji amụ ihe.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ́ “Otú Unu Ga-esi Na-achọ Ndị Na-asụ Asụsụ Ọgbakọ Unu Ji Amụ Ihe.”
5. (a) Olee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ime mgbe anyị gara ịchọ ndị na-asụ asụsụ anyị ji amụ ihe n’ókèala anyị? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa ha ma anyị hụ ha?
5 Mgbe ọ bụla anyị gara ịchọ ndị mmadụ, anyị kwesịrị icheta ihe mere anyị ji achọ ha. Anyị kwesịrị iji ejiji otú ahụ anyị si eji ma anyị nọrọ ozi ọma n’ihi na ihe a gbasara ozi ọma anyị. Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtala na ịna-amụ otú ha ga-esi ezi mmadụ ozi ọma n’asụsụ ya na ịna-asụ asụsụ ahụ mgbe ha na-achọ ndị mmadụ, na-eme ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-achọ ndị mmadụ, asụsụ ahụ ana-agakwa ha were were n’ọnụ. Onye nkwusa ọ bụla nwere ike ịgụrụ awa o ji chọọ ndị mmadụ, ma, o nweghị onye kwesịrị ịgụrụ awa o ji see map ókèala. O nweghịkwa onye kwesịrị ịgụrụ awa o ji denye aha ndị ahụ n’akwụkwọ. Ọ bụrụ na mmadụ hụrụ onye na-asụ asụsụ ọgbakọ ha ji amụ ihe, o kwesịrị izi onye ahụ ozi ọma. Ya lọta, ya agwa onye nlekọta ije ozi ọgbakọ ya ma ọ bụ onye na-arụchitere ya ọrụ ka o denye aha onye ahụ n’akwụkwọ ahụ ọ na-edenye aha ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ ha ji amụ ihe. Otú a ka e kwesịrị ime ya ma onye ahụ ò nwere mmasị n’ozi anyị ma ọ̀ bụ na o nweghị. N’agbanyeghị na ịga n’ókèala anyị na-achọ ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ anyị ji amụ ihe dị mkpa, ọ bụghị naanị ya ka anyị ga na-aga. Anyị kwesịkwara ịna-aga ozi ọma.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ́ “Ihe Ị Ga-ekwu Mgbe Ị Hụrụ Ha.”
6. Olee ihe mere ịchọ ndị ogbi ji esi ike?
6 Otú Anyị Ga-esi Achọ Ndị Ogbi: Ịchọ ndị ogbi adịghị mfe. N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe ndidi mgbe anyị na-achọ ha, ike ekwesịghịkwa ịgwụ anyị. Ọ bụrụ na mmadụ dara ogbi, a naghị ede ya n’ihu ya. Otú onye ahụ dị ma ọ bụ ụdị efe ọ na-eyi anaghịkwa egosi na ọ dara ogbi. Ihe ọzọ bụ na ihere nwere ike ịna-eme ndị ikwu ya ma ọ bụ ndị enyi ya ịgwa ndị nkwusa ihe niile ha jụrụ ha gbasara ya. Ihe ndị anyị ga-ekwu ugbu a ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-achọ ndị ogbi. Ha nwekwara ike inyere anyị aka mgbe anyị na-achọ ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ anyị ji amụ ihe.
7. (a) Olee ihe anyị ga-agwa ndị mmadụ ma anyị gaa ịchọ ndị ogbi na nke ha? (b) Olee ihe anyị ga-eme ka onye anyị bịara na nke ya ghara inyowe anyị enyo?
7 Ọgbakọ ndị ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na-aga n’ụlọ ndị mmadụ na-achọ ndị ogbi. Ọ na-abụ ha gaa n’ụlọ ndị mmadụ, ha ajụọ ha ma ò nwere onye agbata obi ha, onye ọrụ ha, ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe ha, na-asụ asụsụ ndị ogbi. O nwere ike ịbụ na ndị ahụ na-ahụ saịn bọọdụ na-egosi na e nwere ụmụaka dara ogbi. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye ikwu ha dara ogbi. Cheta na onye ahụ ị bịara na nke ya nwere ike nyowe ihe mere i ji na-achọ onye ogbi ahụ enyo. Ma, ọ gaghị enyowe gị enyo ma ị kwanyere ya ùgwù ma kọwaara ya ná nkenke ihe mere i ji bịa. I kwesịkwara ime ka ọ ghọta na ị chọrọ inyere onye ogbi ahụ aka. Ndị nkwusa ụfọdụ na-eme ha bịa na nke onye ha chọrọ ịjụ ma è nwere onye ogbi ọ ma, ha akpọnyere ya diiviidi anyị e nwere n’asụsụ ndị ogbi. Ha mechaa, ha agwazie ya na ha na-achọ ndị ogbi ha ga-ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ chọghị ịgwa gị ihe ọ bụla gbasara onye ogbi ọ ma, o nwere ike nara gị ihe ọ ga-enye ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike nara gị mpempe akwụkwọ e dere adres Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ ebe e dere oge ọgbakọ unu ji amụ ihe.
8. Olee otú ọgbakọ ọzọ dị ọgbakọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe nso ga-esi enyere ha aka ịchọ ndị ogbi n’ókèala ha?
8 Ọ bụrụ na ọgbakọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe nwere ókèala buru ibu, ha nwere ike ịgwa ọgbakọ ji asụsụ ọzọ amụ ihe ka ha bịa nyere ha aka chọọ ndị ogbi n’ókèala ha. Ha nwere ike ime nke a otu ugboro ma ọ bụkwanụ ugboro abụọ n’afọ. Tupu ha agawa, ha ga-enwe nzukọ ozi ubi. Ná nzukọ ahụ, ha ga-ekwu otú ha ga-esi achọ ndị ogbi, meekwa ihe ngosi ma ha chọọ. E kwesịrị ikenye ndị nọ n’otu ìgwè ozi ubi otu onye nọ n’ọgbakọ ahụ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. E kwesịkwara inye ha map ha ga-eji mara ebe ha ga-aga.
9. Olee otú anyị kwesịrị isi achọ ndị ogbi n’ebe ha na-ezukọta, n’ebe ha na-anọ atụrụ ndụ, ma ọ bụkwanụ n’ebe ha na-aga anara ihe ndị ọchịchị nyere ha?
9 Ọ bụrụ na e nwere ebe ndị ogbi na-ezukọta, ebe ha na-aga atụrụ ndụ ma ọ bụkwanụ ebe ha na-aga anara ihe ndị ọchịchị na-enye ha, ndị nkwusa nwekwara ike ịga chọọ ha n’ebe ahụ. Ndị nkwusa kwesịrị iyi ụdị efe ndị nọ ebe ahụ yi. Ọ ga-aka mma ka a ghara ịgwa ha okwu n’ìgwè. E nwere ike ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ okwu n’otu mgbe. Ọ bụrụ na ha egee ntị, ndị nkwusa ahụ nwere ike ịjụ ha ebe e nwere ike inweta ha ọzọ. Ọ ga-adịkwa mma ma ha gwa ha ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị.
10. Olee ihe ndị nkwusa ga-eme ma ha gaa ịchọ ndị ogbi n’ebe a na-azụ ahịa ma ọ bụ n’ebe a na-arụ ọrụ?
10 Ya bụrụ ebe ụfọdụ a na-azụ ahịa ma ọ bụ ebe a na-arụ ọrụ, ihe anyị nwere ike ime bụ naanị ịjụ ma è nwere onye na-arụ ebe ahụ ma ọ bụ onye ahịa ha na-asụ asụsụ ndị ogbi. Ọ bụrụ na e nwere ụlọ akwụkwọ ndị ogbi n’ókèala anyị, anyị nwere ike inye ha ụfọdụ n’ime diiviidi anyị ha ga-edewe n’ọ́bá akwụkwọ ha.
11. Olee ihe mere ịchọ ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ anyị ji amụ ihe ji bụrụ otu n’ime ihe dị mkpa n’ozi ọma anyị na-ezi?
11 Ọrụ Dị Mkpa: Ịchọ ndị ogbi ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ ji amụ ihe abụghị obere ọrụ. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ na-akwapụ, na-akwabatakwa n’ókèala unu. Nke a na-eme ka a ghara ịma mmadụ ole na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe. Ọ ga-emekwa ka unu na-agbanwe map ókèala unu kwa mgbe kwa mgbe. Ma, n’ọtụtụ ebe, ọ dị mkpa ka ndị nkwusa gaa chọọ ndị na-asụ asụsụ ha ji amụ ihe, n’ihi na o so n’ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ. Jehova, onye nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma, anaghị ele mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 10:34) Uche ya bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) N’ihi ya, ka anyị rubere Jehova isi, nyekwara ụmụnna anyị aka ịchọta ndị nwere “ezi obi nke dị mma,” n’agbanyeghị asụsụ ha na-asụ.—Luk 8:15.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Na-enyerenụ Ibe Unu Aka
Ọ bụrụ na ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè ji asụsụ ọzọ amụ ihe chọrọ ka e nyere ha aka chọta ndị na-asụ asụsụ ha ji amụ ihe, onye nlekọta ije ozi nwere ike nyere ha aka gwa ndị okenye ọgbakọ ndị dị ha nso. Ọ ga-akacha mma ka a gwa naanị ọgbakọ ndị na-adịchaghị anya ma ọ bụkwanụ ọgbakọ ndị e nwere ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ ahụ n’ókèala ha. Ọgbakọ ndị ahụ ga-agwazi ndị nkwusa ha na ọ bụrụ na ha ahụ onye na-asụ asụsụ ahụ, ka ha detuo adres ya n’akwụkwọ ma nye ya onye nlekọta ije ozi ha. Ọ bụzi ya ga-enye ya ọgbakọ ma ọ bụ ìgwè ji asụsụ ahụ amụ ihe. Ndị nlekọta ije ozi nọ n’ọgbakọ ndị dị ibe ha nso kwesịrị ịnọkọ kwurịta otú ọgbakọ ha ga-esi na-aga achọ ndị na-asụ asụsụ ọzọ. Ha ga-ekwukwa otú ha ga-esi na-agwa ọgbakọ ndị nke ọzọ ma ha chọta ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ ndị ahụ ji amụ ihe.
Ndị nkwusa hụ onye na-asụ asụsụ ọzọ nke nwere mmasị n’ozi ọma, ha kwesịrị idejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ma nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ ha n’egbughị oge. Ha kwesịkwara ime otu ihe a ma ha hụ onye ogbi. Nke a ga-eme ka a malite ịmụrụ onye ahụ ihe n’egbughị oge.—Gụọ km 5/11 p. 3.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Otú Unu Ga-esi Na-achọ Ndị Na-asụ Asụsụ Ọgbakọ Unu Ji Amụ Ihe
• Jụọ ndị ị na-amụrụ ihe, ndị ezinụlọ ha, ndị ọrụ ibe gị na ndị ọzọ ma hà ma ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe.
• Ị gaa n’ebe ndị dị ka ọ́bá akwụkwọ ọhaneze, ụlọ ọrụ na ụlọ akwụkwọ, jiri akọ jụọ ha ma hà ma onye ọ bụla na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe.
• Na-agụ akwụkwọ akụkọ ka ị hụ ma è nwere ebe a mara ọkwa na ndị na-asụ asụsụ ahụ ga-enwe nnọkọ.
• Na-aga n’ụlọ ahịa ọ bụla ị ma na ndị na-asụ asụsụ ahụ na-abịakarị azụrụ ihe.
• I nwere ike idewe akwụkwọ dị iche iche n’elu tebụl n’ụlọ ahịa, mahadum, ma ọ bụ n’ebe ndị na-asụ asụsụ ọgbakọ unu ji amụ ihe na-abakarị ụgbọala. Gbalịa nata ndị nwe ebe ahụ ikike tupu i dewe tebụl ahụ.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ihe Ị Ga-ekwu Mgbe Ị Hụrụ Ha
Ọ bụrụ na anyị na-agwa ha okwu otú gosiri na anyị buuru ha ihe ọma n’obi, gharakwa ịmachi ihu, ha agaghị enyowe anyị enyo. Ọ na-akacha mma ma anyị buru ụzọ gosi onye anyị bịara na nke ya akwụkwọ e dere n’asụsụ ya.
I kelechaa onye ahụ, i nwere ike ịsị: “Anyị na-achọ ndị na-asụ ․․․․․ ka anyị na ha kwurịta gbasara nkwa Baịbụl kwere anyị. Ò nwere onye ị ma na-asụ ․․․․․ ebe a?”
Ọ bụrụ na ọ bụ ndị ogbi ka anyị na-achọ, anyị nwere ike ikwu, sị: “Ndeewo. O nwere ihe m chọrọ igositụ gị. [Gbanyere ya diiviidi New World Translation.] Ihe a ị hụrụ si na Baịbụl nke dị n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka. Anyị nwekwara vidio ndị ọzọ dị n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka ndị anyị na-enye ndị mmadụ n’anaghị ha ego. Ò nwere onye ogbi ma ọ bụ onye na-anaghị anụcha ihe ị ma na-anụ asụsụ ndị ogbi?” Ọ bụrụ na o nweghị ike icheta onye ọ bụla, i nwere ike ịjụ ya ma ò nwere onye nke ọ hụtụrụla n’ụlọ ọrụ ha, n’ụlọ akwụkwọ ha, ma ọ bụ n’ebe o bi.