Mụrụ Anya n’Ịchọta Ndị Ntị Chiri Nọ n’Ókèala Unu
1 Jehova na-akpọ òkù, sị: “Bịa . . . Onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:17) Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ntị chiri so ná ndị na-aza òkù a. N’ihi ya, n’ime afọ ise gara aga, a haziwo ụfọdụ ìgwè ndị na-asụ asụsụ ogbi na Nigeria.
2 Ọ bụ ezie na ìgwè ndị na-asụ asụsụ ogbi na-eche mgbalị ha nile nke ime nkwusa ihu n’ịkpọtụrụ ndị ntị chiri na ndị nwere nsogbu ịnụ ihe nọ n’ókèala nke ọgbakọ ebe e kenyere ha ọrụ, a ka nwere ọtụtụ ndị dị otú ahụ a na-ahụbeghị ma gbaara àmà ná mba a.
3 Olee Otú Ị pụrụ Isi Nye Aka? Mgbe ị nọ n’ebe ọha na-eze na-anọ, ị̀ hụtụwo ka ndị mmadụ ji asụsụ ogbi na-akparịta ụka? Ọ̀ dị onye ị maara n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ unu nke nwere onye ntị chiri n’ezinụlọ ha? Mụrụ anya n’ịchọta ndị ntị chiri ka ị na-arụ ọrụ dịịrị gị kwa ụbọchị. Ma olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na ha ga-anabata ịgba àmà banyere Alaeze ahụ?
4 Ịgba Àmà: Mee ka ìgwè na-asụ asụsụ ogbi kasị nọrọ nso mara ebe obibi nke onye ahụ ntị chiri. Ọtụtụ ndị ntị chiri na-enwe ọganihu dị ngwa karị n’ịmụta eziokwu ahụ mgbe ha nwere ike iso Ndịàmà ntị chiri bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ ebe a na-asụgharị ihe omume nzukọ n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America na-akpakọrịta. Ya mere, ọ bụrụ na e nwere ìgwè na-asụ asụsụ ogbi n’ógbè unu, odeakwụkwọ ọgbakọ unu kwesịrị ịgwa ọgbakọ ha ihe metụtara ndị nile ntị chiri nọ n’ókèala unu.
5 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye nọ nso inyere ndị ntị chiri nọ n’ógbè unu aka n’ụzọ ime mmụọ? Olee otú ị pụrụ isi nye aka? Gịnị ma ị gaa nletaghachi ma soro onye ọ bụla na-anụ ihe nọ n’ezinụlọ ahụ kwurịta okwu? Kwee nkwa igosi vidio nke asụsụ ogbi iji kpalie mmasị nke onye ahụ ntị chiri. Ụfọdụ ndị nkwusa ọbụna amụtaworị Ụdị Asụsụ Ogbi nke America iji ruo ndị ntị chiri n’ụzọ dị irè karị. (Ọrụ 16:9, 10) E nwere broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma na vidio n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America. Iji ngwá ọrụ ndị a na-eduzi ọmụmụ Bible arụpụtawo ọtụtụ ihe dị mma.
6 Site n’ịmụrụ anya n’ịchọta ndị ntị chiri n’ógbè unu, ị pụrụ inye ha ohere ịnara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.—Mat. 10:11.