Ndị Ntị Chiri Etoo Jehova
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA
RUO ọtụtụ afọ o siiri Ndịàmà Jehova nọ na Nigeria ike ịkụziri ndị ntị chiri Bible. Ihe kpatara nke a bụ ụkọ nke Ndịàmà maara asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri. Ma nke ahụ na-agbanwe. Ọnụ ọgụgụ Ndịàmà na-arị elu amụtawo asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri, ha na-erukwa ụba mmadụ ntị chiri. Nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ n’ihe omume a bụ mgbakọ distrikti Ndịàmà Jehova e mere na Nigeria n’ihe karịrị otu afọ gara aga.
“Ị pụrụ inwe mmetụta nke mkpali dị gburugburu,” ka otu onye bịara mgbakọ ahụ, n’Ota, Nigeria, kwuru. “E nwere mmetụta nke egwu, mmetụta nke ijuanya,” ka onye ọzọ kwuru. Gịnị kpaliri okwu ndị dị otú ahụ? Na nke mbụ ya na Nigeria, a tụgharịrị usoro ihe omume ahụ nile gaa n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri. Nke a bụ nanị otu mgbakọ n’ime 96 e mere gburugburu mba ahụ n’ime afọ ahụ bụ́ ebe e mere nke a.
N’etiti ọtụtụ puku ndị bịara e nwere mmadụ 43 ntị chiri, bụ́ ndị nọdụrụ ala n’akụkụ aka ekpe nke ebe ikpo okwu, ná nkebi dị n’ihu. Otu bọọdụ ukwu na-acha ọcha nwere akara edemede na-acha uhie uhie nke na-agụ, “Asụsụ Maka Ndị Ogbi na Ndị Ntị Chiri” kokwasịrị n’elu ha. Ndị ahụ ntị chiri bịaranụ nwere oké obi ụtọ ịnọ n’ebe ahụ. Otu n’ime ha dere, sị: “Ọ bụ n’oké ọṅụ na anya mmiri ka m na-ede. Nanị ‘ụnyahụ’ anyị nọ na-enwe nkụda mmụọ ka anyị na-anụ banyere ndokwa ime mmụọ e mere maka ndị Kraịst ibe anyị ntị chiri ná mba ndị ọzọ. Anyị amatụdịghị na otu ngọzi ahụ ga-abịara anyị n’ebe a.”
Olee Ndị Bịara?
Ndị ntị chiri bịara site n’akụkụ nile nke Nigeria. Otu Onyeàmà ntị chiri kpọtara mmadụ atọ ntị chiri ọ na-amụrụ Bible. Ìgwè ọzọ nke ndị ntị chiri, bụ́ ndị mere njem dị kilomita 700 maka nanị ojije, anọwo na-atụkọ ego ụgbọ eri ọnwa asaa. Otú ọ dị, mgbe oge ruru ime njem, ha apụghị inweta ụgbọala site n’aka ụlọ ọrụ ụgbọ njem nke steeti ahụ n’ihi na ọ bụ oge ezumike. Mgbe gọọmenti steeti ahụ matara banyere ihe isi ike ha, o nyere ha naira 13,000 ($152, U.S.) iji nyere ha aka inweta ụgbọ njem ọzọ!
Ezinụlọ ndị nwere ụmụaka ntị chiri mere njem ịbịa mgbakọ a pụrụ iche. Otu nwanyị si n’otu ime obodo nụrụ banyere mgbakọ ahụ wee kpọrọ nwa ya ntị chiri bịa. Ma ya ma nwa ya amachaghị banyere asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri. N’ịbụ ndị ihe ha hụrụ gbara anya mmiri, ha kpebisiri ike ugbu a ịmụta asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri.
N’ime ọtụtụ puku ndị bịara, ụfọdụ bịara site n’ọtụtụ narị kilomita nanị ịhụ otú ndị ntị chiri ga-esi “nụrụ” ihe omume ahụ. Ndị bịara na Sunday dị 13,936—ọnụ ọgụgụ kasị elu na nke ọ bụla n’ime mgbakọ distrikti dị 96 e mere na Nigeria. Ndị ahụ ntị chiri bịaranụ nwere obi ụtọ ịbụ akụkụ nke ìgwè mmadụ ahụ.
A Dọọrọ Mmasị Ndị Nkiri
Ọ bụ nke mbụ ya ọtụtụ n’ime ndị ahụ ntị chiri “na-anụ” ozi ọma n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri. Ndị na-anụ ihe na-ahụkwa asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri na nke mbụ ya. Otu n’ime ndị bịara kwuru na ọ tụrụ ya n’anya ịhụ ka a tụgharịrị ihe nile dị n’ihe omume ahụ—abụ, ekpere, ịma ọkwa, na ọbụna ihe nkiri! “Ọ nọwo na-abụ ihe iri ọnụ,” ka onye ọzọ kwuru.
E gosipụtara ọṅụ nke ndị ntị chiri bịaranụ n’ịbụ abụ ha. N’ịnụ ọkụ n’obi, ha jiri aka ha too Jehova. Nye ndị na-anụ ihe, ikiri ka ndị ntị chiri “na-abụ abụ” bụ ahụmahụ na-emetụ n’obi. Ọ gbara ọtụtụ ndị anya mmiri. A nụrụ ka otu onye bịaranụ nọ na-eti, “O Jehova!” n’oké mmasị ịtụnanya. Otu oge, mgbe a bụsịrị abụ, ndị nọ nso nkebi nke asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri malitere kụwa aka sitere ha n’obi.
Mgbe okwu baptism gwụsịrị, ka ndị a ga-eme baptism biliri ọtọ, otu nwa okorobịa nọ ná nkebi nke asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri bilikwara ọtọ. Ntakwuri obi ekele riri elu n’etiti ndị na-ege ntị mgbe o jiri asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri zaa “ee” n’ịzaghachi ajụjụ abụọ ahụ onye ọkà okwu ahụ jụrụ.
Lee ihe ọṅụ ọ bụụrụ ndị ntị chiri bịaranụ izute ụmụnna ime mmụọ ha ndị nwoke na ndị nwanyị si n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ bịa! Ogwe aka na mkpịsị aka ghọọrọ nkọ ka ndị ntị chiri na-amata ibe ha. E nwere ọtụtụ ikwe n’aka na mgbanwerịta nke adres.
Ndị ntụgharị itoolu (ndị na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri) bịara site n’akụkụ dị iche iche nke mba ahụ. Ọ bụ ihe mara mma ikiri ka ha ji aka na-atụgharị okwu na abụ nile ahụ n’ụzọ dị ùgwù. Maka mgbalị ha e ji mmakụ, ikwe n’aka, na ịja mma kwụọ ha ụgwọ. E jikwa ajụjụ gbaa ha gburugburu: Olee otú i si mụta? Olee otú m pụrụ isi mụta? È nwere akwụkwọ ndị na-akụzi asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri?
Ókèala Ọhụrụ Emepee
Nye ndị ntị chiri, ihe pụtara ìhè e mere ná mgbakọ ahụ bụ mwepụta nke tepu vidio nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri. A gbara ndị ọzọ ume ịmụta asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri na, site n’enyemaka nke ihe enyemaka nkuzi a, iru ndị ntị chiri na gburugburu Nigeria. Mgbakọ ahụ mere ka ọtụtụ ndị kpebisie ike ime nnọọ nke ahụ.
“N’oge gara aga mgbe anyị zutere onye ntị chiri n’ozi ubi, anyị na-agawara onwe anyị n’ụlọ nke na-esote,” ka otu nwanna nwanyị kwuru. “Ugbu a, anyị maara ihe anyị ga-eme.” N’inwe ndị Nigeria nwere nsogbu ịnụ ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde ise, e nwere ohere buru ibu n’ezie. Otu nwanna kwuru, sị: “Nke a bụ mmalite. Ugbu a ọ dị anyị mkpa ịzụlite ókèala ọhụrụ a pụrụ iche.”
N’ọnwa ndị gafeworo eri mgbakọ ahụ, nke ahụ bụ nnọọ ihe meworonụ. A na-eme mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ ịkụziri ọtụtụ nde na Nigeria bụ́ ndị nwere nsogbu ịnụ ihe eziokwu nke Okwu Chineke. Ọ dịkwa ndị a mkpa ịmụta banyere ozi ọma nke ụwa ọhụrụ ahụ na-abịa abịa n’okpuru Alaeze Chineke, n’ihi na n’ebe ahụ ọgwụgwọ ọrụ ebube ga-ewere ọnọdụ, “ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe.”—Aịsaịa 35:5.