Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọgọst 6
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 6
Abụ nke 60 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 24 ¶16-21 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 24-27 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezikiel 24:15-27 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Kraịst Niile Aghaghị Ịbụ Ndị Ozi—td 37A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe E Kwuru n’Ezikiel 18:20 Ọ̀ Na-emegide Ihe E Kwuru n’Ọpụpụ 20:5? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ì Jikerela Ịmaliteghachi Ịga Akwụkwọ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo nsogbu ụfọdụ ndị na-eto eto, bụ́ Ndị Kraịst, na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Kwuo otú ndị nne na nna nwere ike isi nọrọ n’ofufe ezinụlọ jiri akwụkwọ Index, akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, na akwụkwọ anyị ndị ọzọ nyere ụmụ ha aka ịma otú ha ga-esi merie ọnwụnwa ma ọ bụkwanụ kọwaara mmadụ ihe ha kweere. (1 Pita 3:15) Họrọ otu isiokwu ma ọ bụ isiokwu abụọ ma kwuo ihe ụfọdụ akwụkwọ anyị kwuru, bụ́ ndị ga-enyere ụmụ akwụkwọ aka. Jụọ ndị na-ege ntị otú ha si gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọgọst. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụkwanụ otu nkeji kwuo ụfọdụ isiokwu ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-8 n’Ụlọ Nche Ọgọst 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-9 na Teta! Julaị–Septemba nye ya magazin ahụ. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 97 na Ekpere