Ịma Ọkwa
◼ Julaị na Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Septemba na Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl.
◼ E tinyela Sing to Jehovah—Vocal Renditions, Disk nke 5 n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org. Malite n’Ọgọst 1, mmadụ nwere ike ịga ebe ahụ were ya. A ga-ebu ụzọ tinye nke Bekee, e mechaa, e tinye nke asụsụ ndị ọzọ. I nwere ike isi n’ọgbakọ gị tụọ ọda ya ma ị chọọ. Anyị na-agba ndị nwere ike ịga n’adres Ịntanet anyị ume ka ha si ebe ahụ were ya n’ihi na ego ọ ga-efu anyị agaghị ehi nne ma e jiri ya tụnyere ego ọ ga-efu anyị itinye ya na siidi bugara ọgbakọ. Chetakwa na anyị ewepụtala disk nke 1-4 kemgbe.