Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọrụ Ndịozi 24
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi

      • Ebubo ndị e boro Pọl (1-9)

      • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu Feliks (10-21)

      • E yigharịrị ikpe Pọl ruo afọ abụọ (22-27)

Ọrụ Ndịozi 24:1

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “otu ọkàiwu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 23:2
  • +Ọrụ 23:26

Ọrụ Ndịozi 24:2

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 192

Ọrụ Ndịozi 24:3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 192

Ọrụ Ndịozi 24:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “onye okwu na ụka.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 5:11; Ọrụ 16:20, 21; 17:6, 7
  • +Lu 23:1, 2
  • +Mt 2:23; Ọrụ 28:22

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 192

    Ụlọ Nche,

    12/15/2001, p. 22-23

Ọrụ Ndịozi 24:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 21:27, 28

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 192

    Ụlọ Nche,

    12/15/2001, p. 22-23

Ọrụ Ndịozi 24:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ A3.

Ọrụ Ndịozi 24:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Fil 1:7

Ọrụ Ndịozi 24:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 21:17, 26

Ọrụ Ndịozi 24:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 3:15; Ọrụ 3:13; 2Ti 1:3
  • +Ọrụ 28:23; Ro 3:21

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    7/15/2000, p. 13-14

Ọrụ Ndịozi 24:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 26:19; Mt 22:31, 32; Lu 14:13, 14; 23:43; Jn 5:28, 29; 11:25; Hib 11:35; Mkp 20:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara, isiokwu 77

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    9/2022, p. 16-17, 20, 22, 26

    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi 30

    Teta!,

    nke 1 2021 p. 13

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    12/2020, p. 7

    Ụlọ Nche,

    8/1/2015, p. 6

    6/1/2014, p. 10-11

    3/15/2012, p. 11

    6/15/2006, p. 6

    7/15/2001, p. 6

    7/15/2000, p. 13-14

    4/1/1999, p. 18

    7/1/1998, p. 22

    2/15/1995, p. 8-12

    8/1/1991, p. 6

    5/1/1990, p. 26

    Baịbụl Na-akụziri Anyị, p. 77-79

    Bible Na-akụzi, p. 72-73

    Mmezu Mkpughe, p. 297-298

    Mgbe Anyị Nwụrụ, p. 27

    Ihe Ọmụma, p. 185-186

Ọrụ Ndịozi 24:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 23:1; 1Kọ 4:4; Hib 13:18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    10/1/2005, p. 15

Ọrụ Ndịozi 24:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Kọ 8:4

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 169

Ọrụ Ndịozi 24:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 21:24, 26

Ọrụ Ndịozi 24:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 25:16

Ọrụ Ndịozi 24:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 23:6

Ọrụ Ndịozi 24:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:1, 2; 19:9

Ọrụ Ndịozi 24:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 10:18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 194-195

Ọrụ Ndịozi 24:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 17:30, 31; 2Kọ 5:10

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 194-195

    Ụlọ Nche,

    8/15/1993, p. 17-19

Ọrụ Ndịozi 24:26

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2001, p. 23

Ọrụ Ndịozi 24:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 25:9

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 195

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọrụ 24:1Ọrụ 23:2
Ọrụ 24:1Ọrụ 23:26
Ọrụ 24:5Mt 5:11; Ọrụ 16:20, 21; 17:6, 7
Ọrụ 24:5Lu 23:1, 2
Ọrụ 24:5Mt 2:23; Ọrụ 28:22
Ọrụ 24:6Ọrụ 21:27, 28
Ọrụ 24:10Fil 1:7
Ọrụ 24:11Ọrụ 21:17, 26
Ọrụ 24:14Ọp 3:15; Ọrụ 3:13; 2Ti 1:3
Ọrụ 24:14Ọrụ 28:23; Ro 3:21
Ọrụ 24:15Aịz 26:19; Mt 22:31, 32; Lu 14:13, 14; 23:43; Jn 5:28, 29; 11:25; Hib 11:35; Mkp 20:12
Ọrụ 24:16Ọrụ 23:1; 1Kọ 4:4; Hib 13:18
Ọrụ 24:172Kọ 8:4
Ọrụ 24:18Ọrụ 21:24, 26
Ọrụ 24:19Ọrụ 25:16
Ọrụ 24:21Ọrụ 23:6
Ọrụ 24:22Ọrụ 9:1, 2; 19:9
Ọrụ 24:24Mt 10:18
Ọrụ 24:25Ọrụ 17:30, 31; 2Kọ 5:10
Ọrụ 24:27Ọrụ 25:9
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọrụ Ndịozi 24:1-27

Ọrụ Ndịozi

24 Mgbe abalị ise gara, Ananayas bụ́ nnukwu onye nchụàjà+ bịara Sizaria, ya na ndị okenye ụfọdụ na otu onye ma otú e si ekwu okwu n’ihu ọha,* onye a na-akpọ Tetọlọs. Ha bịara ịgwa Gọvanọ Feliks ihe ha sị na Pọl mere.+ 2 Mgbe a gwara Tetọlọs ka o kwuo okwu, ọ malitere ibo Pọl ebubo n’ihu gọvanọ, sị:

“Feliks Onye Ukwu, i meela ka udo dịrị n’obodo anyị. Otú dị mma i si achị emeekwala ka anyị na-enwe ọganihu. 3 Anyị na-ekele gị mgbe niile n’ebe niile maka ihe ndị a ị na-eme. 4 Ma, ka m ghara igbukwu gị oge, biko, nwee ndidi ma gee anyị ntị ka anyị gbuo okwu anyị nkenke. 5 Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye ọjọọ.*+ Ọ na-eme ka ndị Juu niile nọ n’ụwa na-emegide ndị ọchịchị.+ Ọ bụkwa onye ndú òtù a na-akpọ ‘ndị Nazaret.’+ 6 Ọ nwakwara imerụ ụlọ nsọ, anyị ejide ya.+ 7* —— 8 Ị gbaa ya ajụjụ, ị ga-achọpụta na ihe a niile anyị na-ekwu bụ eziokwu.”

9 Ndị Juu sokwa na-ekwusi ike na ihe ndị a bụ eziokwu. 10 Mgbe gọvanọ ahụ kweere Pọl n’isi ka o kwuo okwu, ọ sịrị:

“Ama m nke ọma na ị na-ekpere mba a ikpe kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ bụ ya mere obi ji dị m ụtọ ugbu a ịzara ọnụ m n’ihu gị.+ 11 Ọ karịbeghị abalị iri na abụọ m gara Jeruselem ka m fee Chineke. Ị chọọ, i nwere ike ịchọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu.+ 12 O nweghị mgbe ha hụrụ m ka mụ na onye ọ bụla na-arụ ụka n’ụlọ nsọ ma ọ bụ ka m na-eme ka ndị mmadụ na-akpa aghara n’ụlọ nzukọ ọ bụla ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ na Jeruselem. 13 Ha agaghịkwa egosili gị otú ebubo ndị a ha na-ebo m si bụrụ eziokwu. 14 Ma, ekwetara m na m na-eso ụzọ ahụ ha na-akpọ òtù. Ọ bụ otú m si efe Chineke nna nna m hà,+ n’ihi na m kweere ihe niile Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru.+ 15 Enwekwara m olileanya otú ndị a nwere, na Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.+ 16 Ọ bụ ya mere m ji agbasi mbọ ike mgbe niile ka akọnuche m ghara ịma m ikpe, ka m ghara imebi iwu Chineke ma ọ bụ iwu mmadụ.+ 17 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, agara m Jeruselem ka m nye onyinye a ga-eji nyere ndị obodo m aka,+ nyekwa ihe ndị a ga-eji chụọrọ Chineke àjà. 18 Ka m nọ na-eme ihe ndị a, ha hụrụ m n’ụlọ nsọ mgbe m sacharala onwe m otú iwu kwuru,+ ma ndị mmadụ agbakọtaghị, akpataghịkwa m ọgba aghara. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Juu si ná mpaghara Eshia bịa nọ ebe ahụ. 19 A sịkwa na o nwere ihe ọjọọ ha hụrụ m mere, ha gaara abịa n’ihu gị ugbu a kwuo ya.+ 20 Ma ọ bụkwanụ, ka ndị nọ ebe a kwuo ihe ọjọọ ndị Sanhedrin chọpụtara m mere mgbe ha na-ekpe m ikpe. 21 Naanị ihe ha ga-asị na m mere bụ na m kwuru, sị: ‘A na-ekpe m ikpe taa maka na m kweere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’”+

22 Ma, ebe Feliks ma nke bụ́ eziokwu gbasara Ụzọ Onyenwe anyị,+ o yigharịrị ikpe ha wee sị: “M ga-ekpebi okwu a mgbe ọ bụla ọchịagha Laịsias bịara.” 23 Ọ gwakwara onyeisi ndị agha ahụ ka ọ kpọchie Pọl, ma, ka ọ hapụ ya ka ọ na-eme ihe ụfọdụ ọ chọrọ ime, nakwa ka o kwe ka ndị enyi ya na-abịa enyere ya aka.

24 Mgbe abalị ole na ole gara, Feliks na Drusila nwunye ya, bụ́ onye Juu, bịara. O zikwara ka a kpọọ Pọl. Mgbe o rutere, o gere ya ntị ka ọ na-agwa ya gbasara mmadụ ikwere na Kraịst Jizọs.+ 25 Ma, ka ọ na-ekwu gbasara mmadụ ime ezi omume na ijide onwe ya nakwa ikpe a ga-ekpe ndị mmadụ n’ọdịnihu,+ Feliks tụwara ụjọ ma sị ya: “Ka gawagodị. M ga-ezi ozi ka a kpọọ gị ọzọ ma m nweta ohere.” 26 Ma, ọ nọkwa na-atụ anya ka Pọl nye ya ego. N’ihi ya, ọ kpọrọ ya ugboro ugboro, ya na ya ana-akparịta ụka. 27 Ma, mgbe afọ abụọ gachara, Pọshiọs Festọs nọchiri Feliks. Ma, Feliks hapụrụ Pọl n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ chọrọ ịzụrụ ụtọ ndị Juu.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya