Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọrụ Ndịozi 22
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi

      • Pọl zaara ọnụ ya n’ihu ndị gbakọrọnụ (1-21)

      • Pọl kwuru na ya bụ onye Rom, a hapụ ịpịa ya ihe (22-29)

      • Ndị Sanhedrin zukọrọ (30)

Ọrụ Ndịozi 22:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Fil 1:7

Ọrụ Ndịozi 22:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 11:1
  • +Ọrụ 21:39
  • +Ọrụ 5:34
  • +Ọrụ 26:4, 5
  • +Ga 1:14; Fil 3:4-6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    7/15/1996, p. 26-29

Ọrụ Ndịozi 22:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 8:3; 9:1, 2; 26:9-11; 1Ti 1:12, 13

Ọrụ Ndịozi 22:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:3-8; 26:13-15

Ọrụ Ndịozi 22:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Grik, “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?”

Ọrụ Ndịozi 22:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 26:16

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    10/15/2012, p. 28

Ọrụ Ndịozi 22:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:17, 18

Ọrụ Ndịozi 22:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 9:1; 15:8; Ga 1:15, 16

Ọrụ Ndịozi 22:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 23:11; 26:16

Ọrụ Ndịozi 22:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 10:43
  • +1Kọ 6:11; 1Jn 1:7; Mkp 1:5

Ọrụ Ndịozi 22:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:26; Ga 1:18

Ọrụ Ndịozi 22:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:28, 29

Ọrụ Ndịozi 22:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 8:3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/2007, p. 17

Ọrụ Ndịozi 22:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Grik, “onye àmà gị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 7:58; 8:1; 1Ti 1:13, 15

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    6/15/2007, p. 17

Ọrụ Ndịozi 22:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 9:15; 13:2; Ro 1:5; 11:13; Ga 2:7; 1Ti 2:7

Ọrụ Ndịozi 22:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 16:13

Ọrụ Ndịozi 22:24

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2001, p. 21-22

    6/15/1990, p. 23

Ọrụ Ndịozi 22:25

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, onyeisi otu narị ndị agha.

  • *

    Ma ọ bụ “a na-ekpeghị ikpe?”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 16:37, 38; 23:27

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    3/1/2015, p. 12

    12/15/2001, p. 22

Ọrụ Ndịozi 22:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 16:37

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 184

Ọrụ Ndịozi 22:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 25:16

Ọrụ Ndịozi 22:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Mt 10:17, 18; Lu 21:12

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọrụ 22:1Fil 1:7
Ọrụ 22:3Ro 11:1
Ọrụ 22:3Ọrụ 21:39
Ọrụ 22:3Ọrụ 5:34
Ọrụ 22:3Ọrụ 26:4, 5
Ọrụ 22:3Ga 1:14; Fil 3:4-6
Ọrụ 22:4Ọrụ 8:3; 9:1, 2; 26:9-11; 1Ti 1:12, 13
Ọrụ 22:6Ọrụ 9:3-8; 26:13-15
Ọrụ 22:10Ọrụ 26:16
Ọrụ 22:13Ọrụ 9:17, 18
Ọrụ 22:141Kọ 9:1; 15:8; Ga 1:15, 16
Ọrụ 22:15Ọrụ 23:11; 26:16
Ọrụ 22:16Ọrụ 10:43
Ọrụ 22:161Kọ 6:11; 1Jn 1:7; Mkp 1:5
Ọrụ 22:17Ọrụ 9:26; Ga 1:18
Ọrụ 22:18Ọrụ 9:28, 29
Ọrụ 22:19Ọrụ 8:3
Ọrụ 22:20Ọrụ 7:58; 8:1; 1Ti 1:13, 15
Ọrụ 22:21Ọrụ 9:15; 13:2; Ro 1:5; 11:13; Ga 2:7; 1Ti 2:7
Ọrụ 22:232Sa 16:13
Ọrụ 22:25Ọrụ 16:37, 38; 23:27
Ọrụ 22:28Ọrụ 16:37
Ọrụ 22:29Ọrụ 25:16
Ọrụ 22:30Mt 10:17, 18; Lu 21:12
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọrụ Ndịozi 22:1-30

Ọrụ Ndịozi

22 “Ụmụnna m na ndị nna m, geenụ m ntị ka m gwa unu ihe merenụ.”+ 2 Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu n’asụsụ Hibru, ha anọrọkwuo nwayọọ. O wee sị: 3 “Abụ m onye Juu+ a mụrụ na Tasọs nke dị na Silishia.+ Ma, agụrụ m akwụkwọ n’obodo a. Ọ bụkwa Gameliel+ kụziiri m ihe. A kụziiri m ka m na-esosi Iwu nna nna anyị hà soro ike.+ M na-anụkwa ọkụ n’obi n’ozi m na-ejere Chineke otú unu niile na-eme taa.+ 4 Akpagburu m ndị na-eso Ụzọ a,* gbuodị ụfọdụ n’ime ha. M na-eke ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ha agbụ, na-atụkwa ha mkpọrọ.+ 5 Nnukwu onye nchụàjà na ndị okenye niile makwa na ihe a m na-ekwu bụ eziokwu. O nwekwara mgbe ha nyere m akwụkwọ ozi ndị m ga-enye ndị Juu ibe anyị nọ na Damaskọs, mụ agawa ka m kpụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ bịa Jeruselem ka a taa ha ahụhụ.

6 “Ma mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo Damaskọs, n’ihe dị ka n’etiti ehihie, m hụrụ ìhè dị egwu si n’eluigwe nwuo gburugburu m na mberede.+ 7 M wee daa n’ala ma nụ olu sịrị m: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ 8 Mụ asị ya: ‘Ị̀ bụkwanụ onye?’* Ya asị m: ‘Abụ m Jizọs onye Nazaret, onye ị na-akpagbu.’ 9 Ndị mụ na ha so hụrụ ìhè ahụ, ma ha aghọtaghị ihe onye ahụ na-agwa m okwu kwuru. 10 M kwuziri, sị: ‘Onyenwe m, gịnị ka m ga-eme?’ Onyenwe m asị m: ‘Bilie, banye Damaskọs. E nwere onye nọ ebe ahụ ga-agwa gị ihe niile e kpebiri ị ga-eme.’+ 11 Ma ìhè ahụ dị egwu mere ka m kpuo ìsì. Ndị ahụ mụ na ha so esekpụrụ m n’aka duru m ruo Damaskọs.

12 “Otu nwoke aha ya bụ Ananayas, onye na-atụ egwu Chineke otú Iwu Mosis kwuru, onye ndị Juu niile bi ebe ahụ na-ekwu okwu ọma banyere ya, 13 bịakwutere m. O guzo m n’akụkụ wee sị m, ‘Sọl, nwanna m, hụwa ụzọ.’ M hụwara ụzọ ozugbo ahụ, hụkwa ya.+ 14 Ya asị m: ‘Chineke nna nna anyị hà ahọrọla gị ka ị bịa mara uche ya, hụ Jizọs, onye ezi omume,+ nụkwa ihe o ji ọnụ ya kwuo. 15 Ọ họọrọ gị ka ị bụrụ onye àmà ya, ka ị na-akọrọ mmadụ niile ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.+ 16 Gịnị mere i ji na-egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim. Ọ bụrụkwa na ị na-akpọ aha Jizọs,+ Chineke ga-agbaghara gị mmehie gị.’+

17 “Ma mgbe m laghachiri Jeruselem,+ nọrọ n’ụlọ nsọ na-ekpe ekpere, ahụrụ m ọhụụ. 18 Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ na-asị m: ‘Mee ngwa, si na Jeruselem pụọ ọsọ ọsọ, n’ihi na ha agaghị ekwere ihe ị ga-agwa ha gbasara m.’+ 19 M wee sị: ‘Onyenwe anyị, hanwa ma nke ọma na m na-agabu n’ụlọ nzukọ dị iche iche, na-akpụrụ ndị kweere na gị, na-atụ ha mkpọrọ, na-apịakwa ha ihe.+ 20 Anọkwa m mgbe e gburu Stivin ohu gị,* kwado ogbugbu e gburu ya. M chekwara uwe elu ndị gburu ya nche.’+ 21 Ma, ọ sịrị m: ‘Gawa, n’ihi na m ga-eziga gị ná mba ndị dị anya.’”+

22 Ha nọkwa na-ege ya ntị ruo mgbe o kwuru ihe a. Ha wee tie mkpu, sị: “Nwoke a kwesịrị ọnwụ. Gbuonụ ya!” 23 Ha nọkwa na-eti mkpu, na-eyipụ uwe elu ha, na-atụsa ha aghara aghara, na-ekpolikwa uzuzu elu.+ 24 N’ihi ya, ọchịagha ahụ kwuru ka a kpọbata Pọl n’ogige ndị agha. O kwukwara na a ga na-apịa ya ihe ma a na-agba ya ajụjụ, ka ọ mara kpọmkwem ihe mere ha ji na-eti mkpu ka e gbuo ya. 25 Ma mgbe ha gbatịrị Pọl ka a pịa ya ụtarị, ọ jụrụ onyeisi ndị agha* guzo ebe ahụ, sị: “Iwu ò nyere unu ikike ịpịa onye Rom a na-amaghị ikpe* ihe?”+ 26 Ma mgbe onyeisi ndị agha ahụ nụrụ ihe a, ọ gakwuuru ọchịagha ahụ, sị ya: “Gịnị ka ị ga-eme ugbu a, ebe ọ bụ na nwoke a bụ onye Rom?” 27 N’ihi ya, ọchịagha ahụ bịakwutere Pọl, sị ya: “Ị̀ bụ onye Rom?” Ya asị: “Ee.” 28 Ọchịagha ahụ asị ya: “Akwụrụ m ezigbo ụgwọ tupu mụ abụrụ onye Rom.” Pọl asị: “Ma, mụnwa bụ onye Rom kemgbe a mụrụ m.”+

29 N’ihi ya, ndị ahụ chọrọ ịgba ya ajụjụ si ebe ọ nọ pụọ ozugbo ahụ. Ụjọ bịakwara ọchịagha ahụ mgbe ọ chọpụtara na ọ bụ onye Rom nakwa na ya ekeela ya agbụ.+

30 N’echi ya, ọ tọpụrụ Pọl agbụ ma gwa ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin ka ha zukọọ, n’ihi na ọ chọrọ ịma kpọmkwem ihe ndị Juu sị na o mere. Ọ kpọtaziri Pọl n’ihu ndị ahụ zukọrọnụ.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya