Nyere Ndị Agbata Obi Gị Aka Ịchọpụta Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
1 Mmadụ enwewo nnukwu ihe ịga nke ọma na nkà sayensị na narị afọ nke 20 nke a. Nke a enyewo ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu ọnọdụ ibi ndụ a na-enwetụbeghị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị sitere n’akụkụ nile nke ndụ adawo kpam kpam n’otu akụkụ nke ibi obi mmadụ—ezinụlọ. Ọdịda ha bụ n’ihi ileghara ụkpụrụ nduzi ndị sitere n’aka Onye ahụ “e sitere na Ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha” anya, bụ́ Jehova Chineke.—Efe. 3:15.
2 Ezinụlọ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ nwere Bible, ma ọ na-ara uzuzu n’elu ihe ndebe akwụkwọ kama ịbụ ihe e ji eme ihe n’ịgwọ nsogbu ezinụlọ. Iji nweta obi ụtọ ezinụlọ, a ghaghị itinye nduzi na ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. Na February, anyị ga-agbalịsi ike isoro onye ọ bụla kerịta akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ndị a bụ aro ụfọdụ maka iche akwụkwọ ahụ n’ihu mmadụ:
3 Ọ bụrụ na i zute nne ma ọ bụ nna n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ị pụrụ ịkpali mmasị site n’ikwu, sị:
◼ “N’ihi nrụgide na nchegbu nile anyị na-eche ihu kwa ụbọchị, ị̀ na-eche na ọ ga-ekwe omume ibi ndụ ezinụlọ nwere obi ụtọ n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] A na-ahụ isi ihe na-akpata ezi obi ụtọ ezinụlọ n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Ezinụlọ na-etinye ha n’ọrụ ga-anụ ụtọ udo nke Chineke. [Gụọ Aịsaịa 32:17, 18.] Akwụkwọ a, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, na-esetịpụ ụkpụrụ ndị pụrụ inyere anyị aka iwulite ezinụlọ anyị.” Sapeta peji nke 11, gụpụtakwa paragraf nke 20. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ ₦55.
4 Ná nleta na-esochi ị pụrụ ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ n’ụzọ dị otú a:
◼ “Mgbe anyị zutere ná mbụ, apụrụ m ịhụ na ị na-eche n’ezie banyere ezinụlọ gị. Ọ ga-amasị m igosi gị ihe n’akwụkwọ ahụ ị natara bụ nke m chere na ọ ga-amasị gị. Isiokwu ikpeazụ ya na-akọwa ezi isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ. [Gụpụta paragraf nke 2 na peji nke 183.] Rịba ama na ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ime uche Chineke bụ isi ya. Anyị na-atụ aro ka ezinụlọ mụkọọ Bible ọnụ iji mụta ihe uche Chineke bụ na ụzọ isi tinye ya n’ọrụ n’ezinụlọ. Anyị na-eduzi usoro ọmụmụ Bible n’efu nke na-ewe nanị ọnwa ole na ole ịmụzu ya. Ọ bụrụ na ị ga-ekwe m, aga m egosi gị otú e si eduzi ya.” Were akwụkwọ Ihe Ọmụma laghachi maka inwekwu nkwurịta okwu.
5 Mgbe ị na-agwa ndị ntorobịa nọ n’ókèala okwu, ị pụrụ iji ụzọ njekwu a mee ihe:
◼ “Ọtụtụ ndị ntorobịa taa na-eme mkpesa na ndị mụrụ ha adịghị aghọta ha. Gịnị ka i chere na-akpata nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Akwụkwọ a nke a haziri nke ọma inye aka ná nsogbu ezinụlọ na-ekwu ihe a na-adọrọ mmasị n’isiokwu bụ́ ‘Nkwurịta Okwu nke Ghere Oghe na nke Eziokwu.’ [Gụpụta paragraf nke 4 na peji nke 65 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.] Paragraf ndị sonụ na-enye okwu ndụmọdụ dị mma n’ụzọ isi mee ka nkwurịta okwu ezinụlọ dịwanye mma. Aha akwụkwọ a bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ị pụrụ inweta nke a n’ụtụ ₦55.” Mee ndokwa maka nletaghachi.
6 Ị pụrụ ịga n’ihu ná mkparịta ụka mbụ gị na onye ntorobịa nwere banyere nkwurịta okwu n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa ya site n’ikwu, sị:
◼ “Enwere m mmasị n’ọchịchọ gị inwe nkwurịta okwu dị mma n’ezinụlọ gị. Dị ka onye ntorobịa, ụtụ dị aṅaa ka ị pụrụ ịtụnye iji mee ka nkwurịta okwu gị na ndị mụrụ gị dịwanye mma? [Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta peji nke 65 n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ, gụpụtakwa paragraf nke 5.] Ahụmahụ egosiwo na a na-arụpụta ihe kasị mma site n’ịgbaso ndụmọdụ dị irè a na-achọta na Bible.” Chee broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? n’ihu. Kọwaa na ihe ọmụmụ 16 ya na-enye ndepụta bụ isi nke ozi Bible. Gụpụta okwu mmalite dị na peji nke 2, mgbe ahụ tụlekọọ ihe ọmụmụ nke mbụ ọnụ.
7 Ekwela ka aka gị zuo ike n’ịkụ mkpụrụ Alaeze n’ihi na Jehova ga-agọzi mgbalị gị n’inyere ndị agbata obi gị aka ịchọpụta isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ.—Mak 12:31.