ISI NKE ISII
Nyere Nwa Gị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Aka Inwe Ọganihu
1, 2. Ihe ịma aka na ọṅụ dịgasị aṅaa ka afọ ndụ iri na ụma na-eweta?
INWE nwa nọ n’afọ iri na ụma n’ụlọ dị nnọọ iche n’inwe onye dị afọ ise ma ọ bụ ọbụna onye dị afọ iri. Oge afọ iri na ụma na-eweta ihe ịma aka na nsogbu ndị nke ha, ma ha pụkwara iweta ọṅụ na ụgwọ ọrụ. Ihe atụ ndị dị ka Josef, Devid, Josaịa, na Timoti na-egosi na ndị na-eto eto pụrụ ime ihe ezi uche dị na ya ma soro Jehova nwee mmekọrịta dị mma. (Jenesis 37:2-11; 1 Samuel 16:11-13; 2 Ndị Eze 22:3-7; Ọrụ 16:1, 2) Ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-egosipụta otu isi ihe ahụ. Ma eleghị anya, ị maara ụfọdụ n’ime ha.
2 Ma, nye ụfọdụ afọ iri na ụma bụ nke ọgba aghara. Ndị nọ n’oge uto na-enwe ahụmahụ oge ọma na oge ọjọọ dị iche iche nke mmetụta. Ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịchọ inwerekwu onwe ha, ha pụkwara ịjụ ókè nke ndị nne na nna ha kpaara ha. Ma, ndị ntorobịa dị otú ahụ enwebeghị ahụmahụ, ha nwekwara mkpa enyemaka ịhụnanya, ndidi sitere n’aka nne na nna ha. Ee, afọ iri na ụma pụrụ ịbụ ihe na-akpali akpali, ma ha pụkwara ịbụ ihe na-agbagwoju anya—nye ma ndị nne na nna ma ndị nọ n’afọ iri na ụma. Olee otú a pụrụ isi nyere ndị ntorobịa aka n’afọ ndị a?
3. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị nne na nna pụrụ isi nye nwa ha nọ n’oge uto ohere dị mma ná ndụ?
3 Nne na nna ndị na-agbaso ndụmọdụ Bible na-enye ụmụ ha nọ n’oge uto ohere kasị mma nke kwere omume iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịgabiga ọnwụnwa ndị ahụ iji ghọọ ndị nwere ezi uche mgbe ha mere okenye. N’ala nile na n’oge nile, e jiriwo ihe ịga nke ọma gọzie ndị nne na nna na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị tinyekọrọ ụkpụrụ Bible n’ọrụ.—Abụ Ọma 119:1.
NKWURỊTA OKWU NKE GHERE OGHE NA NKE EZIOKWU
Nọrọ nso mgbe ọ dị nwa gị nọ n’afọ iri na ụma mkpa ikwurịta okwu
4. N’ihi gịnị ka izu nzuzo ji dị oké mkpa karịsịa n’afọ iri na ụma?
4 Bible na-asị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na izu nzuzo dị mkpa mgbe ụmụaka ahụ ka dị nta, ọ dị mkpa karị n’afọ iri na ụma—mgbe yiri ka ndị na-eto eto na-etinye oge dị nta n’ụlọ na oge ka ukwuu n’ebe ndị enyi ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ndị mkpakọrịta ọzọ nọ. Ọ bụrụ na e nweghị izu nzuzo—nkwurịta okwu nke ghere oghe na nke eziokwu n’etiti ụmụ na ndị nne na nna—ndị nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịghọ ndị ọbịa n’ụlọ ahụ. Ya mere olee otú a pụrụ isi mee ka ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe?
5. Olee otú e si gbaa ndị nọ n’afọ iri na ụma ume ile ihe metụtara nkwurịta okwu nke ha na ndị mụrụ ha anya?
5 Ma ndị nọ n’afọ iri na ụma ma ndị nne na nna aghaghị imezu akụkụ ha na nke a. N’eziokwu, ọ pụrụ isiri ndị nọ n’oge uto ike karị isoro ndị mụrụ ha kwurịta okwu karịa ka ha mere mgbe ha ka dị ntakịrị. Otú ọ bụla o si dị, cheta na “mgbe ọ na-adịghị ezi ndụmọdụ ọ bụla dị, ndị ahụ ga-ada: ma nzọpụta dị n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ.” (Ilu 11:14) Okwu ndị a metụtara ndị nile, ma nwata ma okenye. Ndị nọ n’afọ iri na ụma ndị matara nke a ga-aghọta na ezi nduzi ka dị ha mkpa, ebe ha na-ezute okwu ndị ka dị mgbagwoju anya karịa ka ọ dị na mbụ. Ha kwesịrị ịghọta na nne na nna kwere ekwe tozuru etozu nke ọma dị ka ndị ndụmọdụ n’ihi na ha ka nwee ahụmahụ ná ndụ, ha egosiwokwa nchegbu ịhụnanya ha ruo ọtụtụ afọ. Ya mere, n’oge a nke ndụ ha, ndị nọ n’afọ iri na ụma maara ihe agaghị esi n’ebe nne na nna ha nọ wezụga onwe ha.
6. Àgwà dị aṅaa ka ndị nne na nna maara ihe nke na-ahụ n’anya ga-enwe n’ihe banyere isoro ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma kwurịta okwu?
6 Nkwurịta okwu ghere oghe pụtara na nne ma ọ bụ nna ahụ ga-agbalịsi ike ịnọrọ ya mgbe ọ dị nwa nọ n’afọ iri na ụma mkpa ikwurịta okwu. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, jide n’aka na nkwurịta okwu ghere oghe ma ọ dịghị ihe ọzọ site n’akụkụ nke gị. Nke a nwere ike ọ gaghị adị mfe. Bible na-asị na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3:7) Mgbe nwa gị nọ n’afọ iri na ụma chere na ọ bụ oge ikwu okwu, ọ pụrụ ịbụ oge gị ịgba nkịtị. Ikekwe i setịpụwo oge ahụ maka ọmụmụ ihe onwe onye, ntụsara ahụ, ma ọ bụ ịrụ ọrụ n’ụlọ. Otú o sina dị, ọ bụrụ na nwa gị na-eto eto achọọ ịgwa gị okwu, gbalịa ịhazigharị atụmatụ gị ma gee ntị. Ma ọ bụghị ya, o nwere ike ọ gaghị anwa ya ọzọ. Cheta ihe atụ nke Jisọs. N’otu oge, o mewo atụmatụ oge iji zuo ike. Ma mgbe ndị mmadụ na-agbakọta gburugburu ya ige ya ntị, ọ napụrụ onwe ya izu ike ma malite izi ha ihe. (Mak 6:30-34) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-achọpụta na nne na nna ha na-ebi ndụ jupụtara n’ihe omume, ma mmesi obi ike na nne na nna ha nọ ya ma ọ bụrụ na ha achọọ ha dị ha mkpa. Ya mere, nọrọ ya mgbe nile ma na-enwe nghọta.
7. Gịnị ka ọ dị ndị nne na nna mkpa izere?
7 Gbalịa icheta ihe ọ dị ka ya mgbe ị nọ n’afọ iri na ụma, atụfukwala omume ime ihe ọchị gị! Ọ dị ndị nne na nna mkpa inwe ihe ụtọ n’isoro ụmụ ha nọrọ. Mgbe e nwere oge ịnọ nkịtị, olee ụzọ ndị nne na nna si eji ya eme ihe? Ọ bụrụ na ha na-achọ mgbe nile iji oge ịnọ nkịtị ha eme ihe dị iche iche na-agụnyeghị ezinụlọ ha, ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma ga-adị ngwa ịmata. Ọ bụrụ na ndị nọ n’oge uto eruo ná nkwubi okwu nke na ndị enyi n’ụlọ akwụkwọ na-echere ha echiche karịa ka nne na nna ha na-eche, ha ga-enwerịrị nsogbu.
IHE A GA-EKWURỊTA
8. Olee otú a pụrụ isi kụbanye obi ekele maka ime ihe n’eziokwu, ịrụsi ọrụ ike, na àgwà kwesịrị ekwesị n’ime ụmụaka?
8 Ọ bụrụ na ndị nne na nna akụnyebeghị n’ime ụmụ ha obi ekele maka ime ihe n’eziokwu na ịrụsi ọrụ ike, ha kwesịrị nnọọ ime nke ahụ n’afọ ndị ahụ nke iri na ụma. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) Ọ dịkwa ha oké mkpa ijide n’aka na ụmụ ha kweere site n’obi dum ịdị mkpa nke ibi ndụ omume ọma na nke dị ọcha. (Ilu 20:11) Nne ma ọ bụ nna na-ekwurịta okwu n’akụkụ ndị a karịsịa site n’ụzọ ihe atụ. Dị ka ndị bụ di na-ekweghị ekwe pụrụ isi bụrụ ndị ‘nwunye ha ritere n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu,’ otú ahụ ka ndi nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịmụta ụkpụrụ ndị ziri ezi site n’omume nne na nna ha. (1 Pita 3:1) Ma, ihe atụ n’onwe ya ezughị ezu ma ọlị, ebe ọ bụ na e kpughekwara ụmụaka nye ọtụtụ ihe atụ ọjọọ na njupụta nke akụkọ ụgha na-adọrọ adọrọ n’èzí ezinụlọ. Ya mere, ọ dị ndị nne na nna na-ahụ n’anya mkpa ịmara echiche nke ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma banyere ihe ha na-ahụ, na-anụkwa, nke a na-achọkwa mkparịta ụka ndị na-arụpụta ihe.—Ilu 20:5.
9, 10. N’ihi gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị iji jide n’aka izi ụmụ ha ihe banyere mmekọahụ, oleekwa otú ha pụrụ isi mee nke a?
9 Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe a bịara n’okwu mmekọahụ. Ndị nne na nna, ọ̀ na-eme unu ihere isoro ụmụ unu tụlee mmekọahụ? Ọbụna ọ bụrụ otú ahụ, mee mgbalị ime nke ahụ, n’ihi na ụmụ gị na-eto eto ga-amụtarịrị banyere isiokwu ahụ site n’aka mmadụ. Ọ bụrụ na ha amụtaghị ya n’aka gị, ònye ma ụdị ihe ọmụma gbagọrọ agbagọ ha ga-enweta? Na Bible, Jehova adịghị eme ihere ikwu okwu metụtara mmekọahụ, ndị nne na nna ekwesịghịkwa ime ihere.—Ilu 4:1-4; 5:1-21.
10 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Bible nwere nduzi doro anya n’akụkụ nke omume mmekọahụ, Watchtower Society ebipụtawokwa ọtụtụ ihe ọmụma na-enye aka nke na-egosi na nduzi nke a ka dịkwa irè n’ụwa nke oge a. Gịnị ma i jiri enyemaka a mee ihe? Dị ka ihe atụ, gịnị ma i soro nwa gị nwoke ma ọ bụ nwanyị tụlee isiokwu ndị kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1 na Nke 2? Ị pụrụ inwe ihe ịtụnanya na-enye obi ụtọ n’ihe ọ ga-arụpụta.
11. Gịnị bụ ụzọ kasị irè maka ndị nne na nna ịkụziri ụmụ ha ụzọ e si efe Jehova?
11 Gịnị bụ isiokwu kasị mkpa nne na nna na ụmụaka kwesịrị ịtụle? Pọl onyeozi rụtụrụ ya aka mgbe o dere, sị: “Na-azụpụta [ụmụ gị] n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ọ dị ụmụaka mkpa ịnọgide na-amụ banyere Jehova. Karịsịa, ọ dị ha mkpa ịmụta ịhụ ya n’anya, ha kwesịkwara ịchọ ijere ya ozi. N’ebe a kwa, a pụrụ izi ọtụtụ ihe site n’ihe atụ. Ọ bụrụ na ndị nọ n’oge uto ahụ na nne na nna ha ‘weere obi ha dum, werekwa mkpụrụ obi ha dum, werekwa uche ha dum’ hụ Chineke n’anya, nakwa na nke a na-amịpụta mkpụrụ ọma ná ndụ nne na nna ha, ha pụkwara ịbụ ndị o metụtara ime otu ihe ahụ. (Matiu 22:37) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na ndị na-eto eto ahụ na nne na nna ha nwere echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe, na-etinye Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ, ha ga-abụ ndị e nyeere aka ịzụlite otu uche ahụ.—Eklisiastis 7:12; Matiu 6:31-33.
Ọmụmụ Bible chiri anya dị mkpa maka ezinụlọ
12, 13. Isi ihe dịgasị aṅaa ka a ga-eburu n’uche ma ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ezinụlọ ga-aga nke ọma?
12 Ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa izu bụ ihe enyemaka pụtara ìhè n’iso ndị na-eto eto kwurịta ihe ime mmụọ. (Abụ Ọma 119:33, 34; Ilu 4:20-23) Inwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ n’ụzọ chiri anya dị mkpa. (Abụ Ọma 1:1-3) Ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịghọta na ọmụmụ ihe ezinụlọ kwesịrị ibu ihe omume ndị ọzọ ụzọ, ọ bụghị ihe megidere ya. Ọzọkwa, àgwà nke ziri ezi dị mkpa ma ọ bụrụ na ọmụmụ ihe ezinụlọ ga-adị irè. Otu nna sịrị: “Isi ihe dị na ya bụ ka onye nduzi ya kwalite ọnọdụ nke dị ntụsara ahụ ma dịkwa ùgwù n’ebe ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ dị—nke agbasochighị iwu anya ma ghara ịbụ nke e ji egwuri egwu. Nguzozi dị mma nwere ike ọ gaghị adị mfe mgbe nile inweta, nhazigharị nke àgwà ga-adị ndị na-eto eto mkpa mgbe mgbe. Ọ bụrụ na ihe agaghị nke ọma n’otu oge ma ọ bụ abụọ, nọgidesie ike ma lepụ anya n’ihu maka oge ọzọ.” Otu nna a sịrị na n’ekpere ya tupu ọmụmụ ihe nke ọ bụla, ọ na-arịọ kpọmkwem maka enyemaka site n’aka Jehova maka echiche ziri ezi n’akụkụ ndị nile o metụtara.—Abụ Ọma 119:66.
13 Iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ bụ ibu ọrụ nke nne na nna kwere ekwe. N’eziokwu, ụfọdụ nne na nna nwere ike ha agaghị abụ ndị ọkà nkụzi, ọ pụkwara isiri ha ike ịchọta ụzọ isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ na-adọrọ mmasị. Ka o sina dị, ọ bụrụ na ị hụrụ ụmụ gị nọ n’afọ iri na ụma n’anya “n’ọrụ na eziokwu,” ị ga-achọ inyere ha aka n’ụzọ obi umeala na n’eziokwu ịga n’ihu n’ime mmụọ. (1 Jọn 3:18) Ha pụrụ ime mkpesa site n’oge ruo n’oge, ma o yikarịrị ka ha ga-aghọta mmasị gị dị omimi n’ọdịmma ha.
14. Olee otú a pụrụ isi tinye Deuterọnọmi 11:18, 19 n’ọrụ mgbe a na-agwa ndị nọ n’afọ iri na ụma ihe ime mmụọ?
14 Ọ bụghị nanị ọmụmụ ihe ezinụlọ bụ ọnọdụ iji wee kwurịta ihe ndị dị mkpa n’ime mmụọ. Ì chetara iwu Jehova nyere ndị nne na nna? Ọ sịrị: “Unu ga-edokwa okwu ndị a n’obi unu na n’ime mkpụrụ obi unu; unu ga-ekekwa ha n’elu aka unu ka ha bụrụ ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa mkpọnihu n’etiti anya unu. Unu ga-ezi ụmụ unu ha, n’ikwu okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 11:18, 19; leekwa Deuterọnọmi 6:6, 7.) Nke a apụtaghị na ndị nne na nna ga na-ekwuru ụmụ ha okwuchukwu mgbe nile. Ma onye isi ezinụlọ nke na-ahụ n’anya kwesịrị mgbe nile ịdị ngwa ịhụta ohere iji wulite ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ ya.
ỊDỌ AKA NÁ NTỊ NA NKWANYE ÙGWÙ
15, 16. (a) Gịnị bụ ịdọ aka ná ntị? (b) Ònye nwere ibu ọrụ nke inye ịdọ aka ná ntị, ònyekwa nwere ibu ọrụ ịhụ na a ga-aṅa ya ntị?
15 Ịdọ aka ná ntị bụ ọzụzụ nke na-agbazi olu, ọ na-agụnyekwa nkwurịta okwu. Ịdọ aka ná ntị na-enwe echiche nke mgbazi olu karịa inye ahụhụ—ọ bụ ezie na inye ahụhụ pụrụ ịbata n’okwu ahụ. Ịdọ aka ná ntị dị ụmụ gị mkpa mgbe ha dị nta karị, ugbu a ha nọkwa n’afọ iri na ụma, ụdị ya ụfọdụ ka dị ha mkpa, ikekwe ọbụna karị. Ndị nọ n’afọ iri na ụma nwere amamihe maara na nke a bụ eziokwu.
16 Bible na-asị: “Onye uche ya gbagọrọ agbagọ na-elelị ịdọ aka ná ntị nna ya: ma onye na-arịba ịba mba ama ga-aghọ onye nwere ezi uche.” (Ilu 15:5) Anyị na-amụta ọtụtụ ihe site n’akụkụ akwụkwọ nsọ nke a. Ọ na-egosi na a ga-enye ịdọ aka ná ntị. Onye nọ n’afọ iri na ụma apụghị ‘ịrịba ịba mba ama’ ma ọ bụrụ na e nyeghị ya. Jehova na-enye ndị nne na nna ibu ọrụ maka inye ịdọ aka ná ntị, karịsịa ndị bụ nna. Otú ọ dị, ibu ọrụ nke ige ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ dịịrị nwa ahụ nọ n’afọ iri na ụma. Ọ ga-amụta ihe karị ma mee ndahie ole na ole ka nta ma ọ bụrụ na ọ nụrụ ịdọ aka ná ntị amamihe nke nna na nne ya. (Ilu 1:8) Bible na-asị: “Ịnọ n’ogbenye na nlelị ga-adịrị onye na-ezere ịdọ aka ná ntị: ma onye na-arịba ịba mba ama ka a ga-asọpụrụ.”—Ilu 13:18.
17. Ezi nguzozi dị aṅaa dị ndị nne na nna mkpa mgbe ha na-adọ aka ná ntị?
17 Mgbe a na-adọ ụmụ nọ n’afọ iri na ụma aka ná ntị, ngụzozi dị nne na nna mkpa. Ha kwesịrị izere ịdị aka ike nke na ha na-akpasu ụmụ ha iwe, ikekwe ọbụna na-emebi obi ike onwe onye nke ụmụ ha. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ma nne na nna agaghịkwa achọ ịdị na-anakwere ihe nile nke na a na-anapụ ndị ha na-eto eto ọzụzụ dị mkpa. Nnakwere ihe nile dị otú ahụ pụrụ ibibi ihe. Ilu 29:17 na-asị: “Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka i zuo ike; ee, ọ ga-enye mkpụrụ obi gị ihe ụtọ.” Otú ọ dị, amaokwu nke 21 na-asị: “Onye zụtọworo ohu ya site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu ahụ ga-aghọkwa [onye na-enweghị ekele, NW].” Ọ bụ ezie na amaokwu a na-ekwu banyere ohu, n’otu aka ahụ o metụtakwara onye na-eto eto nọ n’ezinụlọ.
18. Gịnị ka ịdọ aka ná ntị bụ ihe àmà ya, gịnịkwa ka a na-ezere mgbe ndị nne na nna nọgidere na-enye ịdọ aka ná ntị?
18 N’eziokwu, ịdọ aka ná ntị ziri ezi bụ ihe àmà nke ịhụnanya nne ma ọ bụ nna maka nwa ya. (Ndị Hibru 12:6, 11) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị maara na o siri ike ịnọgide na-enye ịdọ aka ná ntị nke ezi uche dị na ya. Ka udo wee dị, ọ pụrụ iyi ihe ka mfe ikwe ka onye nọ n’afọ iri na ụma nke kpọrọ ekwo nkụ mee ihe masịrị ya. Otú ọ dị, ka oge na-aga, nne ma ọ bụ nna nke na-agbaso ụzọ nke ikpeazụ a ga-enwe ezinụlọ nke a na-apụghị ịchịkwa achịkwa.—Ilu 29:15; Ndị Galetia 6:9.
ỌRỤ NA EGWUREGWU
19, 20. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi jiri amamihe mee ihe n’okwu nke ntụrụndụ maka ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma?
19 N’oge mbụ a na-elekarị anya ka ụmụaka nye aka n’ebe obibi ma ọ bụ n’ubi. Taa ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwe oge ịnọ nkịtị dị ukwuu nke ọ na-adịghị onye na-eleru ha anya. Iji mejuo oge ahụ, ụwa azụmahịa na-enye ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ hiri nne nke ukwuu iji mejuo oge ntụrụndụ. Tụkwasị n’eziokwu a bụ na ụwa adịghị asọpụrụ ụkpụrụ Bible nke omume, i nwekwara ihe nke nwere ike ịkpata ọdachi.
20 Ya mere, nne ma ọ bụ nna nke nwere uche na-ejigide ikike nke ime mkpebi ikpeazụ banyere ntụrụndụ. Ma, echefula na nwa ahụ nọ n’afọ iri na ụma na-etolite etolite. Kwa afọ, ọ ghaghị ịbụ na ọ ga-ele anya na a ga-emesokwu ya omume dị ka okenye. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe ka nne ma ọ bụ nna nyekwuo ohere ná nhọrọ nke ntụrụndụ ka nwa ahụ nọ n’afọ iri na ụma na-emewanye okenye—ọ bụrụhaala na nhọrọ ndị ahụ na-egosipụta ọganihu gaa ná ntozu okè ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ, nwa ahụ nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ime nhọrọ amamihe na-adịghị ya n’egwú, mkpakọrịta, na ihe ndị ọzọ. Mgbe nke a mere, e kwesịrị isoro nwa ahụ nọ n’afọ iri na ụma tụlee ya ka e wee mee nhọrọ ndị ka mma n’ọdịnihu.
21. Olee ụzọ ezi uche n’oge a na-etinye ná ntụrụndụ ga-esi chebe onye nọ n’afọ iri na ụma?
21 Ogologo oge ha aṅaa ka e kwesịrị iwepụtara ntụrụndụ? N’ala ụfọdụ a na-eme ka ndị nọ n’afọ iri na ụma kwere na ha nwere ikike inwe ntụrụndụ na-enweghị nkwụsị. Ya mere, onye ka nọ n’oge uto pụrụ ime atụmatụ ya ka o wee gaa site n’otu “mkpori ndụ” gaa n’ọzọ. Ọ dịịrị nne na nna inye ihe mmụta ahụ bụ na e kwesịkwara itinye oge n’ihe ndị ọzọ, dị ka ezinụlọ, ọmụmụ ihe onwe onye, iso ndị tozuru okè n’ime mmụọ akpakọrịta, nzukọ ndị Kraịst, na ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ. Nke a ga-eme ka “ihe ụtọ nke ndụ a” ghara ịkpapụ Okwu Chineke.—Luk 8:11-15.
22. Gịnị ka e kwesịrị iji mee ka ntụrụndụ ghara ịgabiga ókè ná ndụ nke onye nọ n’afọ iri na ụma?
22 Eze Solomọn sịrị: “Amawo m na ọ dịghị ezi ihe dịịrị ha, ma ọ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, meekwa ezi ihe n’ogologo ndụ ya. Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.” (Eklisiastis 3:12, 13) Ee, ịṅụrị ọṅụ bụ akụkụ nke ndụ nwere ezi nguzozi. Ma otú ahụ ka ọ dịkwa ịrụsi ọrụ ike. Ọtụtụ ndị nọ n’afọ iri na ụma taa adịghị amụta afọ ojuju nke na-abịa site n’ịrụsi ọrụ ike ma ọ bụ mmetụta nke ùgwù onwe onye nke na-abịa site n’iche nsogbu ahụ ihu na idozi ya. E nyeghị ụfọdụ ohere ịzụlite nkà ma ọ bụ aka ọrụ ha ga-eji kwagide onwe ha ná ndụ n’ọdịnihu. Nke a bụ nnọọ ihe ịma aka nye nne ma ọ bụ nna. Ị̀ ga-ejide n’aka na nwa gị na-eto eto nwere ohere ndị ahụ? Ọ bụrụ na ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’izi nwa gị nọ n’afọ iri na ụma iji ịrụsi ọrụ ike kpọrọ ihe na ọbụna inweta ọṅụ na ya, ọ ga-azụlite nlepụanya dị mma nke ga-eweta abamuru ruo ogologo ndụ nile.
SITE N’ONYE NỌ N’AFỌ IRI NA ỤMA GAA N’OKENYE
Gosi ụmụ gị ịhụnanya na obi ekele
23. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gbaa ụmụ ha nọ n’afọ iri na ụma ume?
23 Ọbụna mgbe nwa gị nọ n’afọ iri na ụma na-enye gị nsogbu, akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ ka dịkwa irè: “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Akwụsịla mgbe ọ bụla igosi ịhụnanya nke obi abụọ na-adịghị ya na i nwere mmetụta ya. Jụọ onwe gị, ‘Àna m aja nwa nke ọ bụla mma n’ihe ịga nke ọma ndị o nwere n’idozi nsogbu ma ọ bụ n’imeri ihe mgbochi? Àna m eji ohere dị iche iche eme ihe igosipụta ịhụnanya na obi ekele m maka ụmụ m, tupu ohere ndị a agafere?’ Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ a pụrụ inwe nghọtahie, ọ bụrụ na ụmụ nọ n’afọ iri na ụma ejide ịhụnanya gị maka ha n’aka, o yikarịrị ka ha ga-enyeghachi gị ịhụnanya ahụ.
24. Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa bụ eziokwu dị ka otu ụkpụrụ nke jikọtara ihe nile n’ịzụlite ụmụaka, ma gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche?
24 N’ezie, ka ụmụaka na-eto ịbụ ndị okenye, ha ga-emesịa meere onwe ha mkpebi ndị dị arọ. N’ọnọdụ ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ha agaghị enwe mmasị ná mkpebi ndị ahụ. Gịnị ma ọ bụrụ na nwa ha ekpebie ịkwụsị ife Jehova Chineke? Nke a pụrụ ime. Ọbụna ụfọdụ n’ime ụmụ mmụọ nke Jehova jụrụ ndụmọdụ ya ma nupụ isi. (Jenesis 6:2; Jud 6) Ụmụaka abụghị kọmputa, nke a pụrụ ịtụziri ime ihe n’ụzọ anyị chọrọ. Ha bụ ihe okike ndị nwere ike ime nhọrọ, ndị ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova maka mkpebi ndị ha na-eme. Otú ọ bụla o si dị, Ilu 22:6 ka bụkwa eziokwu dị ka otu ụkpụrụ nke jikọtara ihe nile: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”
25. Gịnị bụ ụzọ kasị mma nke ndị nne na nna ga-esi gosi obi ekele nye Jehova maka ihe ùgwù nke ịbụ nne ma ọ bụ nna?
25 Ya mere, gosi ụmụ gị ịhụnanya dị ukwuu. Mee ihe nile ị pụrụ ime iji gbasoo ụkpụrụ Bible n’ịzụlite ha. Setịpụ ihe nlereanya ọma nke àgwà Chineke. N’ụzọ dị otú a ị ga-enye ụmụ gị ohere kasị mma itolite ịghọ ndị okenye nwere ezi uche, na-atụ egwu Chineke. Nke a bụ ụzọ kasị mma maka ndị nne na nna isi gosi obi ekele nye Jehova maka ihe ùgwù nke ịbụ nne ma ọ bụ nna.