“Na-emenụ nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”
1 Ụmụ mmadụ nwere àgwà nke ikwe ka ihe ihe ndị dị mkpa pụtara soro oge laa. Nke a bụ otu ihe kpatara na mgbe ọ na-ehiwe “nri anyasị nke Onyenwe anyị,” Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” Eri mgbe ahụ, n’ememe mgbaafọ nke ọnwụ Jisọs, ndị Kraịst ejiriwo nrubeisi nọgide “na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe Ọ ga-abịa.”—1 Kọr. 11:20, 23-26.
2 N’oge na-adịghị anya ugbu a, Jisọs ga-anabata ndị ikpeazụ nke ihe fọdụrụ n’ime “ìgwè atụrụ nta” ahụ ọnụ ọgụgụ ha na-ebelata ebelata n’ebe obibi nke eluigwe. (Luk 12:32; Jọn 14:2, 3) N’afọ a ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ ha na oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ” bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha na-arịwanye elu ga-enwe ọzọ ihe ùgwù nke ime ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, n’April 11. (Jọn 10:16; Mkpu. 7:9, 10) A ga-eme ka obi ekele sikwuo ike maka nnukwu ịhụnanya Jehova n’izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-eme ka ihe nlereanya Jisọs, ịhụnanya ya, ikwesị ntụkwasị obi ya ruo ọnwụ n’inye ihe mgbapụta ahụ, na ịchị achị ya ugbu a dị ka Eze nke Alaeze Chineke e guzobeworo, tinyere ngọzi ndị Alaeze ahụ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ pụta ìhè. Ọ bụ n’ezie oge kwesịrị ncheta!
3 Mee Nkwadebe Ugbu A: Ka anyị nile rụọ ọrụ iji mee ka oge Ememe Ncheta a bụrụ nke oké ọṅụ na obi ekele maka anyị onwe anyị na ndị nile ga-esonyere anyị. Anyị pụrụ ịkwadebe obi anyị site n’ịgụghachi ihe ndekọ Bible ndị metụtara ụbọchị ikpeazụ ole na ole nke ozi Jisọs na ihe omume ndị dugara n’ọnwụ ya. A pụrụ iji ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị ndị a ga-enwe ọtụtụ izu tupu Ememe Ncheta tụleghachi isi nke 112-116 n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu.
4 Mmadụ ole ka ị maara pụrụ ịbịa Ememe Ncheta ahụ ma ọ bụrụ na ị ga-ebu ụzọ wulite obi ekele ha maka ememe a, kpọọ ha òkù, meekwa ka ahụ ruo ha ala? Mee ndepụta ugbu a, meekwa ihe i nwere ike ime iji nyere ha aka ịbịa. E mesịa, nyere ha aka ịnọgide na-eto eto n’ime mmụọ site n’ịgba ha ume ịbịachi nzukọ anya.
5 N’oge Ememe Ncheta ahụ, a ga-eme ndokwa pụrụ iche iji mụbaa ohere ime nkwusa nke onye ọ bụla. Site n’ime nhazi dị mma, ị̀ pụrụ ịsụ ụzọ inyeaka n’April? na May? Otu n’ime ụzọ kasị mma isi gosi na anyị ji obi ekele na-echeta ihe nile àjà Jisọs pụtaara anyị bụ ikwu banyere Chineke anyị, bụ́ Jehova, na ngọzi ndị ọchịchị Alaeze ahụ dị n’aka Ọkpara ya ga-eweta.—Abụ Ọma 79:13; 147:1.