“Na-emenụ Nke A”—A Ga-enwe Ncheta Ọnwụ Jizọs n’Eprel 5
1. Olee ihe mere Ncheta Ọnwụ Jizọs ji dị mkpa?
1 Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta ọnwụ ya. Ọ sịrị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ọ bụrụ na anyị echeta uru àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ baara anyị, anyị ga-ama na ụbọchị a na-enwe Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ụbọchị kacha mkpa ná ndụ anyị. Ka abalị ise nke ọnwa Eprel na-eru nso, olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na ihe o meere anyị dị anyị mma?—Kọl. 3:15.
2. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji gosi na anyị na-akwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
2 Kwadebe nke Ọma: Tupu anyị emee ihe ọ bụla dị anyị mkpa, anyị na-akwadebe nke ọma. Otú anyị na ezinụlọ anyị ga-esi akwadebe obi anyị maka Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ịgụ ihe ndị mere n’ụbọchị ole na ole tupu Jizọs anwụọ na ịtụgharị uche na ha. (Ezra 7:10) Anyị lee anya na kalenda nakwa n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị, anyị ga-ahụ amaokwu Baịbụl ole na ole ndị anyị nwere ike ịgụ. Ma, anyị ga-ahụ ọtụtụ amaokwu Baịbụl n’Ụlọ Nche Febụwarị 1, 2011, peeji nke 23-24. N’Ụlọ Nche ahụ, e kwukwara ebe anyị nwere ike ịgụ n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu iji ghọtakwuo akụkọ a kọrọ n’amaokwu nke ọ bụla.
3. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ?
3 Wepụtakwuo Oge Gaa Ozi Ọma: Ihe ọzọ anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ bụ iwepụtakwu oge gaa ozi ọma. (Luk 6:45) N’ụwa niile, anyị ga-amalite na Satọdee Mach 17 kpọwa ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ì nwere ike ịhazi ihe ị na-eme ka i nwee ike wepụtakwuo oge gaa ozi ọma n’oge ahụ? Ì nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka n’oge ahụ? Ọ́ gaghị adị mma ma ezinụlọ unu kwurịta ya ná mgbede ọzọ unu ga-enwe Ofufe Ezinụlọ?
4. Olee uru ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ga-abara anyị?
4 Kwa afọ, anyị na-erite uru na-enweghị atụ ma anyị bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Anyị na-enwekwu obi ụtọ, na-ahụkwukwa Jehova n’anya. A na-echetakwara anyị otú Chineke si hụ anyị n’anya ma zite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka ọ bịa gbapụta anyị. (Jọn 3:16; 1 Jọn 4:9, 10) Nke a na-eme ka anyị ghara ịdịrị onwe anyị ndụ. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ na-emekwa ka ọ na-enu anyị enu n’obi ikwusa ozi ọma. (Ọma 102:19-21) N’eziokwu, otú Jehova si zite Ọkpara ya ka ọ bịa gbapụta ụmụ mmadụ na-atọ ndị ohu Jehova ụtọ. Ọ dịkwa ha ka Ncheta Ọnwụ Jizọs a ga-enwe n’Eprel 5 ruwe eru. Ha ga-ejikwa oge ahụ ‘kwusaa ọnwụ Onyenwe anyị.’—1 Kọr. 11:26.