Ka Anyị Gosi na Obi Dị Anyị Ụtọ A Ga-echeta Ọnwụ Jizọs n’Eprel 17
1. Gịnị ka otu ọbụ abụ kwuru nke kwesịrị ka anyị kwuo ihe yiri ya, karịchaa n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?
1 Mgbe otu ọbụ abụ hụchara ụzọ dị iche iche Jehova si meere ya amara ma zọpụta ya, ọ jụrụ ajụjụ a: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Ọma 116:12) Taa, e nwedịrị ọtụtụ ihe mere ndị ohu Chineke ga-eji gosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị Chineke na-emere ha. Ọtụtụ narị afọ ka ọbụ abụ ahụ dechara ihe ahụ o si n’ike mmụọ nsọ kwuo, Jehova nyere ụmụ mmadụ onyinye kachanụ e nyetụrụla ha, nke bụ́ ihe mgbapụta ahụ. Ka anyị na-akwadebe icheta ọnwụ Kraịst n’Eprel 17, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji gosi na anyị bụ ndị nwere ekele.—Kọl. 3:15.
2. Olee ihe ụfọdụ mere anyị ga-eji na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ?
2 Uru Ihe Mgbapụta ahụ Baara Anyị: Ọ bụ n’ihi ihe mgbapụta ahụ ka e ji enwe ike ‘ịgbaghara anyị mmehie anyị.’ (Kọl. 1:13, 14) Ọ bụ ya mere anyị ji enwe ike iji akọnuche dị ọcha na-efe Jehova. (Hib. 9:13, 14) Ihe mgbapụta a mekwara ka anyị nwee ike iji nkwuwa okwu ekpegara Jehova ekpere. (Hib. 4:14-16) Ndị niile nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi!—Jọn 3:16.
3. Olee otú anyị nwere ike isi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ?
3 Otú Anyị Si Egosi na Obi Dị Anyị Ụtọ: Otu n’ime ụzọ anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ bụ ịgụ ọgụgụ Baịbụl ndị a na-agụ n’ụbọchị ọ bụla maka Ncheta Ọnwụ Jizọs na ichebara ihe ndị anyị gụrụ echiche. N’Ụlọ Nche Febụwarị 1, 2011, e dere isiokwu bụ́ “Ì Jikerela Maka Ụbọchị Kacha Mkpa n’Afọ?” ka o nyere anyị aka ịgụ ya. Mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị nwekwara ike ịgwa Jehova otú obi dị anyị n’ihi ihe mgbapụta ahụ o nyere anyị. (1 Tesa. 5:17, 18) Ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, bụ́ nke Jizọs kwuru ka anyị na-eme, na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ. (1 Kọr. 11:24, 25) Ihe ọzọkwa bụ na anyị nwere ike iṅomi ịhụnanya Jehova gosiri mmadụ niile ma hụ na anyị kpọrọ ọtụtụ ndị ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs.—Aịza. 55:1-3.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
4 Ndị ohu Jehova ndị obi dị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ ekwesịghị iwere ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs ka ịga ọmụmụ ihe ndị ọzọ. Ọ bụ ọmụmụ ihe kacha mkpa anyị na-enwe n’afọ! Ka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eru nso, ka anyị kpebisie ike ime ihe otu ọbụ abụ kwuru bụ́ onye sịrị: “Mkpụrụ obi m, gọzie Jehova, echefukwala ihe niile o mere.”—Ọma 103:2.